ABỤ NKE 131
“Ihe Chineke Kekọtara”
-
1. Nwoke na nwaanyị lụọ,
Obi n’adị h’ụtọ
Na ha bụ di na nwunye.
Ọ bụn-kwa ha kwere.
(UKWE NKE 1)
Di kwere nwunye yan-kwa
N’ọ g’ahụ ya n’anya.
Chineke kekọrọ ha.
Atọsakwala ha.
-
2. Ha ji Baịbụl mụta
Eziokwu Chineke.
Ha n’arịọ k’ọ gọzie ha,
Ka ha mezuon-kwa ha.
(UKWE NKE 2)
Nwunye kwere di yan-kwa
N’ọ g’ahụ ya n’anya.
Chineke kekọrọ ha.
Atọsakwala ha.
(Gụọkwa Jen. 2:24; Ekli. 4:12; Efe. 5:22-33.)