Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 3

‘Chineke Mere Ka M Hụwa Ọhụụ’

‘Chineke Mere Ka M Hụwa Ọhụụ’

EZIKIEL 1:1

IHE ISIOKWU A NA-EKWU: Ọhụụ ụgbọ ịnyịnya eluigwe Ezikiel hụrụ

1-3. (a) Kọwaa ihe Ezikiel hụrụ na ihe ọ nụrụ. (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Ònye nyere Ezikiel ike o ji hụ ọhụụ ahụ? Oleekwa ihe o mere mgbe ọ hụrụ ihe ndị ahụ?

 EZIKIEL nọ na mbara ala ebe ájá juru na-ele anya n’elu. O mechilatara anya ya, meghezie ya ka o nwee ike ịhụ ihe ọ na-ele nke ọma. Ihe ọ na-ahụ riri ya ọnụ. Ọ hụrụ ka oké ifufe fewere. Ma, ihe a abụghị ifufe nkịtị. Oké ifufe ahụ si n’ebe ugwu fere na-abịa, na-ebugharị ma ntutu isi ya ma uwe ya. Ezikiel hụziri nnukwu ígwé ojii. Ọkụ sikwa n’ígwé ojii ahụ na-egbukepụta ma mee ka ìhè dịrị. Ìhè ahụ chetaara Ezikiel ọla na-egbu maramara nke bara ezigbo uru. a Ka ígwé ojii ahụ na-abịa n’ike n’ike n’ebe Ezikiel nọ, Ezikiel nụwara mkpọtụ. Mkpọtụ ahụ dasiwere ike ka ígwé ojii ahụ na-abịakwu ya nso. Mkpọtụ ahụ na-ada ka ebe ìgwè ndị agha na-aga agha.—Ezik. 1:4, 24.

2 Ezikiel dị ihe dị ka afọ iri atọ mgbe ọ hụrụ ọhụụ ndị ahụ ọ na-agaghị echefu echefu. ‘Jehova nyere ya ike,’ ya bụ, ike mmụọ nsọ ya na-enweghị atụ. Mmụọ nsọ a ga-eme ka ọ hụ ma nụ ihe ndị dị nnọọ ịtụnanya ma dị egwu karịa ihe ndị a na-ahụ na fim dị iche iche ndị mmadụ na-emepụta. Ihe ndị Ezikiel hụrụ n’ọhụụ mere ka o gbuo ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala, ha enyeghịkwa ya ọnụ okwu.—Ezik. 1:3, 28.

3 Ma, ihe mere Jehova ji gosi Ezikiel ihe ndị ahụ abụghị naanị ka o mee ka ọ tụọ egwu ya. Kama, ọhụụ nke mbụ ọ hụrụ na ọhụụ ndị ọzọ niile dị n’akwụkwọ Ezikiel nwere ọtụtụ ihe ha na-akụziri ma Ezikiel ma ndị ji obi ha niile na-efe Jehova n’oge anyị a. N’ihi ya, ka anyị lebakwuo anya n’ihe ndị Ezikiel hụrụ nakwa ihe ndị ọ nụrụ.

Ebe Ọ Nọ Hụ Ọhụụ Ahụ

4, 5. Olee mgbe Ezikiel hụrụ ọhụụ ahụ, oleekwa ebe ọ nọ hụ ya?

4 Gụọ Ezikiel 1:1-3. Ka anyị buru ụzọ kwuo gbasara ebe Ezikiel nọ hụ ọhụụ ahụ na mgbe ọ hụrụ ya. Ọ bụ n’afọ 613 T.O.N.K. ka ọ hurụ ya. Anyị mụtara n’Isi nke 2 na Ezikiel nọ na Babịlọn. Ya na ndị ibe ya a dọọrọ n’agha bi n’akụkụ osimiri Kiba. O nwere ike ịbụ na osimiri a bụ ọwa mmiri sara mbara ndị mmadụ gwuru, nke ụgbọ mmiri na-aga na ya. Ọ bụ mmiri si n’osimiri Yufretis na-asọba na ya, mmiri ahụ esizie ebe ọzọ sọbaghachi n’osimiri Yufretis.

Ezikiel na ndị ibe ya a dọọrọ n’agha bi n’akụkụ osimiri Kiba (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4)

5 Ọ bụ na Jeruselem ka e si dọrọ ndị ahụ n’agha. Ọ dị ihe dị ka narị kilomita asatọ (800) ma e si Babịlọn gawa ya. b Ugbu a, a na-arụrụ aka ma na-ekpere arụsị n’ụlọ nsọ ahụ nna Ezikiel rụrụ ọrụ ịchụàjà na ya. Ihe ndị na-achị na Jeruselem na-emezi na-eme ihere. Ma, mgbe Devid na Solomọn chịrị n’ebe ahụ, a kwanyeere ha ezigbo ùgwù. Eze na-enweghị okwukwe aha ya bụ Jehoyakin so ná ndị a dọọrọ n’agha nọ na Babịlọn. Onye nọchiri ya, bụ́ Zedekaya, bụ eze ọjọọ nke na-eme ihe eze Babịlọn kwuru.—2 Eze 24:8-12, 17, 19.

6, 7. Gịnị na gịnị nwere ike ime ka Ezikiel chewe na oge ahụ bụ oge kacha njọ ná ndụ ya?

6 Ezikiel nwere okwukwe. Ma ọ ga-abụ na oge a bụụrụ ya oge kacha njọ. O nwere ike ịbụ na ụfọdụ n’ime ndị ahụ a dọọrọ n’agha nọ na-ajụ, sị: ‘Jehova ọ̀ hapụla anyị kpamkpam? Ndị Babịlọn na ọtụtụ arụsị ha na-efe hà ga-eme ka a kwụsị ife Jehova ezigbo ofufe, meekwa ka a gharazie inwe ọchịchị Jehova n’ụwa?’

7 Ugbu a anyị matarala ihe ụfọdụ gbasara ebe Ezikiel nọ hụ ọhụụ ndị ahụ, ọ̀ bụ na ọ gaghị adị mma ka ị gụọ ihe dị iche iche Ezikiel hụrụ n’ọhụụ mbụ ya? (Ezik. 1:4-28) Ka ị na-agụ ha, gbalịa were ya na ọ bụ gị bụ Ezikiel. Were ya na ị na-ahụ ihe ndị ọ na-ahụ ma na-anụ ihe ndị ọ na-anụ.

Ebe e sere Osimiri Yufretis nke dị nso na Kakemish (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5-7)

Ụgbọ Na-enweghị Oyiri

8. Gịnị ka Ezikiel hụrụ n’ọhụụ? Gịnịkwa ka ihe ahụ nọchiri anya ya?

8 Gịnị ka Ezikiel hụrụ? Ọ hụrụ ihe yiri nnukwu ụgbọ dị egwu nke e kwuru na ọ dị ka ụgbọ ịnyịnya. O nwere wiil anọ buru ezigbo ibu. Ndị mmụọ ozi anọ pụrụ iche nọkwa n’akụkụ wiil ndị ahụ. E mechara kwuo na ndị mmụọ ozi a bụ ndị cherob. (Ezik. 10:1) N’elu isi ha, e nwere ihe yiri nnukwu pevment sara mbara ma ọ bụ ihe yiri mbara igwe. Ọ dị ka mmiri oyi kpụkọrọ akpụkọ. Ọ bụ n’elu ya ka ocheeze Chineke dị. Ocheeze ahụ dị ebube, ọ bụkwa Jehova nọ na ya. Ma, gịnị ka ụgbọ ịnyịnya ahụ nọchiri anya ya? Ọ bụ naanị otu ihe ka ọhụụ Ezikiel nwere ike ịnọchi anya ya, ya bụ, ndị nọ ná nzukọ Jehova n’eluigwe. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ka anyị hụ ihe atọ mere anyị ji kwuo ya.

9. Olee otú o si bụrụ na otú Jehova na ndị mmụọ ozi ya si emekọ ihe dabara n’otú e si anya ụgbọ?

9 Otú Jehova na ndị mmụọ ozi ya si emekọ ihe. Cheta na n’ọhụụ a, ocheeze Jehova dị n’elu ndị cherob ahụ. N’ebe ndị ọzọ na Baịbụl, e kwukwara na Jehova nọ n’ocheeze dị n’elu ndị cherob ma ọ bụ n’etiti ndị cherob. (Gụọ 2 Ndị Eze 19:15; Ọpụ. 25:22; Ọma 80:1) O doro anya na ọ bụghị ọdụ nkịtị ka Jehova nọ n’elu ndị cherob ya, ka à ga-asị na ọ dị ya mkpa ka ndị mmụọ ozi ahụ siri ike buru ya eburu. Ọ dịghịkwanụ ya mkpa ka ụgbọ ịnyịnya nkịtị buru ya na-agagharị. Kama, ndị cherob ahụ na-akwado ọchịchị ya. O nwekwara ike iziga ha ebe ọ bụla n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa ka ha mee uche ya. Ma ha ma ndị mmụọ ozi ndị ọzọ, bụ́ ndị dị nsọ, na-eme ihe niile Jehova kpebiri n’ihi na ha bụ ndị ozi ya ma ọ bụ ndị ọrụ ya. (Ọma 104:4) Ọ bụ ya mere e nwere ike iji kwuo na Jehova nọ n’elu ha niile, na-achị ha ma na-eduzi ha ka à ga-asị na ha niile bụ otu nnukwu ụgbọ.

10. Gịnị na-egosi na ọ bụghị naanị ndị cherob anọ ka ụgbọ ịnyịnya eluigwe ahụ nọchiri anya ha?

10 Ọ bụghị naanị ndị cherob anọ ka ụgbọ ahụ nọchiri anya ha. Ndị cherob ahụ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ dị anọ. Na Baịbụl, e kwuo na ihe dị anọ, ọ na-apụtakarị na ihe ahụ hà nhata ma ọ bụ na o zuru ezu, na e nweghị ihe a gụpụrụ. N’ihi ya, e nwere ike ikwu na ndị cherob anọ ahụ nọchiri anya ndị mmụọ ozi Jehova niile na-erubere ya isi. Ọ̀ kwa i chetara na n’ọhụụ ahụ, Ezikiel hụrụ na wiil ndị ahụ nakwa ndị cherob ahụ bụcha anya anya? Ọ na-egosi na e nwere ọtụtụ ndị mmụọ ozi na-ahụ ihe niile na-emenụ, ọ bụghị naanị ndị mmụọ ozi anọ ahụ. Ihe Ezikiel kwuru gbasara ụgbọ ahụ ọ hụrụ gosiri na ụgbọ ahụ buru ezigbo ibu, mezie ka ndị cherob ahụ dị ebube dị obere n’anya. (Ezik. 1:18, 22; 10:12) Ndị niile na-efe Jehova n’eluigwe dị nnọọ ọtụtụ karịa ndị cherob anọ.

Ụgbọ ịnyịnya eluigwe Jehova gosiri Ezikiel n’ọhụụ riri ya ọnụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8-10)

11. Olee ọhụụ Daniel hụrụ nke yiri nke Ezikiel? Oleekwa ihe ọhụụ ahụ na-eme ka anyị ghọta?

11 Daniel hụrụ eluigwe n’ọhụụ otú Ezikiel hụrụ. Daniel onye amụma bi na Babịlọn n’oge niile ahụ a dọọrọ ndị Juu n’agha, ọ hụkwara eluigwe n’ọhụụ. N’ọhụụ ahụ, ocheeze Jehova nwekwara wiil. Ọhụụ Daniel gosiri otú ndị so n’ezinụlọ Chineke nke dị n’eluigwe si dị ọtụtụ. Daniel hụrụ ka “puku kwuru puku . . . na iri puku kwuru iri puku ndị mmụọ ozi,” bụ́ ụmụ Chineke, guzo n’ihu Jehova. Ụlọikpe Chineke nke dị n’eluigwe malitere ikpe. Ọ ga-abụ na onye ọ bụla n’ime ndị mmụọ ozi Chineke nọ n’ebe e kenyere ya ka ọ nọrọ. (Dan. 7:9, 10, 13-18) Ọ̀ bụ na ọ dabaghị adaba ikwu na ọ bụkwa ndị mmụọ ozi ahụ dị ebube zukọtaranụ ka Ezikiel hụrụ n’ọhụụ?

12. Olee otú ịmụ gbasara ọhụụ ụgbọ ịnyịnya eluigwe Ezikiel hụrụ na ọhụụ ndị ọzọ yiri ya ga-esi eme ka anyị zere nsogbu?

12 Jehova ma na anyị ga-ezere nsogbu ma ọ bụrụ na uche anyị ana-adị n’ihe ndị dị n’eluigwe, ya bụ, n’ihe Pọl onyeozi kpọrọ “ihe a na-anaghị ahụ anya.” Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na ebe anyị bụ anụ ahụ́ na ọbara, uche anyị na-adịkarị ‘n’ihe a na-ahụ anya,’ ya bụ, n’ihe ndị na-akpa anyị, bụ́kwanụ ihe ndị na-anaghị adịte aka. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 4:18.) Setan na-ejikarị ebe a obi anyị na-aga achọ inweta anyị ma na-eme ka anyị chọwa ime ihe ahụ́ anyị chọrọ. Ma, ebe ọ bụ na Jehova hụrụ anyị n’anya, ọ na-enye anyị ihe ndị ga-enyere anyị aka ka Setan ghara inweta anyị. Otu n’ime ha bụ ọhụụ a dị n’amụma Ezikiel. O ji ya echetara anyị gbasara ezinụlọ ya dị ebube nke dị n’eluigwe.

“Wiil, Gawanụ!”

13, 14. (a) Olee otú Ezikiel si kọwaa wiil ndị ọ hụrụ? (b) Gịnị mere o ji daba adaba na ụgbọ ịnyịnya Jehova nwere wiil?

13 Ezikiel bu ụzọ kwuwe gbasara ndị cherob anọ ahụ ọ hụrụ. N’Isi nke 4 n’akwụkwọ a, anyị ga-ahụ ihe anyị ga-amụta n’aka ndị mmụọ ozi ahụ gbasara Jehova nakwa ihe otú ha dị na-akụziri anyị gbasara Jehova. Ma, Ezikiel hụrụ na e nwere wiil anọ ndị dị n’akụkụ ndị cherob ahụ. Ọ ga-abụ na otu wiil dị n’akụkụ cherob nke ọ bụla, wiil anọ ahụ eyizie ihe buru ibu nwere akụkụ anọ há nhata. (Gụọ Ezikiel 1:16-18.) O yiri ka ọ̀ bụ nkume krisolaịt ka e ji mee wiil ndị ahụ. Nkume a na-egbu maramara, na-ahụkwa ụzọ. Ọ na-acha odo odo ma ọ bụ na-achatụ akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ. Ọ na-egbuke egbuke, maakwa ezigbo mma.

14 N’ọhụụ a Ezikiel hụrụ, ọ bụ wiil ụgbọ ịnyịnya ahụ ka a kacha kwuo okwu ya. Ọ̀ bụ na o jughị gị anya ịnụ na ocheeze nwere wiil? Ihe anyị ma bụ na ocheeze na-adịkarị otu ebe n’ihi na ebe ndị eze na-achịru n’ụwa anaghị adị oké anya. Ma, ọchịchị Jehova dị nnọọ iche na nke ụmụ mmadụ. Ezikiel ga-achọpụta na e nweghị ebe ọchịchị Jehova na ike ya na-enweghị ike iru. (Nehe. 9:6) N’eziokwu, Ọkaakaa eluigwe na ụwa nwere ike ịkpa ike n’ebe ọ bụla.

15. Gịnị ka Ezikiel hụrụ gbasara otú wiil ndị ahụ hà na ihe ndị dị na ha?

15 Otú wiil ndị ahụ si buo ibu riri Ezikiel ọnụ. O dere, sị: “Gburugburu elu wiil ndị ahụ dị elu nke na ha na-atụ egwu.” Anyị nwere ike iji uche anyị hụ ka Ezikiel na-eleli anya elu ka ọ hụ gburugburu elu nnukwu wiil ndị ahụ na-egbuke egbuke nke ọma. O kwukwara, sị: “Gburugburu elu wiil anọ ahụ bụ anya anya.” Ma, e nwere ike ikwu na ihe kacha gbagwojuo Ezikiel anya bụ otú wiil ndị ahụ dị. Ọ sịrị: “Otú ha dị dị ka à ga-asị na otu wiil dị n’ime wiil ọzọ.” Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara?

16, 17. (a) Olee otú o si bụrụ na otu wiil dị n’ime wiil ọzọ n’ụgbọ ịnyịnya ahụ? (b) Gịnị ka wiil ndị ahụ na-egosi gbasara otú ụgbọ ịnyịnya Jehova si aga ebe ọ bụla a chọrọ ka ọ gaa?

16 Ọ ga-abụ na wiil nke ọ bụla Ezikiel hụrụ bụ wiil abụọ e jikọtara ọnụ. Wiil nke ọ bụla dịkwa n’etiti wiil ibe ya. Ka a sịkwa ihe mere wiil ndị ahụ ji na-arụ ọrụ otú Ezikiel kwuru. Ọ sịrị: “Ha gawa ebe ha na-aga, ha nwere ike ịga n’akụkụ anọ ha n’atụgharịghị atụgharị ka ha na-aga.” Gịnị ka o nwere ike ịbụ ya ka wiil ndị ahụ na-akụziri anyị gbasara ụgbọ ịnyịnya eluigwe ahụ Ezikiel hụrụ?

17 Wiil ndị buru ibu otú a nwere ike ịgaru ebe dị anya naanị otu ugboro ha tụgharịrị. N’eziokwu, ọhụụ ahụ Ezikiel hụrụ na-egosi anyị na ụgbọ ahụ na-efe oké ọsọ ka ebe àmụ̀mà gburu. (Ezik. 1:14) Ihe ọzọ bụ na wiil ndị ahụ nwere ike ịga ihu, gaa azụ, gaa aka nri ma ọ bụ aka ekpe. Ndị njinia e nwere taa enweghị ike ịrụ nke dị ka ya. Ụgbọ a nwere ike ịga n’akụkụ ọ bụla n’akwụsịtụghị akwụsị ma ọ bụkwanụ tụgharịa atụgharịa. Ma, ọ pụtaghị na ọ na-etinye isi ebe ọ bụla ka onye na-amaghị ebe ọ na-aga. Anya ndị juru na wiil ndị ahụ gosiri na ụgbọ ahụ ma ihe niile na-eme gburugburu ya, ya bụ, ihe niile na-eme n’akụkụ ya niile.

Wiil ndị ahụ buru ezigbo ibu, na-efekwa oké ọsọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)

18. Gịnị ka otú wiil ndị ahụ bururu n’ibu na otú ha si bụrụ anya anya na-akụziri anyị?

18 Gịnị ka Jehova na-akụziri Ezikiel na ndị niile na-erubere ya isi gbasara ndị nọ ná nzukọ Jehova n’eluigwe? Ka anyị chebagodịrị ihe ndị Ezikiel hụrụ echiche. Otú wiil ndị ahụ si na-egbu maramara ma buo ezigbo ibu na-egosi na ụgbọ ịnyịnya a dị ebube ma dị egwu. Anya ndị juru na wiil ndị ahụ na-egosi na ụgbọ ịnyịnya a ma ihe niile na-emenụ. Anya Jehova na-ahụ ihe niile. (Ilu 15:3; Jere. 23:24) Ihe ọzọ bụ na Jehova nwere ọtụtụ nde ndị mmụọ ozi na-ejere ya ozi, ndị o nwere ike idunye ka ha gaara ya ozi n’ebe ọ bụla ọ chọrọ. Ndị mmụọ ozi a na-eleru ihe ndị na-emenụ anya ma kọọrọ Ọkaakaa Onyenwe ha ihe ndị ha hụrụ.—Gụọ Ndị Hibru 1:13, 14.

Otú e si rụọ wiil ndị ahụ mere ka ha na-aga ebe ọ bụla a chọrọ ka ha gaa (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17, 19)

19. Gịnị ka otú ụgbọ ịnyịnya Jehova si na-efe oké ọsọ ma na-aga ebe ọ bụla a chọrọ ka ọ gaa na-akụziri anyị gbasara Jehova na ndị nọ ná nzukọ ya n’eluigwe?

19 Ezikiel hụkwara na ụgbọ ịnyịnya ahụ na-efe oké ọsọ, na-agakwa n’ebe ọ bụla a chọrọ ka ọ gaa. Chegodị otú ndị niile nọ ná nzukọ Jehova n’eluigwe si dị nnọọ iche ná ndị ọchịchị na ndị nọ n’òtù dị iche iche e nwere n’ụwa taa. Ha na-asọgharị ìsì, ha anaghịkwa ama ihe ha ga-eme ma ihe gbanwee. N’ihi ya, ihe ọ bụla ha na-eme anaghị enwe isi. Ọ bụkwa ya mere a ga-eji ebibi ha. Ma, otú ụgbọ ịnyịnya a Jehova na-eduzi si aga na-egosi na Jehova ma ihe nakwa na ọ bụ Chineke ma ihe ọ ga-eme ma ihe gbanwee. Ihe a dabara nnọọ n’ihe aha Jehova pụtara, ya bụ, na ọ na-abụ ihe ọ bụla ọ chọrọ ịbụ iji mezuo uche ya. (Ọpụ. 3:13, 14) Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ Dike n’agha ma lụchitere ndị ya ọgụ, ma n’otu ntabi anya, ya abụrụ Onye na-eme ebere ma na-agbaghara mmehie, Onye na-eji obiọma agbaghara ndị si n’ala ala obi ha chegharịa, bụ́ ndị mmehie ha mere na-ewute.—Ọma 30:5; Aịza. 66:13.

20. Olee ihe mere anyị ji kwesị ịna-akwanyere ụgbọ ịnyịnya Jehova ùgwù?

20 Ọhụụ a Ezikiel hụrụ nwere ike ime ka anyị jụwazie onwe anyị ajụjụ a, ‘M̀ na-akwanyere ụgbọ ịnyịnya Jehova ùgwù?’ Anyị kwesịrị iburu n’obi na ụgbọ ịnyịnya a dị adị ugbu a. Anyị ekwesịghị iche na Jehova, Ọkpara ya, na ndị mmụọ ozi niile anaghị ahụ nsogbu ụfọdụ ndị na-eme ka ike gwụ anyị. Anyị ekwesịghịkwa ichewe na Chineke agaghị agbatara anyị ọsọ enyemaka ngwa ngwa ma ọ bụ na e nwere mgbe nzukọ ya na-agaghị ama ihe ha ga-eme n’ihi otú ihe si na-agbanwe n’ụwa ma na-esikwu ike. Anyị kwesịrị ịna-echeta mgbe niile na nzukọ Jehova akwụghị otu ebe, kama ọ na-aga n’ihu n’ihu. N’eziokwu, Ezikiel nụrụ olu si n’eluigwe gwa wiil ndị ahụ, sị: “Wiil, gawanụ!” O doro anya na iwu a e nyere wiil ndị ahụ bụ ka ha na-aga aga. (Ezik. 10:13) Ọ̀ bụ na otú a Jehova si na-eduzi nzukọ ya emeghị ka ị chọọ ịna-akwanyere nzukọ ya ùgwù? Ma, ọ bụ Jehova ka anyị kwesịrị ịkacha na-akwanyere ùgwù.

Onye Na-eduzi Ụgbọ Ịnyịnya Ahụ

21, 22. Olee otú anyị nwere ike isi kọwaa ihe ji ihe niile dị n’ụgbọ ịnyịnya ahụ?

21 Ezikiel kwuweziri gbasara ihe dị n’elu wiil ndị ahụ. Ọ hụrụ “ihe yiri mbara igwe nke na-egbu maramara ka mkpụrụ mmiri.” (Ezik. 1:22) Ihe a yiri mbara igwe gbasara n’elu isi ndị cherob ahụ. Ọ na-egbu maramara, dịkwa ebube. Ọ bụrụ na onye na-agụ ihe a Ezikiel dere ma gbasara ụgbọala, ọtụtụ ajụjụ nwere ike ịna-abata ya n’obi. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ nwere ike ịna-eche, sị: “Gịnị ji ihe ahụ yiri nnukwu pavement n’elu wiil ndị ahụ? Oleekwa otú wiil ndị ahụ ga-esi na-agbagharị ma ọ bụrụ na e nweghị ihe jikọtara ha ọnụ? Buru n’obi na ọ bụghị ihe ndị na-eme ka ụgbọ ndị dị n’ụwa na-arụ ọrụ na-eme ka nke a na-arụ ọrụ. Ọ bụghị ụgbọ nkịtị, kama ọ nọchiri anya ihe dị adị n’eluigwe. Ihe ọzọ dị ezigbo mkpa bụ na e kwuru na “mmụọ nsọ nke na-akpa ike n’ahụ́ ndị mmụọ ozi ahụ dịkwa na wiil ndị ahụ.” (Ezik. 1:20, 21) Ònye nwe mmụọ nsọ ahụ na-akpa ike na cherob ndị ahụ nakwa na wiil ndị ahụ?

22 O doro anya na ọ bụ mmụọ nsọ Jehova, ya bụ, ike kacha ike niile, ma n’eluigwe ma n’ụwa. Ọ bụ mmụọ nsọ ahụ ji ihe niile dị n’ụgbọ ịnyịnya ahụ, na-eduzi ya, ma na-eme ka ihe niile dị na ya na-arụkọ ọrụ ọnụ. Ka anyị buru ihe ndị ahụ Ezikiel kwuru n’obi ka anyị na-eleba anya n’ihe ndị o kwuru gbasara Onye na-eduzi ụgbọ ịnyịnya ahụ.

Ezikiel gbara mbọ chọta okwu ndị ọ ga-eji akọwa ihe ndị ọ hụrụ na-adịghị mfe nkọwa

23. Olee ihe Ezikiel kwuru mgbe ọ na-agbalị ịkọwa otú Jehova dị, gịnịkwa mere o ji kwuo otú ahụ?

23 Gụọ Ezikiel 1:26-28. Mgbe Ezikiel na-akọwa ihe ọ hụrụ n’ọhụụ a, ọ na-asịkarị “ihe yiri,” “onye yiri,” ma ọ bụ “o yiri.” Ma n’amaokwu ndị a, o kwuru ha ọtụtụ ugboro. O yiri ka ọ̀ na-agbalịsi ike ịchọta okwu ndị ọ ga-eji akọwa ihe ndị a ọ hụrụ na-adịghị mfe nkọwa. Ọ hụrụ “ihe yiri nkume safaya. O yikwara ocheeze.” Chegodị otú ocheeze e ji nnukwu nkume safaya na-acha anụnụ anụnụ rụọ ga-adị. E nwekwara Onye nọ ọdụ n’elu ya. ‘Onye ahụ yiri mmadụ.’

24, 25. (a) Gịnị ka eke na egwurugwu gbara ocheeze Chineke gburugburu na-echetara anyị? (b) Gịnị ka ụfọdụ ndị amụma mere mgbe ha hụrụ ụdị ọhụụ Ezikiel hụrụ?

24 Onye a Ezikiel hụrụ dị ebube. Ma, Ezikiel enweghị ike ịhụ ya nke ọma n’ihi na ebube Jehova na-egbu maramara ka ọkụ malite n’úkwù ya gbagoo nakwa malite n’úkwù ya gbadaa. Weregodị ya na ị na-ahụ ka onye amụma ahụ mechilatara anya ya, jiri aka ya kpuchie ihu ya maka ìhè ọkụ ahụ, na-agbalị ka o lee ma ọ̀ ga-ahụ onye ahụ dị ebube nke ọma. Ezikiel kwuziri ihe ọzọ dị ịtụnanya ọ hụrụ. Ọ sịrị: “Ìhè na-enwu gburugburu ya yiri eke na egwurugwu nke na-apụta n’ígwé ojii n’ụbọchị mmiri na-ezo.” Ọ̀ kwa obi na-adị gị ụtọ ma ị hụ eke na egwurugwu? Ọ na-echetara anyị na Onye kere anyị dị ebube. Ọmarịcha eke na egwurugwu nke na-apụta n’ígwé ojii na-echetakwara anyị na Jehova na ụmụ mmadụ gbara ndụ mgbe Iju Mmiri gachara na ya na ha ga-adị n’udo. (Jen. 9:11-16) N’agbanyeghị na Chineke dị ike, bụrụkwa Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, ọ bụ Chineke nke udo. (Hib. 13:20) Udo bụ otu n’ime àgwà e ji mara ya, ọ na-emekwa ka ndị niile ji obi ha na-efe ya nwee udo.

Eke na egwurugwu dị ebube nke gbara ocheeze Jehova gburugburu na-echetara anyị na anyị na-efe Chineke nke udo (A ga-akọwa ya na paragraf nke 24)

25 Gịnị ka Ezikiel mere mgbe ọ hụrụ ebube Jehova Chineke? Ezikiel dere ihe merenụ. Ọ sịrị: “Mgbe m hụrụ ya, m gburu ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala.” Ihe a Ezikiel hụrụ riri ya ọnụ, meekwa ka ọ tụọ egwu Chineke. Ọ bụ ya mere o ji gbuo ikpere n’ala. Ndị amụma ndị ọzọ mekwara ụdị ihe a mgbe Jehova mere ka ha hụ ọhụụ. Ihe ndị ha hụrụ riri ha ọnụ, mee ka ha wetuo onwe ha ala. (Aịza. 6:1-5; Dan. 10:8, 9; Mkpu. 1:12-17) Ma, ihe Jehova gosiri ndị amụma ahụ mechara gbaa ha ezigbo ume. Ọ bụ otú ahụ ka o meere Ezikiel. Ma, olee otú obi kwesịrị ịdị anyị ma anyị gụọ akụkọ ndị a na Baịbụl?

26. Olee ihe mere ọhụụ Ezikiel hụrụ ga-eji agba ya ume?

26 Ọ bụrụ na otú ihe si dịrị ndị Chineke na Babịlọn na-echu Ezikiel ụra, o doro anya na ọhụụ a gbara ya ume. Nke bụ́ eziokwu bụ na e nweghị ebe ndị ji obi ha na-efe Chineke nọ ụgbọ ịnyịnya a dị ebube Jehova na-eduzi na-agaghị eru, ma hà nọ na Jeruselem ma ọ bụ na Babịlọn ma ọ bụ n’ebe ọ bụla ọzọ. N’agbanyeghị otú Setan na ndị ọchịchị ya dịruru n’ike, hà ga-anọchiliri Chineke ụzọ, bụ́ Onye na-eduzi ụgbọ ịnyịnya eluigwe ahụ dị ebube? (Gụọ Abụ Ọma 118:6.) Ezikiel hụkwara na ụgbọ ịnyịnya eluigwe ahụ adịghị anya n’ebe ndị mmadụ nọ. N’eziokwu, wiil ụgbọ ịnyịnya ahụ na-emetụ n’ala. (Ezik. 1:19) Ihe a na-egosi na Jehova na-eche gbasara ndị na-erubere ya isi a dọọrọ n’agha. N’agbanyeghị ebe ha nọ, Nna ha hụrụ ha n’anya ga na-elekọta ha.

Otú Ụgbọ Ịnyịnya Ahụ Si Gbasa Gị

27. Olee uru ọhụụ Ezikiel hụrụ baara anyị taa?

27 È nwere uru ọhụụ Ezikiel hụrụ baara anyị taa? N’eziokwu, e nwere. Cheta na Setan na-agbasi mbọ ike ịhụ na a kwụsịrị ife Jehova ezigbo ofufe. Ọ ga-achọ ime ka anyị kweta na anyị nọ naanị anyị nakwa na Nna anyị nke bi n’eluigwe na nzukọ ya anaghị eche gbasara anyị. Ekwela ka ụgha ya megharịa gị anya, mee ka i chewe na ihe o kwuru bụ eziokwu. (Ọma 139:7-12) E nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji tụọ egwu Chineke otú Ezikiel mere. O nwere ike ịbụ na anyị agaghị egbu ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala ka Ezikiel. Ma, ọ bụrụ na anyị echee gbasara otú ụgbọ ịnyịnya eluigwe Jehova si na-akpa ike, na-efe ọsọ, na-aga ebe ọ bụla a chọrọ ka ọ gaa, cheekwa otú o si dị ebube ma na-agbanwe ma ihe gbanwee, ọ̀ bụ na o kwesịghị iri anyị ọnụ, mee ka anyị kwanyere Jehova ùgwù?

28, 29. Gịnị na-egosi na ụgbọ ịnyịnya Jehova na-aga n’ihu n’ihu kemgbe otu narị (100) afọ gara aga?

28 Chetakwa na e nwere ndị nọ n’ụwa so ná nzukọ Jehova. N’eziokwu, ọ bụ ụmụ mmadụ na-ezughị okè bụ ndị nọ ná nzukọ a. Ma, chegodị ihe dị iche iche Jehova merela n’ụwa. Jehova enyerela ụmụ mmadụ nkịtị nọ n’ebe dị iche iche n’ụwa aka ka ha mee ihe ndị ha na-agaraghị emeli n’onwe ha. (Jọn 14:12) Ọ bụrụ na anyị eleba anya n’akwụkwọ Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!, ọ ga-echetara anyị otú e si jiri ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma n’ọtụtụ ebe kemgbe otu narị (100) afọ gara aga. Ọ ga-echetakwara anyị mbọ ndị nzukọ Jehova gbara kụziere ezigbo Ndị Kraịst ihe, otú ha si merie n’ikpe dị iche iche, nakwa otú ha si jiri ihe ndị kacha ọhụrụ ndị nkà na ụzụ mepụtara mezuo uche Chineke.

29 Ọ bụrụ na anyị echee gbasara ihe niile e merela ka e nwee ike maliteghachi ife Chineke ezigbo ofufe n’oge ikpeazụ nke ụwa ọjọọ a, ọ na-edokwu anyị anya na ụgbọ ịnyịnya Jehova na-aga n’ihu n’ihu. Obi dị anyị ezigbo ụtọ na anyị nọ ná nzukọ a ma na-efe Ọkaakaa Onyenwe anyị.—Ọma 84:10.

Nzukọ Jehova na-aga n’ihu n’ihu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 28, 29)

30. Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’isi nke anọ?

30 Ma, e nwere ihe ndị ọzọ ọhụụ ahụ Ezikiel hụrụ na-akụziri anyị. N’Isi nke 4, anyị ga-elebakwu anya n’ihe ndị e kwuru gbasara ndị mmụọ ozi anọ ahụ ma ọ bụ ndị cherob. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’aka ha gbasara Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova Chineke, Onye dị ebube?

a Ọla Ezikiel kwuru okwu ya ebe a bụ elektrọm. Ọ bụ ọlaedo a gwara ọlaọcha.

b Ọ bụ otú ọ hà ma e si n’Ọzara Arebia gaa ya ogologo ogologo. Ma, o nwere ike ịbụ na ụzọ ndị ahụ a dọọrọ n’agha si gaa ya fọrọ obere ka o ruo otu narị kilomita na narị isii (1,600).