Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 8

“M Ga-ahọpụta . . . Ohu M Ka Ọ Na-azụ Ha”

“M Ga-ahọpụta . . . Ohu M Ka Ọ Na-azụ Ha”

EZIKIEL 34:23

IHE ISIOKWU A NA-EKWU: Amụma anọ e buru gbasara Mezaya na otú ha si mezuo n’isi Kraịst

1-3. Gịnị mere obi ji jọọ Ezikiel ezigbo njọ? Gịnịzi ka e ji mmụọ nsọ mee ka o mee?

 IHE a bụ afọ nke isii a dọọrọ Ezikiel onye amụma n’agha. a Obi jọrọ ya njọ ka ọ na-echeta otú e si na-achị Juda, bụ́ obodo ya ọ hụrụ n’anya. Juda dị ọtụtụ narị kilomita ma e si Babịlọn gawa ya. Ọtụtụ ndị eze achịala Juda kemgbe a mụrụ Ezikiel.

2 A mụrụ Ezikiel n’oge Eze Josaya, onye ezi omume, chịrịla ọtụtụ afọ. Ọ ga-abụ na obi tọrọ Ezikiel ụtọ mgbe ọ nụrụ otú Josaya si bibie arụsị dị iche iche ma mee ka e fewekwa Chineke ezigbo ofufe na Juda. (2 Ihe 34:1-8) Ma mbọ Josaya gbara emeghị ka ndị mmadụ kwụsị ikpere arụsị, n’ihi na ọtụtụ ndị eze chịrị mgbe ọ chịchara nọ na-ekpere arụsị. Ka a sịkwa ihe mere na n’oge ndị eze ọjọọ ahụ na-achị, ndị Izrel nọ na-emekwu omume rụrụ arụ, ha na Chineke akwụsị ịdị ná mma. Ma, ọ̀ pụtara na ha na Chineke enweghị ike ịdị ná mma ọzọ? Mbanụ!

3 Jehova ji mmụọ nsọ ya mee ka Ezikiel buo amụma gbasara Mezaya, onye ga-abụ Onye Ọchịchị na Onye Ọzụzụ Atụrụ. Ọ ga-eme ka a maliteghachi ife Jehova ezigbo ofufe ruo mgbe ebighị ebi, lekọtakwa atụrụ Jehova nke ọma. Ihe a bụ amụma mbụ n’ime ọtụtụ amụma o buru gbasara Mezaya. Anyị kwesịrị ịmụ amụma ndị ahụ nke ọma n’ihi na otú ha ga-esi emezu ga-ekpebi ma ànyị ga-adị ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu. Ka anyị lebazie anya n’amụma anọ e dere n’akwụkwọ Ezikiel gbasara Mezaya.

“Ome” nke Ghọrọ “Nnukwu Osisi Sida”

4. Olee amụma Ezikiel buru, oleekwa ihe mbụ Jehova gwara Ezikiel n’amụma ahụ?

4 N’ihe dị ka n’afọ 612 T.O.N.K., ‘Jehova gwara Ezikiel okwu,’ ya ebuo amụma nke kọwara otú ọchịchị Mezaya ga-adị nakwa ihe mere a ga-eji tụkwasị Alaeze ya obi. Ihe mbụ Jehova gwara Ezikiel n’amụma ahụ bụ ka ọ tụọrọ ndị a dọọrọ ya na ha n’agha otu ilu nke gosiri omume ọjọọ ndị na-achị Juda na-eme. O gosikwara na ọ dị mkpa ka Onye ezi omume na Onye Ọchịchị, bụ́ Mezaya, chịwa.—Ezik. 17:1, 2.

5. Gịnị ka a tụrụ n’ilu ahụ e ji buo amụma?

5 Gụọ Ezikiel 17:3-10. E kwuru n’ilu ahụ na e nwere otu “nnukwu ugo” nke feere gaa tụbiri ọnụ ọnụ alaka osisi sida ma buru ya busa “n’obodo ndị ahịa.” Ugo ahụ buuru “ụfọdụ n’ime mkpụrụ dị n’ala ahụ” kụọ n’ala na-eme nri nke dị “n’akụkụ nnukwu mmiri.” Mkpụrụ ahụ puru, bụrụzie ‘osisi vaịn nke wasara awasa.’ E nwekwara “nnukwu ugo” ọzọ. Osisi vaịn ahụ gbasara mgbọrọgwụ ya ka o ruo n’ebe ugo nke abụọ ahụ nọ. Ọ nọ na-achọ ka e foro ya gaa dọọ n’ebe ọzọ mmiri na-ede nke ọma. Jehova kwuru na ihe osisi vaịn a mere adịghị mma. Ihe o kwuru gosiri na a ga-efopụ mgbọrọgwụ ya, ọ ‘ga-akpọnwụchakwa.’

Nnukwu ugo nke mbụ nọchiri anya Nebukadneza, eze Babịlọn (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6)

6. Kọwaa ihe ilu ahụ pụtara.

6 Gịnị ka ilu a pụtara? (Gụọ Ezikiel 17:11-15.) N’afọ 617 T.O.N.K., Nebukadneza eze Babịlọn (onye bụ́ “nnukwu ugo” nke mbụ) nọchibidoro Jeruselem. Ọ chụturu eze Juda bụ́ Jehoyakin (onye bụ́ “ọnu ọnụ alaka osisi”) n’ọchịchị ma kpọta ya Babịlọn (bụ́ ‘obodo ndị ahịa’). Nebukadneza mere Zedekaya (otu “n’ime mkpụrụ dị n’ala ahụ,” onye sikwa n’ezinụlọ ndị eze) eze na Jeruselem. Nebukadneza mere ka Zedekaya jiri aha Chineke ṅụọ iyi na ọ ga na-erubere ya isi. (2 Ihe 36:13) Ma Zedekaya emeghị ihe ọ ṅụrụ n’iyi. O nupụụrụ eze Babịlọn isi ma gakwuru Fero eze Ijipt (onye bụ́ “nnukwu ugo” nke abụọ) ka o nyere ya aka lụso ndị Babịlọn ọgụ. Ma, ndị Ijipt enyereghị ya aka. Jehova katọrọ ihe Zedekaya mere. (Ezik. 17:16-21) N’ikpeazụ, a chụturu Zedekaya n’ọchịchị, ọ nwụkwara n’ụlọ mkpọrọ na Babịlọn.—Jere. 52:6-11.

7. Gịnị ka ilu a e ji buo amụma na-akụziri anyị?

7 Gịnị ka ilu a e ji buo amụma na-akụziri anyị? Nke mbụ bụ na ebe anyị na-efe Chineke ezigbo ofufe, anyị kwesịrị ịna-eme ihe anyị kwuru. Jizọs sịrị: “Ka ‘Ee’ unu kwuru bụrụ ee, ka ‘Ee e’ unu kwuru bụrụ ee e.” (Mat. 5:37) Ọ bụrụ na e nwee mgbe ọ dị mkpa ka anyị ṅụọ iyi n’ihu Chineke na anyị ga-ekwu eziokwu, dị ka mgbe anyị na-agba akaebe n’ụlọikpe, anyị ekwesịghị iji iyi ahụ anyị ṅụrụ gwuo egwu. Ihe nke abụọ ọ na-akụziri anyị bụ na ọ bụghị onye ọ bụla ka anyị kwesịrị ịtụkwasị obi. Baịbụl dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “Unu atụkwasịla ndị isi obi, unu atụkwasịkwala nwa nke mmadụ obi, bụ́ onye na-enweghị ike ịzọpụta mmadụ.”—Ọma 146:3.

8-10. Olee ihe Jehova kwuru gbasara Mezaya, onye ga-abụ Onye Ọchịchị n’ọdịnihu? Oleekwa otú amụma a si mezuo? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Amụma E Buru Gbasara Mezaya—Nnukwu Osisi Sida.”)

8 Ma, e nwere onye ọchịchị anyị kwesịrị ịtụkwasị obi anyị niile. Mgbe a tụchara ilu ahụ e ji buo amụma gbasara ọnụ ọnụ alaka osisi a dọrọ n’ebe ọzọ, Jehova ji ilu ahụ kọwaa Mezaya, onye ga-abụ Onye Ọchịchị n’ọdịnihu.

9 Ihe e kwuru n’amụma a. (Gụọ Ezikiel 17:22-24.) Ọ bụzi Jehova ga-eme ihe n’amụma a, ọ bụghị nnukwu ugo abụọ. Ọ ga-agbajiri ome “n’ọnụ ọnụ osisi sida ahụ toro ogologo” ma ‘dọọ ya n’elu otu ugwu dị elu.’ Ome ahụ ga-eto bụrụzie “nnukwu osisi sida.” “Ụdị nnụnụ dị iche iche” ga-ebi n’okpuru ya. “Osisi niile dị n’ọhịa” ga-amara na ọ bụ Jehova mere ka nnukwu osisi a too.

10 Otú amụma a si mezuo. Jehova si n’ezinụlọ Devid, bụ́ ezinụlọ ndị eze (“osisi sida ahụ toro ogologo”) kpọrọ Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst dowe n’Ugwu Zayọn nke dị n’eluigwe (“ugwu dị elu”). (Ọma 2:6; Jere. 23:5; Mkpu. 14:1) Jehova kpọọrọ Ọkpara ya, onye ndị iro ya weere “ka onye kacha ala ná ndị mmadụ” ma bugoo ya n’ọkwá. Otú o si mee ya bụ na o nyere ya “ocheeze nna ya bụ́ Devid.” (Dan. 4:17; Luk 1:32, 33) Jizọs Kraịst, Eze bụ́ Mezaya, yiri nnukwu sida dị elu. Ebe ọ nọ dị elu karịa ụwa niile, ọ ga-esikwa ebe ahụ gozie ndị niile ọ na-achị. N’eziokwu, ọ bụ ya bụ Onye Ọchịchị anyị kwesịrị ịtụkwasị obi. Mgbe Jizọs ga-achịwa n’Alaeze ya, ‘obi ga-eru ụmụ mmadụ ndị na-erubere ya isi n’ụwa niile ala, ụjọ ọdachi agaghịkwa atụ ha.’—Ilu 1:33.

11. Olee ihe dị mkpa amụma e buru gbasara “ome” nke ghọrọ “nnukwu osisi sida” na-akụziri anyị?

11 Ihe amụma a na-akụziri anyị. Amụma a na-atọ ụtọ e buru gbasara “ome” nke ghọrọ “nnukwu osisi sida” na-enyere anyị aka ịza ajụjụ dị ezigbo mkpa, ya bụ, Ònye ka anyị kwesịrị ịtụkwasị obi? Ịtụkwasị ọchịchị ụmụ mmadụ na ndị agha ha obi bụ ime iberiibe. Anyị ga-egosi na anyị ma ihe ma anyị jiri obi anyị niile tụkwasị Jizọs Kraịst, Eze bụ́ Mezaya, obi. Obi ga-eru anyị ala ma anyị mee otú ahụ. Ọ bụ ọchịchị ahụ dị n’eluigwe, nke dị n’aka ya, bụ naanị olileanya ụmụ mmadụ nwere.—Mkpu. 11:15.

“Onye O Ruuru”

12. Olee otú Jehova si mee ka o doo anya na ya echefubeghị ọgbụgba ndụ ya na Devid?

12 Otú Chineke si kọwaa ilu ahụ a tụrụ gbasara ugo abụọ mere ka Ezikiel ghọta na a ga-achụtu Zedekaya, eze ọjọọ si n’ezinụlọ Devid, bụ́ ezinụlọ ndị eze. A ga-adọrọkwa ya n’agha laa Babịlọn. O nwere ike ịbụ na Ezikiel onye amụma nọ na-eche, sị, ‘Gịnị ga-emezi nkwa Chineke kwere mgbe ya na Devid gbara ndụ na a ga-enwe eze ga-esi n’ezinụlọ Devid, onye ga-achị ruo mgbe ebighị ebi?’ (2 Sam. 7:12, 16) Ọ bụrụ na Ezikiel jụrụ onwe ya ajụjụ a, o teghị aka ya amata azịza ya. ‘Jehova gwara Ezikiel okwu’ n’ihe dị ka n’afọ 611 T.O.N.K., bụ́ afọ nke asaa a dọọrọ Ezikiel ha n’agha. N’oge ahụ, Zedekaya ka na-achị Juda. (Ezik. 20:2) Jehova mere ka o buo amụma ọzọ gbasara Mezaya. Amụma a mere ka o doo anya na Chineke echefubeghị ọgbụgba ndụ ya na Devid. Kama ichefu ya, amụma a gosiri na ọ bụ Mezaya, onye ga-abụ Onye Ọchịchị n’ọdịnihu, onye sikwa n’ezinụlọ Devid, bụ onye o ruuru ịchị.

13, 14. Gịnị ka e kwuru n’amụma ahụ dị n’Ezikiel 21:25-27? Oleekwa otú o si mezuo?

13 Ihe e kwuru n’amụma ahụ. (Gụọ Ezikiel 21:25-27.) Jehova si n’ọnụ Ezikiel gwa ‘onyeisi Izrel bụ́ onye ọjọọ’ okwu, onye oge a ga-ata ya ahụhụ rurula. Jehova gwara eze ọjọọ a hoo haa na a ga-ewepụ “ákwà ahụ e kere ya n’isi,” kpupụkwa “okpueze ya” (ihe ndị nọchiri anya ọchịchị). A ga-ebulizi ndị na-achị achị “dị ala” elu, wetuokwa ndị “dị elu” ala. Ndị ọchịchị e buliri elu ga na-achị ruo mgbe “onye o ruuru bịara,” Jehova enyezie ya Alaeze.

14 Otú amụma a si mezuo. N’afọ 607 T.O.N.K., e weturu alaeze Juda nke “dị elu” ala mgbe ndị Babịlọn bibiri Jeruselem. Ha bibiri obodo ahụ, chụtuo Eze Zedekaya n’ọchịchị ma dọrọ ya n’agha laa Babịlọn. Ebe ọ bụ na e nweghịzi eze si n’ezinụlọ Devid na-achị Jeruselem, e buliri ọchịchị ndị Jentil, bụ́ ndị “dị ala,” elu, ha achịwazie ụwa. Ma, ha agaghị achịte aka. Oge Ndị Jentaịl, ma ọ bụ “oge ndị mba ọzọ,” gwụrụ n’afọ 1914 mgbe Jehova chiri Jizọs Kraịst eze. (Luk 21:24) Ebe Jizọs bụ nwa nwa Eze Devid, ọ bụ ya bụ “onye o ruuru” ịchị n’Alaeze Mezaya. b (Jen. 49:10) N’ihi ya, ọ bụ n’isi Jizọs ka Jehova mezuru nkwa o kwere Devid na nwa ya ga na-achị n’Alaeze ya ruo mgbe ebighị ebi.—Luk 1:32, 33.

Ọ bụ Jizọs bụ onye o ruuru ịbụ Eze Alaeze Chineke (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15)

15. Gịnị mere anyị ga-eji tụkwasị Eze, bụ́ Jizọs Kraịst, obi anyị niile?

15 Ihe amụma a na-akụziri anyị. Ọ na-akụziri anyị na anyị ga-atụkwasịli Eze, bụ́ Jizọs Kraịst, obi anyị niile. Maka gịnị? Ọ bụ maka na Jizọs adịghị ka ndị ọchịchị ụmụ mmadụ ndị ndị mmadụ na-ahọpụta ma ọ bụ ndị na-eweghara ọchịchị n’ike. Ọ bụ Jehova họpụtara Jizọs ma ‘nye ya alaeze.’ Ọ bụ ya ruru eru ịchị n’Alaeze a. (Dan. 7:13, 14) N’eziokwu, anyị kwesịrị ịtụkwasị Eze Jehova họpụtara obi.

‘David Ohu M Ga Na-azụ Ha’

16. Olee otú Jehova si emeso atụrụ ya? Oleekwa otú “ndị na-azụ ndị Izrel ka atụrụ” si emeso ha n’oge Ezikiel?

16 Jehova bụ Onye Ọzụzụ Atụrụ Kachanụ. Ọ na-elekọta atụrụ ya, ya bụ, ndị na-efe ya n’ụwa, nke ọma. (Ọma 100:3) E nwere ụmụ mmadụ ndị o nyere ọrụ ịzụ atụrụ ya na ilekọta ha. Ma, anya ya na-adịkwa n’otú ha si elekọta atụrụ ya. Chegodị otú obi dị Jehova gbasara “ndị na-azụ ndị Izrel ka atụrụ” n’oge Ezikiel. Ihere anaghị eme ndị ahụ na-edu ndị Chineke. ‘Obi tara ha mmiri, ha na-achịkwa n’aka ike.’ Otú a ha si achị mere ka atụrụ Jehova taa ahụhụ, ọtụtụ n’ime ha kwụsịkwara ife Chineke ezigbo ofufe.—Ezik. 34:1-6.

17. Olee otú Jehova si napụta atụrụ ya?

17 Gịnịzi ka Jehova ga-eme? O kwuru gbasara ndị ahụ na-achịgbu ndị Izrel, sị: “M ga-ajụ ha ihe mere atụrụ m.” O kwekwara nkwa, sị: “M ga-anapụtakwa atụrụ m.” (Ezik. 34:10) Jehova na-emezu ihe o kwuru mgbe niile. (Josh. 21:45) N’afọ 607 T.O.N.K., Jehova napụtara atụrụ ya mgbe o mere ka ndị Babịlọn bịara ịlụso ndị ya ọgụ napụ ndị ahụ na-achị ndị ya ọchịchị. Mgbe afọ iri asaa gachara, ọ napụtara ndị na-efe ya, bụ́ ndị yiri atụrụ, n’aka ndị Babịlọn ma mee ka ha laghachi n’ala ha ka ha nwee ike ifewe ya otú ọ chọrọ. Ma, a ka ga na-emesi atụrụ Jehova ike n’ihi na ndị ọchịchị na-anaghị efe Chineke ka ga na-achị ha. Ọtụtụ narị afọ ka ga-agafe tupu “oge ndị mba ọzọ” agwụ.—Luk 21:24.

18, 19. Olee amụma Ezikiel buru n’afọ 606 T.O.N.K.? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

18 N’afọ 606 T.O.N.K., ihe dị ka otu afọ tupu e bibie Jeruselem nakwa ọtụtụ iri afọ tupu ndị Izrel esi n’ebe a dọọrọ ha n’agha na Babịlọn laghachi n’obodo ha, Jehova ji mmụọ nsọ ya mee ka Ezikiel buo amụma gosiri otú yanwa bụ́ Onye Ọzụzụ Atụrụ Kachanụ si elekọta atụrụ ya otú ga-abara ha uru ruo mgbe ebighị ebi. Amụma a kọwara otú Mezaya, bụ́ Onye Ọchịchị, ga-esi azụ atụrụ Jehova.

19 Ihe e kwuru n’amụma a. (Gụọ Ezikiel 34:22-24.) Chineke “ga-ahọpụta” onye ọ kpọrọ “Devid ohu m ka ọ na-azụ” ndị ya. Okwu bụ́ “ka ọ na-azụ” nakwa “ohu” gosiri na e nweghị onye ọzọ si n’ezinụlọ Devid ga-anọchi Onye Ọchịchị ahụ. Ọ bụ naanị otu nwa Devid ga na-achị ruo ebighị ebi. Onye a nke ga-achị ndị Chineke ma na-azụ ha ka atụrụ ga-elekọta ha, ọ “ga-abụkwa onyeisi ha.” Jehova na atụrụ ya “ga-agba ọgbụgba ndụ udo.” ‘Ngọzi ga na-ezoro ha ka mmiri,’ obi eruo ha ala, ala ana-emepụtara ha nri nke ọma, ha enwejuokwa ihe niile enweju. Mmadụ na ibe ya ga-ebi n’udo, ha na ụmụ anụmanụ adịkwa n’udo.—Ezik. 34:25-28.

20, 21. (a) Olee otú amụma e buru gbasara “Devid ohu m” si mezuo? (b) Olee otú ihe Ezikiel kwuru gbasara “ọgbụgba ndụ udo” ga-esi emezu n’ọdịnihu?

20 Otú amụma a si mezuo. Chineke kpọrọ Onye Ọchịchị a “Devid ohu m.” O si otú a gosi na ọ bụ Jizọs, nwa nwa Devid, bụ onye o ruuru ịchị. (Ọma 89:35, 36) Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o gosiri na ya bụ “ezigbo onye ọzụzụ atụrụ.” ‘O nyere ndụ ya n’ihi atụrụ ya.’ (Jọn 10:14, 15) Ma ugbu a, ọ bụ Onye Ọzụzụ Atụrụ nọ n’eluigwe. (Hib. 13:20) N’afọ 1914, Chineke chiri Jizọs Eze ma nyefee ya ọrụ ịzụ atụrụ Chineke nọ n’ụwa na ilekọta ha. N’afọ 1919, ya bụ, obere oge e chichara ya Eze, ọ họpụtara “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” ka ọ na-enye “ezinụlọ” Chineke nri, ya bụ, ndị ji obi ha niile na-efe Chineke, ma ndị nwere olileanya ịdị ndụ n’eluigwe ma ndị nwere olileanya ịdị ndụ n’ụwa. (Mat. 24:45-47) Kraịst na-eduzi ohu ahụ kwesịrị ntụkwasi obi. Ọ bụ ya mere ohu a ji jiri okwu Chineke na-enyeju atụrụ Chineke afọ. Nri a ha na-enye ndị Chineke emeela ka obi ruo ha ala, ha na Jehova adịrị n’ezigbo mma, ha na ibe ha adịrịkwa n’udo.

21 Olee otú ihe Ezikiel kwuru gbasara “ọgbụgba ndụ udo” na ngọzi nke ga na-ezo ka mmiri ga-esi emezu n’ọdịnihu? N’ụwa ọhụrụ anyị na-atụ anya ya, “ọgbụgba ndụ udo” ahụ ga-abara ndị na-efe Jehova ezigbo ofufe n’ụwa uru ruo n’isi. Mgbe ụwa niile ga-abụ paradaịs, agha, tigbuo zọgbuo, ụnwụ, na ọrịa agakwaghị abụrụ ndị na-efe Chineke nsogbu maka na ihe ndị a agaghịzi adị. Anụ ọhịa agakwaghị akpatara ha nsogbu. (Aịza. 11:6-9; 35:5, 6; 65:21-23) Ọ̀ bụ na obi adịghị gị ụtọ na anyị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa mgbe ọ ga-abụ paradaịs, bụ́ ebe ‘obi ga-eru atụrụ Chineke ala, e nweghịkwa onye ga-emenye ha ụjọ’?—Ezik. 34:28.

Jizọs, Onye Ọzụzụ Atụrụ nọ n’eluigwe, na-ahụ ihe niile a na-eme atụrụ Chineke (A ga-akọwa ya na paragraf nke 22)

22. Olee otú Jizọs si were atụrụ nna ya? Oleekwa otú ndị a họpụtara ka ha bụrụ ndị ọzụzụ atụrụ ga-esi na-egosi na ha weere atụrụ Chineke otú Jizọs si were ha?

22 Ihe amụma a na-akụziri anyị. Jizọs na-eme ka Nna ya. Ọ hụrụ atụrụ nna ya n’anya. Ọ bụ Onye Ọzụzụ Atụrụ, bụrụkwa Eze. N’ihi ya, ọ na-enyeju atụrụ Nna ya afọ. Ọ na-ahụkwa na ha dị n’udo, obi eruo ha ala, ha na Chineke adịrịkwa ná mma. Obi na-atọ anyị ezigbo ụtọ na Eze a na-achị anyị. Ndị Jizọs họpụtara ka ha na-azụ atụrụ Chineke kwesịkwara ịna-echebara ha echiche otú Jizọs na-eme. Ndị okenye kwesịrị iji obi ha niile na-azụ atụrụ Chineke. Ịzụ ha kwesịrị ịna-anụ ha ọkụ n’obi. Ha kwesịkwara ịna-akpa àgwà otú atụrụ Chineke ga na-amụta ihe n’aka ha. (1 Pita 5:2, 3) Okenye ọ bụla ekwesịghị imegbu atụrụ Jehova. Cheta ihe Jehova gwara ndị ọzụzụ atụrụ ji aka ike na-elekọta ndị Izrel n’oge Ezikiel. Ọ sịrị, “M ga-ajụ ha ihe mere atụrụ m.” (Ezik. 34:10) Jehova, Onye Ọzụzụ Atụrụ Kachanụ, na-eleru anya nke ọma ka ọ hụ otú e si emeso atụrụ ya. Ọkpara ya na-emekwa otú ahụ.

‘Devid Ohu M Ga-abụ Onyeisi Ha Ruo Mgbe Ebighị Ebi’

23. Olee nkwa Jehova kwere gbasara ime ka mba Izrel dị n’otu? Oleekwa otú o si mezuo?

23 Jehova chọrọ ka ndị na-efe ya dịrị n’otu ma jiri otu obi na-efe ya. N’otu amụma e buru gbasara otú a ga-esi eme ka ebo dị iche iche e nwere n’Izrel dịghachi n’otu, Chineke kwere nkwa na ya ga-akpọkọta ndị ya, ya bụ, ndị nọchiri anya alaeze Juda nke dị ebo abụọ na alaeze Izrel nke dị ebo iri, ka ha bụrụ “otu mba.” O yiri ka Chineke ọ̀ na-eme ka “osisi” abụọ ‘bụrụ otu’ n’aka ya. (Ezik. 37:15-23) Chineke mezuru amụma a mgbe ọ kpọghachiri mba Izrel n’Ala Nkwa ahụ n’afọ 537 T.O.N.K. ma mee ka ha dịrị n’otu. c Ma ịdị n’otu ahụ enweghị ihe ọ bụ ma e jiri ya tụnyere ụdị ezigbo ịdị n’otu ga-adịte aka a ka ga-enwe n’ọdịnihu. Mgbe Jehova kwechara nkwa na ndị Izrel ga-adị n’otu, o mere ka Ezikiel buo amụma gbasara otú Onye ahụ ga-abụ Onye Ọchịchị n’ọdịnihu ga-esi eme ka ndị na-efe Chineke ezigbo ofufe n’ụwa niile dịrị n’otu ruo mgbe ebighị ebi.

24. Gịnị ka Jehova kwuru gbasara Onye Ọchịchị bụ́ Mezaya? Oleekwa otú ọchịchị Eze a ga-adị?

24 Ihe e kwuru n’amụma a. (Gụọ Ezikiel 37:24-28.) Jehova kpọrọ Onye Ọchịchị ahụ bụ́ Mezaya “Devid bụ́ ohu m,” ‘onye ga na-azụ ndị m ka atụrụ’ nakwa “onyeisi.” Ihe a bụ nke ugboro abụọ ọ na-akpọ ya aha ndị a. Ma ugbu a, Jehova kpọrọ Onye ahụ E Kwere ná Nkwa “eze.” (Ezik. 37:22) Olee otú ọchịchị Eze a ga-adị? Ọchịchị ya enweghị ọgwụgwụ. Okwu bụ́ “mgbe ebịghị ebi” na-egosi na ngọzi ndị mmadụ ga-enweta n’ọchịchị Eze a agaghị agwụ agwụ. d Udo ga-adị ebe niile ma ọ chịwa. Ndị “otu eze” a ga-achị ‘ga na-eme ihe Chineke kpebiri ka ha na-eme.’ Ha ga-ebikọtakwa ọnụ n’ala Chineke nyere ha. Eze a ga-eme ka ndị ọ na-achị na Jehova Chineke dịkwuo ná mma. Jehova na ndị a Jizọs ga-achị ga-agba “ọgbụgba ndụ udo.” Jehova ga-abụ Chineke ha, ha ga-abụkwa ndị ya. Ụlọ nsọ ya “ga-adị ebe ha nọ ruo mgbe ebighị ebi.”

25. Olee otú amụma e buru gbasara Eze bụ́ Mezaya si emezu?

25 Otú amụma a si emezu. N’afọ 1919, a chịkọtara ndị e tere mmanụ, ndị ji obi ha niile na-efe Chineke, ka ha dịrị n’otu ma nọrọ n’okpuru ‘otu onye na-azụ ha ka atụrụ,’ bụ́ Jizọs Kraịst, Eze bụ́ Mezaya. “Oké ìgwè mmadụ” ndị “si ná mba niile na ebo niile na agbụrụ niile na asụsụ niile” mechara soro ndị e tere mmanụ fewe Chineke ma dịrị n’otu. (Mkpu. 7:9) Ha niile bụzi “otu ìgwè atụrụ,” “otu onye ọzụzụ atụrụ” na-azụkwa ha. (Jọn 10:16) Ma hà nwere olileanya ịga eluigwe ma ọ̀ bụ ibi n’ụwa, ha niile na-erube isi, na-eme ihe niile Jehova kpebiri ka ha na-eme. Ọ bụ ya mere ha niile, bụ́ ụmụnna n’ụwa niile, ji dịrị n’otu, obi eruo ha ala, ha na Chineke adịrịkwa ná mma. Jehova gọziri ha, mee ka ha na ibe ha dịrị n’udo. Ụlọ nsọ ya, nke nọchiri anya ezigbo ofufe ha na-efe ya, dịkwa n’ebe ha nọ. Jehova bụ Chineke ha, obi dịkwa ha ezigbo ụtọ na ha na-efe ya ugbu a nakwa na ha ga na-efe ya ruo ebighị ebi.

26. Gịnị ka ị ga-eme ka gị na ụmụnna gị dịrị n’otu, unu na Jehova adịrịkwa ná mma?

26 Ihe amụma a na-akụziri anyị. Obi dị anyị ezigbo ụtọ na anyị na ụmụnna anyị n’ụwa niile, ndị na-efe Jehova ezigbo ofufe, dị n’otu. Ma, e nwere ọrụ anyị kwesịrị ịrụ n’ihi ihe ọma a e meere anyị. Anyị kwesịrị ịna-agba mbọ ka anyị na ụmụnna anyị na-adị n’otu. N’ihi ya, onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịna-eme ihe o kwesịrị ime ka ihe anyị na ụmụnna anyị kweere na ihe anyị na-eme bụrụ otu. (1 Kọr. 1:10) Ihe a ga-enwe isi ma ọ bụrụ na anyị niile ejiri obi anyị niile na-amụ Okwu Chineke, na-akpa àgwà otú Chineke chọrọ ma soro na-arụ ọrụ dị mkpa e nyere anyị, bụ́ ikwusa ozi ọma na ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ma, ọ bụ ịhụnanya bụ isi ihe mere anyị ji dịrị n’otu. Ọ bụrụ na anyị na-agba mbọ ka anyị hụ ụmụnna anyị n’anya ma na-akpa àgwà ndị ha na ịhụnanya na-agakọ, dị ka ebere, ọmịiko, na ịgbaghara mmehie, anyị na-eme ka anyị na ụmụnna anyị dịrị n’otu. Baịbụl sirị na “ịhụnanya na-eme ka mmadụ niile dịrị n’otu.”—Kọl. 3:12-14; 1 Kọr. 13:4-7.

Jehova na-agọzi ụmụnna hụrụ ibe ha n’anya ndị nọ n’ụwa niile na-efe ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 26)

27. (a) Olee otú obi dị gị maka amụma ndị e buru gbasara Mezaya n’akwụkwọ Ezikiel? (b) Gịnị ka anyị ga-eleba anya n’isiokwu ndị na-eso nke a?

27 Obi dị anyị ezigbo ụtọ maka amụma ndị ahụ e buru gbasara Mezaya n’akwụkwọ Ezikiel. Ịgụ ha na ichebara ha echiche na-akụziri anyị na anyị kwesịrị ịtụkwasị Eze anyị anyị hụrụ n’anya, bụ́ Jizọs Kraịst, obi. Ọ na-akụzikwara anyị na ọ bụ ya ka o ruuru ịchị nakwa na o ji obiọma na-azụ anyị. Jizọs ga-emekwa ka anyị niile dịrị n’otu ruo mgbe ebighị ebi. Ọ bụ ihe ọma na-enweghị atụ ka e meere anyị kwe ka anyị soro ná ndị Eze bụ́ Mezaya na-achị. Ka anyị cheta na amụma ndị a e buru gbasara Mezaya so n’isi ihe e kwuru n’akwụkwọ Ezikiel gbasara otú a ga-esi maliteghachi ife Chineke otú ọ chọrọ. Ọ bụ Jizọs ka Jehova si n’aka ya na-achịkọta ndị ya ma na-eme ka ha maliteghachi ife Chineke ezigbo ofufe. (Ezik. 20:41) N’isiokwu ndị na-eso nke a, anyị ga-eleba anya n’amụma ndị magburu onwe ha kwuru gbasara ịmaliteghachi ife Chineke ezigbo ofufe.

a Ọ bụ afọ 617 T.O.N.K. ka a dọọrọ ndị Juu mbụ n’agha laa Babịlọn. N’ihi ya, afọ nke isii malitere n’afọ 612 T.O.N.K.

b N’Ozi Ọma Matiu na Luk dere, e depụtara otú o si bụrụ na Jizọs si n’ezinụlọ Devid.—Mat. 1:1-16; Luk 3:23-31.

c nyị ga-amụ gbasara osisi abụọ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ na otú o si mezuo n’Isi nke 12 n’akwụkwọ a.

d Otu akwụkwọ na-akọwa okwu ndị dị na Baịbụl kwuru gbasara okwu Hibru a sụgharịrị “mgbe ebighị ebi,” sị: “Ọ bụghị naanị na okwu a na-egosi ihe ga-adịte aka, ọ na-egosikwa ihe na-agaghị akwụsị akwụsị, ihe a na-agaghị agbanwe agbanwe, na ihe na-enweghị ike imebi emebi.”