Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 13

‘Kọọ Otú Ụlọ Nsọ A Dị’

‘Kọọ Otú Ụlọ Nsọ A Dị’

EZIKIEL 43:10

IHE ISIOKWU A NA-EKWU: Ihe ụlọ nsọ dị ebube Ezikiel hụrụ n’ọhụụ pụtara

1-3. (a) Gịnị mere ọ ga-eji bụrụ na ọhụụ nnukwu ụlọ nsọ Ezekiel hụrụ kasiri ya obi? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Gịnị na gịnị ka anyị ga-eleba anya na ha n’isiokwu a?

 WEREGODỊ ya na ị na-ahụ Ezikiel ka ọ dị afọ iri ise. Ọ nọọla afọ iri abụọ na ise n’ebe a dọọrọ ha n’agha. Ọ dịla anya e bibiri ụlọ nsọ dị na Jeruselem. Ọ bụrụ na Ezikiel tụrụ anya na ya ga-abụ onye nchụàjà na Jeruselem, o doola ya anya na ọ gaghị enwe isi. Ọ ka fọrọ ihe dị ka afọ iri ise na isii tupu ndị ahụ a dọọrọ n’agha alaghachi n’obodo ha. N’ihi ya, Ezikiel ma na e nwere ike ọ gaghị anọ ndụ hụ ka ndị Jehova laghachiri n’obodo ha, ma ya fọdụzie ịhụ ka ha rụghachiri ụlọ nsọ ahụ. (Jere. 25:11) Ihe a ò mere ka obi jọọ ya njọ?

2 Jehova dị obiọma. N’ihi ya, o gosiri Ezikiel ọtụtụ ihe n’ọhụụ n’oge a. Ọhụụ a kasiri ya obi ma mee ka o nwee olileanya. N’ọhụụ a, Jehova kpọgara Ezikiel n’obodo ya ma kpọsa ya n’elu otu ugwu dị nnọọ elu. N’ebe a Ezikiel nọ n’elu ugwu, “otu nwoke yiri ọla kọpa” bịakwutere ya. Nwoke ahụ bụ mmụọ ozi. O duuru Ezikiel gagharịa n’otu ụlọ nsọ buru ezigbo ibu. (Gụọ Ezikiel 40:1-4.) Ọ dị Ezikiel ka ihe ọ na-ahụ ọ̀ na-eme n’ìhè. Ọ ga-abụ na ihe ọ hụrụ riri ya ọnụ, gbagwojutụ ya anya, ma o mere ka okwukwe ya sie ike. E nwere ihe ndị ọ hụrụ n’ụlọ nsọ a dịkwa n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem. Ma, ọ hụrụ ọtụtụ ihe dị iche n’ụlọ nsọ nke a.

3 E dere ọhụụ a na-emetụ n’ahụ́ n’Ezikiel Isi 40 ruo 48. Ka anyị buru ụzọ kwuo otú anyị kwesịrị isi lee ọhụụ a anya ka anyị na-amụ ya ma na-agbalị ịghọta ya. Anyị ga-achọpụtazi ma ihe Ezikiel hụrụ ọ̀ bụ nnukwu ụlọ nsọ Pọl onyeozi kwuru ọtụtụ ihe banyere ya ọtụtụ narị afọ Ezikiel nwụchara. E mechazie, anyị ga-eleba anya n’uru ọhụụ ahụ baara Ezikiel na ndị ibe ya a dọọrọ n’agha.

Ihe Mere Anyị Ji Kwesị Ịgbanwe Otú Anyị Si Ele Ọhụụ A Anya

4. Olee otú e sirila kọwaa ụlọ nsọ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ? Ma, gịnị ka e kwesịrị ime ugbu a?

4 N’oge gara aga, akwụkwọ anyị kwuru na ụlọ nsọ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ bụ nnukwu ụlọ nsọ ihe atụ Jehova, nke Pọl onyeozi si n’ike mmụọ nsọ dee banyere ya n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Hibru. a N’ihi ihe a akwụkwọ anyị kwurula, o yiri ka ọ̀ dabara adaba ikwu na ọtụtụ ihe Ezikiel hụrụ n’ụlọ nsọ ahụ nwere ihe ha nọchiri anya ha nakwa na ihe Pọl kọwara gbasara ụlọikwuu ga-eme ka anyị mata ihe ha nọchiri anya ha. Ma, mgbe anyị kpechara ekpere, mụkwuo gbasara ọhụụ a ma chebakwuoro ya echiche, anyị chọpụtara na anyị kwesịrị ịgbanwe otú anyị si akọwa ihe ndị dị n’ụlọ nsọ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ ka ọ dịkwuo mfe nghọta.

5, 6. (a) Olee otú Pọl onyeozi si gosi na ọ dị umeala n’obi mgbe ọ na-ekwu gbasara ụlọikwuu? (b) Gịnị ka Pọl kwuru gbasara ihe dị iche iche dị n’ụlọikwuu ahụ? Oleekwa otú anyị nwere ike isi mee ka Pọl ka anyị na-agba mbọ ịghọtakwu ihe ụlọ nsọ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ pụtara?

5 Anyị ekwesịghị ịchọwa ka anyị mata ihe ihe nke ọ bụla Ezikiel hụrụ n’ụlọ nsọ nọchiri anya ya. Ọ bụ maka gịnị? Ka anyị leba anya n’otu ihe atụ. Mgbe Pọl na-ekwu gbasara ụlọikwuu na ụlọ nsọ ihe atụ, ọ kpọrọ ọtụtụ ihe na-adị n’ụlọkwuu aha, dị ka ihe e ji ọlaedo mee e ji etinye insens, okwuchi igbe ọgbụgba ndụ, na ite ọlaedo nke mana dị n’ime ya. Pọl ò kwuru ihe nke ọ bụla n’ime ha nọchiri anya ya? O doro anya na mmụọ nsọ emeghị ka o mee otú ahụ, kama o dere, sị: “Ihe a abụghị oge a ga-ekwucha ihe niile gbasara ihe ndị a.” (Hib. 9:4, 5) Pọl ji obi ya niile kwe ka mmụọ nsọ duzie ya, o chekwaara Jehova. Ihe a o mere gosiri na ọ dị umeala n’obi.—Hib. 9:8.

6 Anyị kwesịrị ime ka Pọl ma anyị lebawa anya n’ọhụụ ahụ Ezikiel hụrụ. Ezikiel hụrụ ọtụtụ ihe n’ụlọ nsọ ahụ. O yikwara ka ọ̀ kacha mma ka anyị chere Jehova ka o mee ka anyị ghọtakwuo ọhụụ a ma ọ bụrụ na a ka nwere ihe ndị anyị kwesịrị ịghọtakwu na ya. (Gụọ Maịka 7:7.) Ma, ànyị na-ekwuzi na mmụọ Jehova emebeghị ka anyị ghọtakwuo ọhụụ a? Mbanụ!

Ọ̀ Bụ Nnukwu Ụlọ Nsọ Ihe Atụ Ka Ezikiel Hụrụ n’Ọhụụ?

7, 8. (a) Olee ihe a gbanwere n’otú anyị sibu ghọta ọhụụ Ezikiel hụrụ? (b) Olee otú ụlọ nsọ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ si dị iche n’ụlọ nsọ ihe atụ Pọl kọwara?

7 Dị ka anyị kwuburu, kemgbe ọtụtụ afọ, akwụkwọ anyị ekwuola na ọ bụ nnukwu ụlọ nsọ ihe atụ Jehova nke Pọl kwuru banyere ya n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Hibru ka Ezikiel hụrụ n’ọhụụ. Ma, anyị elebakwuola amụma a anya, chọpụta na ọ bụghị nnukwu ụlọ nsọ ihe atụ ahụ ka Ezikiel hụrụ. Gịnị mere na ọ bụghị ya?

8 Nke mbụ bụ na ụlọ nsọ Ezikiel hụrụ adabaghị n’ihe Pọl si n’ike mmụọ nsọ kọwaa. Chegodị ihe a: Pọl onyeozi mere ka o doo anya na ụlọikwuu e nwere n’oge Mosis nọchiri anya ihe ka ukwuu. N’ụlọikwuu ahụ, e nwere “Ebe Kacha Nsọ” otú e nwere ya n’ụlọ nsọ Solomọn nakwa na nke a rụrụ n’oge Zerubabel maka na e sooro otú e si rụọ ụlọikwuu ahụ rụọ ụlọ nsọ ndị ahụ. Pọl kpọrọ ebe ahụ kacha nsọ ‘ebe nsọ e ji aka rụọ.’ Ọ kọwakwara na ọ bụ “ihe atụ nke ezigbo ebe nsọ,” ọ bụghị ebe nsọ n’onwe ya. Oleezi ebe bụ ezigbo ebe nsọ? Pọl kọwara na ọ bụ “eluigwe.” (Hib. 9:3, 24) Ọ̀ bụnụ eluigwe ka Ezikiel hụrụ n’ọhụụ? Mbanụ! E nweghị ihe e kwuru n’ọhụụ Ezikiel hụrụ nke gosiri na ọ bụ ihe ndị dị n’eluigwe ka ọ hụrụ.—I nwere ike ịtụle Daniel 7:9, 10, 13, 14.

9, 10. Olee otú àjà ndị a chụrụ n’ụlọ nsọ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ si gosi na ụlọ nsọ ahụ dị iche ná nnukwu ụlọ nsọ ihe atụ Pọl kọwara?

9 Ihe ọzọ mere ka o dokwuo anya na ụlọ nsọ Ezikiel hụrụ dị iche na nke Pọl kọwara bụ ụdị àjà a chụrụ na ha. Ezikiel nụrụ ka a na-akọwara ndị mmadụ, ndị isi, na ndị nchụàjà ụdị àjà ha ga na-achụ. Ha ga na-achụ àjà maka mmehie ha. Ha ga na-achụkwa àjà udo, ndị ha nwere ike iso rie anụ ha n’ọnụ ụlọ ndị a na-anọ eri ihe n’ụlọ nsọ. (Ezik. 43:18, 19; 44:11, 15, 27; 45:15-20, 22-25) À ga na-achụ àjà ndị a a na-achụ ugboro ugboro ná nnukwu ụlọ nsọ ihe atụ?

Ụlọ nsọ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ abụghị nnukwu ụlọ nsọ ihe atụ

10 Azịza ajụjụ a doro anya, dịkwa mfe nghọta. Pọl kwuru, sị: “Ma, mgbe Kraịst bịara ka nnukwu onye nchụàjà, o wetara ihe ọma ndị dị ugbu a. Ọ banyekwara n’ụlọikwuu ka ukwuu a na-ejighị aka rụọ, nke kakwa zuo okè, ya bụ, nke na-adịghị n’ụwa a. O jighị ọbara ewu na nke oké ehi banye, kama o ji ọbara nke ya banye n’ebe nsọ ahụ. Ọ banyere naanị otu ugboro ma napụta anyị. Nnapụta a na-adịru ebighị ebi.” (Hib. 9:11, 12) N’ihi ya, ọ bụ naanị otu àjà ka a chụrụ ná nnukwu ụlọ nsọ ihe atụ. Ọ bụ àjà mgbapụta nke Nnukwu Onye Nchụàjà Ka Ukwuu, bụ́ Jizọs Kraịst, chụrụ. O doro anya na ụlọ nsọ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ, nke e ji ewu na oké ehi achụ ọtụtụ àjà na ya, abụghị nnukwu ụlọ nsọ ihe atụ.

11. Gịnị mere anyị ji kwuo na n’oge Ezikiel, Chineke achọbeghị ka a mata gbasara nnukwu ụlo nsọ ihe atụ?

11 Ihe nke abụọ mere na ọ bụghị nnukwu ụlọ nsọ ihe atụ ka Ezikiel hụrụ bụ na n’oge ahụ, Chineke achọbeghị ka a mata gbasara nnukwu ụlọ nsọ ihe atụ ahụ. Cheta na ọ bụ ndị Juu a dọọrọ n’agha nọ na Babịlọn ka Ezikiel kọọrọ ihe ọ hụrụ. Ọ bụ Iwu Mosis ka ha na-edebe. Ha nọchaa n’ebe a dọọrọ ha n’agha, ha ga-alaghachi Jeruselem ma malite ime ihe Iwu ahụ kwuru gbasara ife Chineke ezigbo ofufe. Otú ha ga-esi eme ya bụ ịrụghachi ụlọ nsọ na ebe ịchụàjà dị na ya. Ha ga na-achụkwa àjà n’ebe ahụ. O mechara bụrụ ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ narị afọ isii (600) ka ha nọ na-achụ àjà n’ebe ahụ. Chegodị otú obi gaara adị ndị Juu ma a sị na ihe Ezikiel hụrụ n’ọhụụ ọ kọwaara ha bụ ụlọ nsọ ihe atụ ahụ, ya bụ, ụlọ nsọ nke nnukwu onye nchụàjà ya ji ndụ ya chụọ àjà, mezie ka a kwụsị ịchụ àjà ndị ọzọ niile a na-achụbu. Gịnị ka ha ga-aghọta n’ọhụụ ahụ? Ọ̀ bụ na ọ garaghị eme ka ike idebe Iwu Mosis gwụ ha? N’eziokwu, Jehova na-eme ka ndị ya mara ihe ha kwesịrị ịma n’oge kwesịrị ekwesị nakwa mgbe ha ga-aghọtali ya. Ọ bụ otú ọ na-eme mgbe niile.

12-14. Gịnị jikọrọ ụlọ nsọ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ na ihe Pọl kọwara banyere ụlọ nsọ ihe atụ? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Ụlọ Nsọ Abụọ Dị Iche na Ihe Ha Na-akụziri Anyị.”)

12 Gịnịzi jikọrọ ụlọ nsọ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ na ihe Pọl kọwara banyere ụlọ nsọ ihe atụ ahụ? Cheta na ọ bụghị ụlọ nsọ Ezikiel hụrụ ka Pọl bu n’obi mgbe ọ na-akọwa ụlọ nsọ ihe atụ. Kama, ọ bụ ụlọikwuu e nwere n’oge Mosis ka o bu n’obi. Ọ bụ eziokwu na Pọl kpọrọ ụfọdụ ihe dị n’ụlọ nsọ Solomọn na ụlọ nsọ a rụrụ n’oge Zerubabel aha, Ezikiel ahụkwa ihe ndị ahụ n’ọhụụ, ma, ihe Ezikiel na Pọl kwuru gbasara ha dị iche n’ibe ya. b Ihe ha dere anaghị ekwu otu ihe, kama, ha gbanyere ibe ha ájá n’úkwù. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ?

13 Anyị nwere ike ikwu na ihe jikọrọ ihe Ezikiel dere na ihe Pọl dere bụ na ihe Pọl kwuru mere ka anyị ghọta ihe niile Jehova haziri ka e nwee ike na-efe ya ezigbo ofufe. Ma, ihe Ezikiel dere na-enyere anyị aka ịghọtacha otú Jehova chọrọ ka e si na-efe ya ezigbo ofufe. Pọl gwara anyị ihe ihe ụfọdụ ọ kpọrọ aha mgbe ọ na-ekwu gbasara nnukwu ụlọ nsọ ihe atụ pụtara, dị ka nnukwu onye nchụàjà, àjà ndị a na-achụ, ebe ịchụàjà, na Ebe Kacha Nsọ. O ji ihe ndị a mee ka anyị mara ihe Jehova haziri ka e nwee ike na-efe ya ezigbo ofufe. Ma, otú Ezikiel si kọwaa ihe ndị ọ hụrụ n’ụlọ nsọ mere ka otú Jehova chọrọ ka e si na-efe ya doo anyị anya, bamiekwa anyị n’obi.

14 Ihe a anyị ghọtara ọ̀ pụtara na e nweghị uru ọhụụ Ezikiel hụrụ baara anyị taa? Mba. O doro anya na ọ baara anyị uru. Ka anyị hụ otú ọhụụ ahụ si baara ndị Juu rubeere Chineke isi n’oge ochie uru. Ọ ga-enyere anyị aka ịhụ otú o si abara anyị uru taa.

Olee Uru Ọhụụ ahụ Baara Ndị Juu A Dọọrọ n’Agha?

15. (a) Gịnị bụ isi ihe ọhụụ Ezikiel hụrụ na-ekwu? (b) Gịnị dị iche n’ihe e dere n’Ezikiel isi 8 na Ezikiel isi 40 ruo 48?

15 Iji mata ihe Baịbụl kwuru gbasara ajụjụ a, anyị ga-ebu ụzọ leba anya n’ajụjụ ụfọdụ yiri ya. Ha ga-enyere anyị aka ịghọta ihe Ezikiel hụrụ n’ọhụụ nke ọma. Ajụjụ nke mbụ bụ: Gịnị bụ isi ihe ọhụụ a na-ekwu? Ná nkenke, ọ na-ekwu na a ga-eme ka a maliteghachi ife Chineke ezigbo ofufe. O doro anya na Ezikiel ghọtara ya nke ọma. N’oge ọ hụrụ ụlọ nsọ ahụ n’ọhụụ, o deela ebe bụ́zi isi nke 8 n’akwụkwọ Ezikiel. N’isi nke 8 ahụ, Jehova si n’ọhụụ gosi Ezikiel ihe ọjọọ ndị Izrel na-eme n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem. Ọ ga-abụ na obi tọrọ Ezikiel ezigbo ụtọ mgbe ọ na-ede ebe bụ́zi isi nke 40 ruo 48 n’akwụkwọ Ezikiel. Ebe ndị a kwuru otú ihe ga-esi gbanwee n’ofufe a na-efe Chineke, kazie mma. Ha ekwughị otú e si merụọ ofufe Chineke, kama, ha kwuru otú e kwesịrị isi na-efe Chineke ezigbo ofufe otú Iwu Mosis kwuru.

16. Olee otú ụlọ nsọ e gosiri Ezikiel n’ọhụụ si gosi na ihe Aịzaya buru n’amụma otu narị (100) afọ tupu oge Ezikiel bụ eziokwu?

16 Tupu a maliteghachi ife Jehova ezigbo ofufe, a ga-ebuli ofufe ya elu, ya bụ, a ga-ewere ya ka ihe dị ezigbo mkpa. Ihe karịrị otu narị (100) afọ tupu oge Ezikiel, e si n’ike mmụọ nsọ mee ka Aịzaya onye amụma dee, sị: “N’oge ikpeazụ, ugwu nke ụlọ Jehova dị n’elu ya ga-akwụsi ike n’ebe dị elu karịa ugwu ukwu niile. A ga-ebulikwa ya ka ọ dị elu karịa ugwu nta niile.” (Aịza. 2:2) O doro anya na amụma a Aịzaya buru pụtara na a ga-eme ka a maliteghachi ife Jehova ezigbo ofufe. Ọ dịzi ka à ga-asị na ezigbo ofufe dị n’ugwu dị ezigbo elu. Oleekwanụ ebe Ezikiel nọ hụ ọhụụ ahụ Chineke gosiri ya? Ọ bụ “n’elu otu ugwu dị nnọọ elu.” Ọ nọ ebe ahụ na-ele ụlọ Jehova anya. (Ezik. 40:2) N’ihi ya, ọhụụ Ezikiel hụrụ na-egosi n’eziokwu na a ga-eme ka a maliteghachi ife Jehova ezigbo ofufe.

Ụlọ nsọ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ dị n’ugwu dị nnọọ elu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16)

17. Gịnị na gịnị ka e kwuru n’Ezikiel isi 40 ruo 48?

17 Ka anyị lebatụ anya n’ihe ndị Ezikiel hụrụ ma nụ, ndị e dere n’Ezikiel isi 40 ruo 48. Ọ nọ na-ele anya ka mmụọ ozi nke na-akpọgharị ya ji ihe e ji atụ̀ ihe na-atụ ọnụ ụzọ ámá ndị dị n’ụlọ nsọ, mgbidi ya, ogige ya, na ọnụ ụlọ ndị dị na ya. (Ezik. 40-42) Ọ hụziri ihe ọzọ dị ezigbo ịtụnanya: Jehova batara n’ụlọ nsọ ahụ. Otú o si bata dị ebube. Ọ dụrụ ndị ya na-enupụrụ ya isi, ndị nchụàjà, na ndị isi ọdụ. (Ezik. 43:1-12; 44:10-31; 45:9-12) Ezikiel hụrụ mmiri si n’ụlọ nsọ na-asọpụta. Ka mmiri a sọọrọ banye n’Osimiri Nnu, o mere ka ihe ndị na-adịbughị ndụ dịrị ndụ, meekwa ka a gọzie ndị Chineke. (Ezik. 47:1-12) Ọ hụkwara ka e keere ndị Chineke ala ha otú e kwuru na ala nke ọ bụla ga-aha, ebe a na-efe ezigbo ofufe adịrị n’ebe o kwesịrị ịdị, ya bụ, n’ebe dị nso n’etiti ala ahụ. (Ezik. 45:1-8; 47:13–48:35) Gịnị ka Jehova ji ọhụụ a na-agwa ndị ya? O doro anya na ọ na-agwa ha na a ga-eme ka a maliteghachi ife ya ezigbo ofufe nakwa na a ga-ewere ofufe ya ka ihe dị ezigbo mkpa. Jehova ga-abịa n’ụlọ nsọ ya, mee ka ngọzi si n’ụlọ nsọ ahụ na-ezoro ndị ya ka mmiri, mee ka ihe dịghachi mma n’ala ha, meekwa ka ndị ya dịrị ndụ, ahụ́ esie ha ike, ha adịrịkwa n’otu.

Ụlọ nsọ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ na-egosi otú Jehova ga-esi eme ka a maliteghachi ife ya ezigbo ofufe (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)

18. Ụlọ nsọ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ ọ̀ bụ ụlọ nsọ nkịtị? Kọwaa.

18 Ajụjụ nke abụọ bụ: È kwesịrị iwere ụlọ nsọ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ ka ụlọ nsọ dị adị? Mba. Ezikiel na ndị ibe ya a dọọrọ n’agha, ndị ọ kọọrọ ihe ọ hụrụ ghọtara ozugbo na ụlọ nsọ ahụ abụghị ụlọ nsọ nkịtị. Ọ̀ bụ maka gịnị? Cheta na Ezikiel hụrụ ụlọ nsọ ahụ “n’elu otu ugwu dị nnọọ elu.” Ọ bụ eziokwu na ihe a Ezikiel kwuru dabara n’amụma Aịzaya buru, ma ebe ụlọ nsọ Ezikiel hụrụ dị adabaghị n’ebe ụlọ nsọ dị na Jeruselem dị. Ọ bụ n’Ugwu Moraya nke dị na Jeruselem ka Solomọn rụrụ ụlọ nsọ, ọ bụkwa n’ebe ahụ ka a ga-emecha rụghachi ya. Ma, Ugwu Moraya ọ̀ bụ “ugwu dị nnọọ elu”? Mba. N’eziokwu, ugwu ndị ha na Ugwu Moraya hà nakwa ndị nke ka ya gbara ya gburugburu. Ihe ọzọ bụ na ụlọ nsọ Ezikiel hụrụ buru ezigbote ibu. Ogige ya sara mbara. A rụkwara mgbidi gburugburu ya. Ụlọ nsọ a buru nnọọ ibu nke na Ugwu Moraya agaghị aba ya. Ebe bụ́ Jeruselem n’oge Solomọn agaghịdị aba ya. Ihe ọzọkwa bụ na o doro anya na ndị Juu a dọọrọ n’agha atụghị anya na a ga-enwe osimiri nkịtị nke ga-esi n’ụlọ nsọ sọrọ na-asọba n’Osimiri Nnu ma mee ka ihe ndị na-adịghị ndụ dị na mmiri ahụ dị ndụ. Nke ikpeazụ bụ na otú Ala Nkwa ahụ si bụrụ ugwu ugwu mere ka ókè ala ebo dị iche iche ketara gbagọchaa agbagọ. Ha adịghị ka ókè ala ndị Ezikiel hụrụ n’ọhụụ. Ihe ndị a gosiri na e kwesịghị iwere ụlọ nsọ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ ka ụlọ nsọ nkịtị.

19-21. Gịnị ka Jehova chọrọ ka ọhụụ Ezikiel hụrụ mee ka ndị ya mee? Ọ̀ bụ maka gịnị?

19 Ajụjụ nke atọ bụ: Gịnị ka Chineke chọrọ ka ọhụụ Ezikiel hụrụ mee ka ndị Izrel mee? Ọ bụrụ na ndị Izrel echebara ihe Jehova chọrọ n’aka ndị na-efe ya ezigbo ofufe echiche, ihere onwe ha gaara eme ha. Jehova gwara Ezikiel ka ọ “kọọrọ ndị Izrel otú ụlọ nsọ a dị.” Ezikiel kọwara otú ụlọ nsọ ahụ dị nke ọma nke na ndị Izrel nwedịrị ike iji uche ha hụ otú ọ dị. Gịnị mere ha ji kwesị ichebara ụlọ nsọ ahụ echiche? Ihe ndị anyị kwurula gosiri na ọ bụghị ka ha nwee ike ịrụ ya. Kama, ọ bụ maka ihe a Jehova kwuru, “ka ihere mee ha n’ihi mmehie ha.”—Gụọ Ezikiel 43:10-12.

20 Gịnị mere ọhụụ a Ezikiel hụrụ ga-eji ruo ndị hụrụ Chineke n’anya n’obi, meekwa ka ihere mee ha? Lee ihe Jehova gwara Ezikiel. Ọ sịrị ya: “Nwa nke mmadụ, anya ruo gị ala, na-ele anya, geekwa ntị nke ọma nụrụ ihe niile m na-agwa gị banyere iwu na ntụziaka ndị gbasara ụlọ Jehova.” (Ezik. 44:5) A gwara Ezikiel banyere iwu na ntụziaka ndị gbasara ụlọ nsọ ahụ ugboro ugboro. (Ezik. 43:11, 12; 44:24; 46:14) E chetaara Ezikiel ugboro ugboro banyere iwu na ntụziaka Jehova, ma iwu o nyere banyere otú kubit ga-aha n’ogologo ma nke o nyere banyere ihe zuru ezu e ji atụ̀ ihe. (Ezik. 40:5; 45:10-12; i nwere ike ịtụle Ilu 16:11.) Ezikiel dere okwu Hibru ndị a sụgharịrị “ịtụ ihe” na “ihe e ji atụ̀ ihe” ihe karịrị ugboro iri ise n’otu ọhụụ a.

21 Gịnị ka Jehova ji ịtụ ihe, ihe e ji atụ̀ ihe, iwu, na ntụziaka na-agwa ndị ya? Ọ ga-abụ na o ji ha na-echetara ndị ya otu eziokwu ha na-ekwesịghị ichefu echefu, ya bụ, na ọ bụ naanị Jehova ga-ekwu otú a ga-esi na-efe ya ezigbo ofufe. Ihere kwesịrị ime ndị na-anaghị efe ya otú o kwuru ka e si na-efe ya. Ma, olee otú ọhụụ a si kụziere ndị Juu ihe ndị a? N’isi nke 14, anyị ga-eleba ụfọdụ n’ime ha anya. Ọ ga-enyere anyị aka ịghọtakwu otú ọhụụ a pụrụ iche Ezikiel hụrụ si gbasa anyị taa.

Gịnị mere ọhụụ a Ezikiel hụrụ ga-eji mee ka ihere mee ndị hụrụ Chineke n’anya? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 19-21)

a Ụlọ nsọ ihe atụ a bụ ihe niile Jehova haziri ka e nwee ike na-efe ya ezigbo ofufe. Ọ bụ àjà mgbapụta Jizọs Kraịst chụrụ mere ka ihe niile a nwee isi. Anyị ghọtara na ọ bụ n’afọ 29 O.N.K. ka ụlọ nsọ a malitere ịdị.

b Dị ka ihe atụ, Pọl kwuru gbasara nnukwu onye nchụàjà na ọrụ ọ na-arụ n’Ụbọchị Ikpuchi Mmehie a na-eme kwa afọ. (Hib. 2:17; 3:1; 4:14-16; 5:1-10; 7:1-17, 26-28; 8:1-6; 9:6-28) Ma, n’ọhụụ Ezikiel hụrụ, e nweghị ihe e kwuru gbasara nnukwu onye nchụàjà ma ọ bụ Ụbọchị Ikpuchi Mmehie.