Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 16

“Kaa Ha Akara n’Egedege Ihu”

“Kaa Ha Akara n’Egedege Ihu”

EZIKIEL 9:4

IHE ISIOKWU A NA-EKWU: Otú e si kaa ndị rubeere Chineke isi n’oge Ezikiel akara ka a zọpụta ha na otú ịka akara ahụ si gbasa oge anyị a

1-3. (a) Gịnị riri Ezikiel ọnụ? Gịnịkwa ka ọ matara banyere mbibi a ga-ebibi Jeruselem? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza?

 EZIKIEL amaghị ihe ọ ga-eme eme. Ihe ọ ka hụpụrụ n’ọhụụ riri ya ọnụ. E gosiri ya arụ ndị Juu hapụrụ Jehova fewe arụsị nọ na-akpa n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem. a Ọ bụ ebe a na-anọ efe Chineke ezigbo ofufe n’Izrel ka ndị nnụpụisi ahụ merụrụ. Ma, ọ bụghị naanị ụlọ nsọ ahụ ka ha merụrụ. Ebe niile na Juda bụzi tigbuo zọgbuo. Ndị obodo ahụ enweghịzi mmekwata. Ihe a ndị Jehova họọrọ nọ na-eme wutere Jehova nke ukwuu. Ọ sịrị Ezikiel: “M ga-eji iwe mee ha ihe.”—Ezik. 8:17, 18.

2 O wutere Ezikiel ịnụ na Jehova na-ewesa ndị bi na Jeruselem iwe nakwa na ọ ga-ebibi obodo a na ụlọ nsọ dị na ya. Ọ ga-abụ na Ezikiel nọ na-eche, sị: ‘Gịnịzi ga-eme ndị na-efe Chineke nọ n’obodo a? À ga-azọpụta ha? Ọ bụrụ na a ga-azọpụta ha, olee otú a ga-esi eme ya?’ Ezikiel echeghị ogologo oge tupu ọ mata azịza ajụjụ ndị a. O teghị aka ọ nụchara na a ga-ebibi Jeruselem, ya anụ ka Chineke ji oké olu na-akpọ ndị ọ ga-eji bibie obodo ahụ. (Ezik. 9:1) Ka onye amụma a na-ahụkwu ihe na-eme n’ọhụụ ahụ, ọ matara na ọ bụghị mmadụ niile ka a ga-ebibi. Kama, a ga-ahọ ndị a ga-ebibi ahọ. Ihe a mere ka obi ruo ya ala. N’eziokwu, a ga-azọpụta ndị na-erubere Chineke isi.

3 Ka oge a ga-ebibi ụwa ochie a ji ọsọ na-abịa, anyị nwekwara ike na-eche ma è nwere ndị a ga-azọpụta. Ka anyị zazie ajụjụ ndị a: (1) Gịnị ọzọ ka Ezikiel hụrụ n’ọhụụ a? (2) Olee otú ọhụụ a si mezuo n’oge Ezikiel? (3) Olee otú ọhụụ a si gbasa oge anyị a?

“Kpọọnụ Ndị Na-ebibi Obodo A Ka Ha Bịa Nso”

4. Kọwaa ihe ọzọ Ezikiel hụrụ ma nụ n’ọhụụ.

4 Gịnị ọzọ ka Ezikiel hụrụ ma nụ n’ọhụụ a? (Gụọ Ezikiel 9:1-11.) Ụmụ nwoke asaa “si n’ebe ọnụ ụzọ ámá mgbago nke chere ihu n’ebe ugwu na-abịa.” Ọ ga-abụ na ọnụ ụzọ ámá ahụ dị nso n’ebe arụsị na-akpasu Chineke iwe dị ma ọ bụ n’ebe ụmụ nwaanyị nọ na-ebere chi bụ́ Tamọz ákwá. (Ezik. 8:3, 14) Ụmụ nwoke asaa ahụ batara n’ogige dị n’ime n’ụlọ nsọ ma guzoro n’akụkụ ebe ịchụàjà e ji ọla kọpa rụọ. Ma, ụmụ nwoke ndị ahụ abịaghị iweta ihe a ga-eji chụọ àjà. Jehova anaghịzi anabata àjà a na-achụ n’ụlọ nsọ a. Ụmụ nwoke isii n’ime ha ‘jicha ngwá ọgụ ha ji akụgbu mmadụ.’ Ezikiel hụrụ na onye nke asaa dị nnọọ iche. O yi uwe linin, o jighịkwa ngwá ọgụ. Kama, o ji “mpi ịnk odeakwụkwọ,” ma ọ bụ “ihe odeakwụkwọ ji ede ihe,” otú e kwuru ya n’ala ala peeji Ezikiel 9:2.

5, 6. Gịnị mere a ga-eji kaa ndị mmadụ akara? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

5 Gịnị ka nwoke ahụ ji mpi ịnk odeakwụkwọ ga-eme? Jehova nyere ya nnukwu ọrụ ọ ga-arụ. Ọ sịrị ya: “Gagharịa n’ime obodo a, bụ́ Jeruselem, gakwuru ndị obi na-adịghị mma, ndị na-asụkwa ude n’ihi arụ niile a na-akpa na ya, kaa ha akara n’egedege ihu.” Ọ ga-abụ na Ezikiel chetara ozugbo ihe ndị nne na nna na-erubere Chineke isi n’Izrel mere mgbe ha tere ọbara n’elu ọnụ ụzọ ụlọ ha nakwa n’awara ụzọ ha ka a ghara igbu ụmụ ha bu ụzọ mụọ. (Ọpụ. 12:7, 22, 23) Akara ahụ nwoke ji mpi ịnk odeakwụkwọ ga-aka ndị mmadụ n’egedege ihu, ọ̀ ga-arụ ihe ọbara ahụ e tere n’ọnụ ụzọ rụrụ, ya bụ, ime ka a mara na a gaghị ebibi onye ọ bụla a kara akara a mgbe a ga-ebibi Jeruselem?

6 Azịza ajụjụ a ga-edo anya ma anyị ghọta ihe mere e ji na-aka akara a. Ndị a ga-aka akara n’egedege ihu bụ “ndị obi na-adịghị mma, ndị na-asụkwa ude n’ihi arụ niile a na-akpa” na Jeruselem. Gịnị mere a ga-eji kaa ha akara? Nke mbụ bụ na ma arụsị a na-ekpere n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem ma tigbuo zọgbuo ma omume rụrụ arụ ma nrụrụaka juru na Jeruselem na-ewutesi ha ike. (Ezik. 22:9-12) Ihe ọzọ bụ na ha mere ka a mata otú obi dị ha. O doro anya na ihe ndị a ji obi ha niile na-efe Chineke na-ekwu na ihe ha na-eme gosiri na obi adịghị ha mma maka ihe a na-eme n’obodo ha, gosikwa na ha ji ife Chineke ezigbo ofufe kpọrọ ihe. Jehova ga-emere ha ebere, zọpụta ha.

7, 8. Olee otú ndị ahụ ji ngwá ọgụ ha ji akụgbu mmadụ ga-esi rụọ ọrụ ha? Gịnị mechaziri mee?

7 Oleezi otú ụmụ nwoke isii, ndị ji ngwá ọgụ ha ji akụgbu mmadụ, ga-esi rụọ ọrụ nke ha? Ezikiel nụrụ ka Jehova na-agwa ha ihe ha ga-eme. Ọ sịrị ha: Soronụ nwoke ahụ ji mpi ịnk odeakwụkwọ n’azụ. Gbuonụ mmadụ niile ma e wepụ ndị a kara akara n’egedege ihu ha. Jehova sịkwara ha: ‘Malitenụ n’ụlọ nsọ m.’ (Ezik. 9:6) Ọ bụ n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem, bụ́ ebe na-adịghịzi nsọ n’anya Jehova, ka ndị ahụ ji ngwá ọgụ ha ji akụgbu mmadụ ga-ebido ọrụ. Ndị ha ga-ebu ụzọ gbuo bụ “ndị okenye nọ n’ihu ụlọ ahụ,” ya bụ, ụmụ nwoke iri asaa n’ime ndị okenye Izrel ndị nọ n’ụlọ nsọ na-amụrụ chi ụgha dị iche iche insens.—Ezik. 8:11, 12; 9:6.

8 Gịnị mechaziri mee? Ka Ezikiel nọ na-ele ihe na-emenụ ma na-ege ntị, nwoke ahụ ji mpi ịnk bịara gwa Jehova otú o si gaa. Ọ sịrị: “Emeela m ihe ị gwara m mee.” (Ezik. 9:11) Anyị nwere ike ịna-eche, sị: ‘Gịnị meziri ndị bi na Jeruselem? È nwere ndị na-erubere Chineke isi a zọpụtara mgbe e bibiri obodo a?’

Olee Otú Ọhụụ A Si Mezuo n’Oge Ezikiel?

9, 10. Olee ụfọdụ n’ime ndị na-efe Chineke a zọpụtara mgbe e bibiri Jeruselem? Gịnịkwa ka anyị nwere ike ikwu banyere ha?

9 Gụọ 2 Ihe E Mere 36:17-20. Amụma Ezikiel mezuru n’afọ 607 T.O.N.K. mgbe ndị agha Babịlọn bibiri Jeruselem na ụlọ nsọ dị na ya. Ndị Babịlọn dị ka ‘iko Jehova bu n’aka.’ O ji ya wụsa ndị bi na Jeruselem na-enupụrụ ya isi iwe ya ma taa ha ahụhụ. (Jere. 51:7) Ọ̀ bụ mmadụ niile ka e gburu? Mba. Ọhụụ Ezikiel hụrụ gosiri na ọ bụghị ndị niile bi na Jeruselem ka ndị Babịlọn ga-egbu.—Jen. 18:22-33; 2 Pita 2:9.

10 E nwere ọtụtụ ndị na-efe Chineke a zọpụtara. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị Rikab, Ibed-melek onye Etiopia, Jeremaya onye amụma, na Barọk odeakwụkwọ ya. (Jere. 35:1-19; 39:15-18; 45:1-5) N’ihi ihe e kwuru n’ọhụụ Ezikiel hụrụ, anyị nwere ike ikwu na ‘obi adịghị ndị a mma nakwa na ha na-asụ ude n’ihi arụ niile a na-akpa’ na Jeruselem. (Ezik. 9:4) Tupu e bibie Jeruselem, ọ ga-abụ na ha mere ihe gosiri na ha ji obi ha niile kpọọ ihe ọjọọ asị, jirikwa ife Chineke ezigbo ofufe kpọrọ ihe. Ihe a ha mere mere ka ha soro ná ndị a ga-azọpụta.

11. Ole ndị ka nwoke ji mpi ịnk odeakwụkwọ na ụmụ nwoke isii ji ngwá ọgụ e ji akụgbu mmadụ nọchiri anya ha?

11 Ọ̀ bụ akara a na-ahụ anya ka a kara ndị ahụ na-efe Chineke? E nweghị ihe e dere gosiri na Ezikiel ma ọ bụ onye amụma ọzọ gagharịrị na Jeruselem ma kaa ndị na-efe Chineke akara a na-ahụ anya n’egedege ihu ha. Ọ ga-abụ na ọhụụ a Ezikiel hụrụ na-ekwu banyere ihe ndị nọ n’eluigwe na-eme, bụ́ ihe ụmụ mmadụ na-anaghị ahụ mgbe a na-eme ya. Nwoke ahụ ji mpi ịnk odeakwụkwọ na ụmụ nwoke isii ji ngwá ọgụ e ji akụgbu mmadụ nọchiri anya ndị mmụọ ozi na-erubere Jehova isi, ndị na-eme uche ya mgbe niile. (Ọma 103:20, 21) O doro anya na Jehova ji ndị mmụọ ozi ya duzie ndị bibiri ndị na-enupụrụ ya isi na Jeruselem. E nwere ike ikwu na otú ndị mmụọ ozi si kaa ndị a ga-azọputa akara bụ na ha gbara mbọ hụ na ọ bụghị onye ọ bula ka e gburu. Kama, a zọpụtara ndị na-erubere Chineke isi.

Olee Otú Ọhụụ Ezikiel Hụrụ Si Gbasa Anyị Taa?

12, 13. (a) Gịnị mere Jehova ji wesa ndị bi na Jeruselem iwe, gịnịkwa mere ọ ga-eji wesa ndị oge anyị a iwe? (b) Ndị Kraịst adịgboroja hà nọchiri anya ndị bi na Jeruselem nupụụrụ Jehova isi? Kọwaa. (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Ndị Kraịst Adịgboroja Hà Nọchiri Anya Jeruselem Oge Ochie?”)

12 N’oge na-adịghị anya, anyị ga-ahụ otú Chineke ga-esi kpee ụwa a ikpe otú a na-ahụtụbeghị. Baịbụl kwuru gbasara ya, sị: “A ga-enwe oké mkpagbu nke a na-enwetụbeghị ụdị ya kemgbe ụwa malitere ruo ugbu a, a gaghịkwa enwe ya ọzọ.” (Mat. 24:21) Ka anyị na-atụ anya ihe ahụ ga-emenụ, anyị nwere ike ịna-ajụ, sị: À ga-ebibi mmadụ niile, ka è nwere ndị a ga-ebibi hapụ ndị ọzọ? À ga-aka ndị na-efe Jehova ezigbo ofufe akara ga-eme ka a zọpụta ha? Ma ọ bụ, ihe Ezikiel hụrụ n’ọhụụ gbasara nwoke ji mpi ịnk ọ̀ ga-emezukwa n’oge anyị a? Azịza ajụjụ atọ a bụ ee. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Iji chọpụta, ka anyị leba anya ọzọ n’ọhụụ ahụ Ezikiel hụrụ.

13 Ì chetara ihe mere Jehova ji wesa ndị bi na Jeruselem n’oge ochie iwe? Legodị anya ọzọ n’Ezikiel 9:8, 9. (Gụọ ya.) Mgbe Ezikiel na-atụ ụjọ ma à ga-ebibi “ndị niile fọdụrụ n’Izrel” mgbe a ga-ebibi Jeruselem, Jehova gwara ya ihe anọ mere o ji ebibi obodo a. Nke mbụ bụ na “mmehie” ndị obodo ahụ “karịrị akarị.” b Nke abụọ bụ na “ọbara ndị e gburu egbu juru n’ala” Juda. Nke atọ bụ na ‘mpụ juru’ na Jeruselem, bụ́ isi obodo alaeze Juda. Nke anọ abụrụ na ndị obodo ahụ nọ na-agwa onwe ha na e nweghị ihe ọjọọ ha na-eme, na Jehova “anaghị ahụ” arụ niile ha na-akpa. Ọ̀ kwa ihe ndị a ka e ji mara ụwa ọjọọ a? Ihe juru na ya taa bụ omume rụrụ arụ, tigbuo zọgbuo, na mpụ. Ebe ọ bụ na Jehova ‘anaghị agbanwe agbanwe,’ ihe kpasuru ya iwe n’oge ochie na-akpasukwa ya iwe taa. (Jems 1:17; Mal. 3:6) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịtụ anya na ụmụ nwoke isii, ndị ji ngwá ọgụ ha ji akụgbu mmadụ, na nwoke ji mpi ịnk ga-enwe ọrụ ha ga-arụ n’oge anyị a.

Ụmụ nwoke isii ndị ji ngwá ọgụ ha ji akụgbu mmadụ ga-enwe ọrụ ha ga-arụ n’oge na-adịghị anya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12, 13)

14, 15. Olee ihe ndị gosiri na Jehova na-adọ ndị mmadụ aka ná ntị tupu oge a ga-ebibi ha?

14 Ma, olee otú ihe Ezikiel hụrụ n’ọhụụ si emezu n’oge anyị a? Ọ bụrụ na anyị echeta otú ọhụụ ahụ si mezuo n’oge ochie, anyị ga-amata ihe ndị anyị kwesịrị ịtụ anya ha ugbu a nakwa n’ọdịnihu. Ka anyị leba anya n’ihe ụfọdụ merela n’oge anyị a ndị mezuru amụma Ezikiel nakwa ndị ka ga-emezu.

15 Jehova na-adọ ndị mmadụ aka ná ntị tupu oge a ga-ebibi ha. N’Isi nke 11 n’akwụkwọ a, anyị kwuru na Jehova nyere Ezikiel ọrụ ka ọ “bụrụ onye nche ndị Izrel.” (Ezik. 3:17-19) Malite n’afọ 613 T.O.N.K., Ezikiel dọrọ ndị Izrel aka ná ntị na n’oge na-adịghị anya, Chineke ga-ebibi ndị na-enupụrụ ya isi. Ndị amụma ndị ọzọ, ma Aịzaya ma Jeremaya, dọkwara ndị Chineke aka ná ntị na a ga-ebibi Jeruselem. (Aịza. 39:6, 7; Jere. 25:8, 9, 11) N’oge anyị a, Jehova si n’aka Kraịst jiri ndị e tere mmanụ ole na ole na-enyeju ndị na-efe ya ezigbo ofufe, bụ́ ezinụlọ ya, afọ ma na-adọkwa ndị ọzọ aka ná ntị na oké mkpagbu ji ọsọ na-abịa.—Mat. 24:45.

16. Ọ̀ bụ anyịnwa bụ́ ndị na-efe Jehova na-aka ndị a ga-azọpụta akara? Kọwaa.

16 Ọ bụghị ndị mmadụ ndị na-efe Jehova na-aka ndị a ga-azọpụta akara. Ọ̀ kwa i chetara na ọ bụghị Ezikiel ka a gwara ka ọ gagharịa na Jeruselem kaa ndị a ga-azọpụta akara? N’oge anyị a kwa, ọ bụghị ndị mmadụ na-efe Jehova ka e nyere ọrụ ịga kaa ndị a ga-azọpụta akara. Kama, ebe anyị so n’ezinụlọ Kraịst, e nyere anyị ọrụ ikwusa ozi ọma. Anyị ji ọrụ a kpọrọ ihe. Otú anyị si arụ ya bụ na anyị ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Anyị na-adọsikwa ndị mmadụ aka ná ntị ike na oge a ga-ebibi ụwa ọjọọ a dị ezigbo nso. (Mat. 24:14; 28:18-20) Anyị si otú a na-enyere ndị chọrọ ife Chineke aka ka ha malite ife ya ezigbo ofufe.—1 Tim. 4:16.

17. Gịnị ka ndị mmadụ kwesịrị ime ugbu a ka e nwee ike kaa ha akara n’ọdịnihu?

17 Ọ bụ ugbu a ka ndị mmadụ kwesịrị igosi na ha nwere okwukwe ka e nwee ike zọpụta ha mgbe a ga-ebibi ụwa ochie a. Dị ka anyị kwuburu, tupu e bibie Jeruselem n’afọ 607 T.O.N.K., ndị a zọpụtara ji obi ha niile gosi na ihe ọjọọ a na-eme adịghị ha mma nakwa na ha na-efe Chineke ezigbo ofufe. Otú ahụ ka ọ dịkwa taa. Tupu e bibie ụwa ochie a, ndị mmadụ kwesịrị igosi na ‘obi adịghị ha mma’ nakwa na ha ‘na-asụ ude’ maka ihe ọjọọ a na-eme n’ụwa a. Ha ekwesịghị izo otú obi dị ha ezo. Ihe ha na-ekwu na ihe ha na-eme kwesịrị igosi na ha ji obi ha niile na-efe Chineke ezigbo ofufe. Olee otú ha ga-esi eme ya? Ha kwesịrị ịnabata ozi ọma a na-ekwusa taa, mụta ịna-akpa àgwà ka Kraịst, mee baptizim iji gosi na ha enyefeela Jehova onwe ha, jirikwa obi ha niile na-akwado ụmụnna Kraịst. (Ezik. 9:4; Mat. 25:34-40; Efe. 4:22-24; 1 Pita. 3:21) Ọ bụ naanị ndị na-eme ihe ndị a ugbu a, ndị na-efekwa Chineke ezigbo ofufe tupu oké mkpagbu amalite, ka a ga-aka akara ka a zọpụta.

18. (a) Olee otú Jizọs ga-esi aka ndị na-erubere Chineke isi akara, oleekwa mgbe ọ ga-eme ya? (b) À ga-aka ndị e tere mmanụ na-erubere Chineke isi akara? Kọwaa.

18 Ọ bụ Jizọs ga-aka ndị a ga-azọpụta akara. N’oge Ezikiel, ndị mmụọ ozi so kaa ndị na-erubere Chineke isi a zọpụtara akara. N’oge anyị a, nwoke ahụ ji mpi ịnk odeakwụkwọ nọchiri anya Jizọs Kraịst mgbe ọ “ga-abịa n’ebube ya” ka o kpee mba niile ikpe. (Mat. 25:31-33) Ọ bụ n’oge oké mkpagbu ka Jizọs ga-abịa ma e bibichaa okpukpe ụgha. c N’oge ahụ dị ezigbo mkpa, ya bụ, obere oge tupu agha Amagedọn amalite, Jizọs ga-ekpe ndị mmadụ ikpe, kpebie ndị bụ́ atụrụ na ndị bụ́ ewu. A ga-aka ndị so ‘n’oké igwe mmadụ’ akara, ma ọ bụ kpebie na ha bụ atụrụ. Ihe a ga-egosi na ha “ga-enweta ndụ ebighị ebi.” (Mkpu. 7:9-14; Mat. 25:34-40, 46) Oleekwanụ maka ndị e tere mmadụ na-erubere Chineke isi? Ọ dịghị mkpa ka a kaa ha akara ka e nwee ike zọpụta ha n’agha Amagedọn. Kama, a ga-aka ha akara ikpeazụ tupu ha anwụọ ma ọ bụ tupu oké mkpagbu amalite. Tupu agha Amagedọn amalite, a ga-akpọrọ ha gaa eluigwe.—Mkpu. 7:1-3.

19. Olee ndị ga-eso Jizọs bibie ụwa ochie a? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Ịka Ndị Na-asụ Ude Akara na Ịkụgbu Ndị Mmadụ—Mgbe Ọ Ga-eme na Otú Ọ Ga-esi Eme”)

19 Eze na-achị n’eluigwe, bụ́ Jizọs Kraịst, na ndị agha ya nọ n’eluigwe ga-ebibi ụwa ochie a. N’ọhụụ Ezikiel hụrụ, ọ bụ mgbe nwoke ahụ yi ákwà linin kachara ndị mmadụ akara ka ụmụ nwoke isii, ndị ji ngwá ọgụ ha ji akụgbu mmadụ, malitere ibibi ndị na-enupụrụ Chineke isi. (Ezik. 9:4-7) Ọ bụkwa ihe ga-eme n’oge anyị a. Ọ bụ mgbe Jizọs kpechara ndị si ná mba niile ikpe ma kaa ndị bụ́ atụrụ akara ka a zọpụta ha, ka a ga-amalite ibibi ụwa ochie a. Agha Amagedọn malitezie, Jizọs ga-eduru ndị agha ya nọ n’eluigwe, ya bụ, ndị mmụọ ozi dị nsọ na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ (144,000) ya na ha ga-eso chịa, lụso ndị ajọ omume ọgụ ma bibie ha kpamkpam, mezie ka ndị na-efe Chineke ezigbo ofufe nweta ụwa ọhụrụ.—Mkpu. 16:14-16; 19:11-21.

20. Olee ihe ndị na-akasi obi anyị mụtara n’ọhụụ Ezikiel hụrụ nwoke ji mpi ịnk odeakwụkwọ?

20 Anyị na-ekele Jehova maka ihe ndị na-akasi obi anyị mụtara n’ọhụụ nwoke ji mpi ịnk odeakwụkwọ Ezikiel hụrụ. Obi kwesịrị isi anyị ezigbo ike na Jehova agaghị ebibikọta ndị ezi omume na ndị ajọ omume. (Ọma 97:10) Anyị ma ihe ndị anyị kwesịrị ime ugbu a ka a kaa anyị akara n’ọdịnihu, ka e wee zọpụta anyị. Ebe anyị bụ ndị na-efe Jehova, anyị kpebisiri ike na anyị ga-eji obi anyị niile na-ekwusa ozi ọma, na-adọkwa ndị obi na-adịghị mma na ndị na-asụ ude maka ihe ọjọọ a na-eme n’ụwa Setan a aka ná ntị. Ọ ga-eme ka anyị nwee ike inyere ndị “na-akpa àgwà otú na-egosi na ha chọrọ inweta ndụ ebighị ebi” aka ka ha soro anyị fewe Chineke ezigbo ofufe. Ha soro anyị fewe ya, ha ga-eso ná ndị a ga-aka akara ka a zọpụta, ha abanye n’ụwa ọhụrụ Chineke.—Ọrụ 13:48.

a Ọ bụ n’Isi nke 5 n’akwụkwọ a ka a kọwara ọhụụ Ezikiel hụrụ arụ niile a nọ na-akpa n’ụlọ nsọ Chineke.

b Otu akwụkwọ e ji eme nchọnchọ kwuru na ọ ga-abụ na okwu Hibru a sụgharịrị “mmehie” pụtara “arụ.” Akwụkwọ ọzọ kwuru na “ọ bụ ndị okpukpe na-ekwukarị okwu a” nakwa na “ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na mgbe ọ bụla e kwuru ya, ọ na-egosi ihe ọjọọ ma ọ bụ omume rụrụ arụ mmadụ mere na-adịghị Chineke mma.”

c O yiri ka a gaghị egbu ndị niile na-ekpe okpukpe ụgha mgbe a ga-ebibi Babịlọn Ukwu. N’oge ahụ, ụfọdụ ndị isi okpukpe nwere ike ịhapụ okpukpe ụgha, na-ekwuzi na e nweghị mgbe ha na-ekpe okpukpe ahụ.—Zek. 13:3-6.