Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 21

“Aha Obodo Ahụ . . . Ga-abụ Jehova Nọ Ebe Ahụ”

“Aha Obodo Ahụ . . . Ga-abụ Jehova Nọ Ebe Ahụ”

EZIKIEL 48:35

IHE ISIOKWU A NA-EKWU: Ihe obodo na ala a ga-ewepụta iche pụtara

1, 2. (a) Olee ala a ga-ewepụta iche? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Gịnị ka ọhụụ ahụ mere ka obi sie ndị ahụ a dọọrọ n’agha ike na ọ ga-eme?

 N’ỌHỤỤ ikpeazụ Ezikiel hụrụ, a gwara ya na e nwere ala a ga-ewepụta ka e jiri ya mee ihe pụrụ iche. A ga-ewepụta ala a iche ka ọ bụrụ ala a ga-enye Jehova, ọ bụghị ka e kenye ya otu ebo n’Izrel. A gwakwara Ezikiel banyere otu obodo pụrụ iche a kpọrọ ọmarịcha aha. Ọhụụ a mere ka obi sie ndị Izrel a dọọrọ n’agha ezigbo ike na Jehova ga-anọnyere ha mgbe ha ga-alaghachi n’obodo ha.

2 Ezikiel gwara anyị ọtụtụ ihe gbasara ala ahụ e wepụtara iche. Ka anyị mụọ gbasara ya n’ihi na e nwere ọtụtụ ihe anyịnwa bụ́ ndị na-efe Jehova ezigbo ofufe ga-amụta na ya.

“Ala Dị Nsọ” na Obodo Ahụ

3. Olee mpaghara ise e kebiri ala ahụ e wepụtara iche maka Jehova, gịnịkwa ka e ji ebe ndị ahụ eme? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Ala Unu Ga-ewepụta Iche.”)

3 Ala ahụ pụrụ iche dị puku kubit iri abụọ na puku ise (25,000), ya bụ, kilomita iri na atọ, malite n’ebe ugwu ruo n’ebe ndịda, dịrịkwa puku kubit iri abụọ na puku ise (25,000) malite n’ebe ọwụwa anyanwụ ruo n’ebe ọdịda anyanwụ. Akụkụ ya anọ há nhata. A kpọrọ ala a ‘ala niile e nyere Chineke.’ E kere ya ụzọ atọ. Ebe dị n’elu bụ maka ndị Livaị, nke dị n’etiti abụrụ maka ụlọ nsọ na ndị nchụàjà. A na-akpọ ha abụọ “ala ahụ dị nsọ.” Ala nke obere dị n’ala ala, ma ọ bụ “ala nke fọrọnụ,” bụ “nke ndị obodo.”—Ezik. 48:15, 20.

4. Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe e kwuru gbasara ala e wepụtara iche maka Jehova?

4 Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe e kwuru gbasara ala e wepụtara iche maka Jehova? Ebe e bu ụzọ wepụta ala bụ́ maka Jehova tupu e wepụta nke ebo dị iche iche, Jehova na-eme ka a mata na e kwesịrị iji ebe a a na-anọ efe ya kpọrọ ihe karịa ihe ọ bụla ọzọ. (Ezik. 45:1) O doro anya na ndị ahụ a dọọrọ n’agha mụtara ọtụtụ ihe n’otú e si gosi ebe kacha mkpa n’ala e keere ndị Izrel. Ọ bụ ofufe Jehova kwesịrị ịkacha ha mkpa. Taa, anyị weere ihe ndị gbasara ofufe Jehova, dị ka ịmụ Baịbụl, ịga ọmụmụ ihe, na ikwusa ozi ọma, ka ihe ndị kacha mkpa. Ọ bụrụ na ife Jehova abụrụ ihe kacha anyị mkpa n’ihe niile anyị na-eme kwa ụbọchị, anyị na-egosi na anyị na-eme ka Jehova.

‘Obodo ahụ Ga-adị n’Etiti Ya’

5, 6. (a) Ole ndị nwe obodo ahụ? (b) Gịnị ka obodo ahụ na-abụghị? Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ?

5 Gụọ Ezikiel 48:15. Gịnị ka “obodo ahụ” na ala ndị gbara ya gburugburu nọchiri anya ya? (Ezik. 48:16-18) N’ọhụụ ahụ, Jehova gwara Ezikiel, sị: “Obodo unu . . . ga-abụ nke ndị Izrel niile.” (Ezik. 45:6, 7) N’ihi ya, obodo ndị Izrel na ala ndị gbara ya gburugburu esoghị ‘n’ala ahụ dị nsọ’ a “ga-enye Jehova.” (Ezik. 48:9, 20) Ka anyị buru ihe a n’obi leba anya n’ihe obodo a na-akụziri anyị taa.

6 Ka anyị buru ụzọ mata ihe obodo a na-abụghị. Ọ ga-enyere anyị aka ịmata ihe obodo a na-akụziri anyị. Obodo a enweghị ike ịbụ Jeruselem a rụzigharịrị arụzi na ụlọ nsọ dị na ya. Maka gịnị? Ọ bụ maka na obodo Ezikiel hụrụ n’ọhụụ agaghị enwe ụlọ nsọ. Ihe ọzọ bụ na obodo a abụghị obodo ọ bụla n’ime obodo ndị ahụ si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta gara biri n’Izrel. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na e nweghị obodo ndị ahụ ma ọ bụ ụmụ ụmụ ha rụrụ nke yiri obodo Ezikiel hụrụ n’ọhụụ. Ihe ọzọ bụkwa na obodo ahụ enweghị ike ịbụ obodo dị n’eluigwe. Maka gịnị? Ọ bụ maka na a rụrụ ya n’ala a kpọrọ “ebe nkịtị” [ma ọ bụ, ebe na-adịghị nsọ]. Ala a kpọrọ “ebe nkịtị” na-adị iche n’ala a rụrụ ụlọ ndị e wepụtara maka ife Chineke.—Ezik. 42:20.

7. Gịnị bụ obodo ahụ Ezkikel hụrụ n’ọhụụ, gịnịkwa ka ọ ga-abụ na ọ nọchiri anya ya? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

7 Gịnịzi bụ obodo ahụ Ezikiel hụrụ? Cheta na ọ bụ n’otu ọhụụ ọ hụrụ ala ahụ ka ọ hụkwara obodo ahụ. (Ezik. 40:2; 45:1, 6) Baịbụl gosiri na ala ahụ abụghị ala nkịtị. N’ihi ya, obodo ahụ abụghịkwa obodo nkịtị. Gịnị ka ndị mmadụ na-aghọtakarị ma ha nụ okwu bụ́ “obodo”? Ihe ha na-aghọtakarị bụ ndị a haziri ahazi bikọrọ ọnụ. N’ihi ya, o yiri ka obodo ahụ a haziri nke ọma Ezikiel hụrụ n’ọhụụ, nke nwere akụkụ anọ há nhata, nọchiri anya “obodo” a haziri nke ọma ebe ndị nlekọta si na-enye ntụziaka.

8. Ebee ka ọchịchị obobo a ma ọ bụ ntụziaka si na ya ga na-eru? Gịnị mere o ji bụrụ otú ahụ?

8 Ebee ka ọchịchị obobo a ma ọ bụ ntụziaka si na ya ga na-eru? Ọhụụ Ezikiel hụrụ gosiri na ọ bụ n’ala ndị na-efe Chineke ezigbo ofufe ka e nwere obodo a. N’ihi ya, “obodo” a na-ahụ maka ihe dị iche iche ndị Chineke na-eme taa. Ọ̀ kwa i chetara na obodo a dị n’ebe nkịtị ma ọ bụ n’ebe na-adịghị nsọ? Gịnị ka ọ na-echetara anyị? Ọ na-echetara anyị na obodo a adịghị n’eluigwe, kama ọ dị n’ụwa. N’obodo a, a na-arụ ọrụ na-abara ndị niile na-efe Chineke ezigbo ofufe uru.

9. (a) Olee ndị so ‘n’obodo’ a dị n’ụwa taa? (b) Gịnị ka Jizọs ga-eme mgbe ọ ga-achịwa otu puku afọ?

9 Olee ndị so ‘n’obodo’ a dị n’ụwa? N’ọhụụ Ezikiel hụrụ, a kpọrọ onye na-ahụ maka ihe a na-eme n’obodo ahụ “onyeisi.” (Ezik. 45:7) Ọ bụ ya na-elekọta ndị obodo ya, ma ọ bụghị onye nchụàjà ma ọ bụ onye Livaị. Onyeisi a na-eme ka anyị cheta ndị okenye ọgbakọ ndị na-esoghị ná ndị e tere mmanụ. Ndị okenye a, bụ́ ndị na-azụ ndị Chineke, ndị sokwa n’atụrụ ọzọ, dị umeala n’obi. Ha na-ejekwara ọchịchị Kraịst nke si n’eluigwe na-achị ozi. (Jọn 10:16) Mgbe Jizọs ga-achịwa otu puku afọ, ọ ga-ahọpụta ndị okenye ruru eru ma ọ bụ “ndị isi” “n’ụwa niile.” (Ọma 45:16) Alaeze Chineke ga na-enye ha ntụziaka, ha ana-elekọta ndị Chineke mgbe Jizọs ga-achịwa otu puku afọ.

“Jehova Nọ Ebe Ahụ”

10. Gịnị bụ aha obodo ahụ? Oleekwa otú aha a si eme ka obi sie ndị Chineke ike?

10 Gụọ Ezikiel 48:35. Aha obodo ahụ bụ “Jehova Nọ Ebe Ahụ.” Aha a na-eme ka obi sie ndị Chineke ike na Jehova ga-anọnyere ha n’obodo ahụ. Mgbe Jehova gosiri Ezikiel obodo a dị n’etiti ala ndị Chineke, ihe ọ na-agwa ndị ahụ a dọọrọ n’agha bụ na ọ ga-anọnyere ha ọzọ. Ihe a na-emesi obi ike.

11. Gịnị na gịnị ka obodo ahụ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ na ezigbo ihe aha obodo ahụ pụtara na-akụziri anyị?

11 Gịnị ka amụma Ezikiel a na-akụziri anyị? Aha obodo a na-eme ka obi sie ndị na-efe Jehova taa ike na ọ na-anọnyere ndị niile na-erubere ya isi n’ụwa ugbu a, ọ ga-anọnyekwara ha ruo mgbe ebighị ebi. E nwekwara ezigbo ihe ọzọ aha a na-akụziri anyị. Ọ na-akụziri anyị na ihe mere e ji nwee obodo a abụghị ka e mee ụfọdụ ndị ndị isi, kama ọ bụ ka a hụ na a na-eme ihe otú kwesịrị ekwesị, otú Jehova, Onye hụrụ anyị n’anya, chọrọ. Dị ka ihe atụ, Jehova enyeghị ndị nlekọta ahụ ikike ikere ndị ya ala otú dị mmadụ efu mma. Kama, Jehova na-atụ anya ka ha kwanyere otú yanwa si keere ndị mmadụ ala ùgwù, ya bụ, ọrụ o nyere onye ọ bụla na-efe ya, ma ndị “ọ na-enweghị ka ọ hà” ha.—Ilu 19:17; Ezik. 46:18; 48:29.

12. (a) Olee ihe mere ka obodo a pụọ iche? Gịnị ka ọ na-egosi? (b) Gịnị bụ ihe dị mkpa ọhụụ a na-echetara ndị okenye ọgbakọ?

12 Olee ihe ọzọ mere ka obodo a aha ya bụ “Jehova Nọ Ebe Ahụ” pụọ iche? N’oge ochie, obodo dị iche iche na-enwe mgbidi gburugburu ma nwee ọnụ ụzọ ámá ole na ole. Ma, obodo a nwere ọnụ ụzọ ámá iri na abụọ. (Ezik. 48:30-34) Otú ọnụ ụzọ ámá ya si dị ọtụtụ (atọ n’akụkụ ya nke ọ bụla) na-egosi na ndị na-elekọta obodo a ga-anọ ya mgbe ọ bụla ndị na-efe Chineke chọrọ ịhụ ha, ọ gaghịkwa esiri ndị Chineke ike ịbịakwute ha. Ihe ọzọ bụ na ọnụ ụzọ ámá iri na abụọ a na-egosi na onye ọ bụla, ma ọ bụ “ndị Izrel niile,” nwere ike isi na ha bata. (Ezik. 45:6) Otú o si adị mfe ịbata n’obodo a na-echetara ndị okenye ọgbakọ otu ihe dị mkpa. Ọ na-echetara ha na Jehova chọrọ ka ha mee ka ọ na-adịrị ndị niile bi n’ala ndị Chineke mfe ịbịakwute ha na ịgwa ha okwu nakwa ka ha dị njikere mgbe niile inyere ha aka.

Ọ na-adịrị ndị na-efe Jehova mfe ịbịakwute ndị okenye, ha na-adịkwa njikere inyere ụmụnna ha aka (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12)

Ndị Chineke ‘Na-abata Ife’ Ya ma “Na-ejere Obodo Ozi”

13. Gịnị ka Jehova kwuru gbasara ọrụ dị iche iche ndị ya ga na-arụ?

13 Ka anyị gaghachi n’oge Ezikiel ma chọpụta ihe ndị ọzọ o dere gbasara ala ọ hụrụ n’ọhụụ a ga-ekere ndị Chineke. N’ọhụụ ahụ, Jehova kwuru gbasara ọrụ dị iche iche ndị ya ga na-arụ. Ndị nchụàjà na ndị Livaị ga “na-eje ozi n’ụlọ nsọ.” Ma, ndị nchụàjà ga na-achụ àjà, na-abịakwa n’ihu Jehova ijere ya ozi. Ndị Livaị ga na-ahụ “maka ozi niile a ga na-eje na ya nakwa ihe niile a ga na-eme na ya.” (Ezik. 44:14-16; 45:4, 5) A ga-enwekwa ndị ga na-arụ ọrụ n’ebe dị nso n’obodo ahụ. Ole ndị ka ha bụ?

14. Olee ihe ndị ga na-arụ ọrụ n’ebe dị nso n’obodo ahụ na-echetara anyị?

14 Ndị ga na-arụ ọrụ n’ebe dị nso n’obodo ahụ ga-esi “n’ebo niile n’Izrel.” Ha ga na-enyere ndị ọzọ na-arụ ọrụ aka. Ọrụ ha bụ ịkụ mkpụrụ ndị ga na-emepụta ihe “ndị na-ejere obodo ozi ga na-eri.” (Ezik. 48:18, 19) Ọ̀ bụ na ihe a anaghị echetara anyị ọrụ anyị na-arụ taa? Ee. Taa, ndị niile na-efe Chineke ezigbo ofufe nwere ike ịkwado ọrụ ụmụnna Kraịst, bụ́ ndị e tere mmanụ, na-arụ nakwa ọrụ ndị so ‘n’oké ìgwè mmadụ,’ ndị Jehova họpụtara ka ha na-edu ndị ya, na-arụ. (Mkpu. 7:9, 10) Otu ụzọ kachanụ anyị si akwado ha bụ iji obi anyị niile na-eso ntụziaka ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na-enye anyị.

15, 16. (a) Olee ihe ndị ọzọ anyị na-amụta n’ọhụụ ahụ Ezikiel hụrụ? (b) Olee ọrụ ndị anyị nwere ike ịrụ yiri ndị nke a rụrụ n’ọhụụ Ezikiel hụrụ?

15 E nwere ihe ọzọ e kwuru n’ọhụụ Ezikiel hụrụ nke anyị ga-amụta ihe na ya gbasara ozi anyị. Gịnị bụ ihe ahụ? Jehova kwuru na ndị si n’ebo iri na abụọ, bụ́ ndị na-esoghị n’ebo Livaị, ga na-arụ ọrụ n’ebe abụọ, ya bụ, n’ogige ụlọ nsọ nakwa n’ebe a na-akọ ihe n’obodo ahụ. Gịnị ka ha ga na-arụ n’ebe nke ọ bụla? Ebo niile ‘ga na-abata ife Chineke’ n’ogige ụlọ nsọ ahụ. Otú ha si eme ya bụ ịchụrụ Jehova àjà dị iche iche. (Ezik. 46:9, 24) Ndị sikwa n’ebo niile na-abịa akwado obodo ahụ. Otú ha si eme ya bụ ịkụ mkpụrụ n’ebe a na-akọ ihe n’obodo ahụ. Gịnị ka anyị na-amụta n’aka ndị ọrụ a?

16 Taa, ndị so n’oké ìgwè mmadụ nwere ike ịrụ ọrụ ndị yiri ndị nke a rụrụ n’ọhụụ Ezikiel hụrụ. Ha na-efe Jehova “n’ụlọ nsọ ya.” Otú ha si eme ya bụ ịchụrụ ya “àjà otuto.” (Hib. 13:15; Mkpu. 7:9-15) Ha na-achụ àjà a mgbe ha na-ekwusa ozi ọma na mgbe ha na-aza ajụjụ ma na-abụ abụ n’ọmụmụ ihe, si otú a na-egosi na ha nwere okwukwe. Ha ghọtara na otú a ha si efe Jehova bụ ihe kacha mkpa ha kwesịrị ịna-eme. (1 Ihe 16:29) Ọtụtụ ndị na-efe Chineke nwekwara ụzọ ndị ọzọ ha si akwado nzukọ Chineke. Dị ka ihe atụ, ha na-eso arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze na alaka ụlọ ọrụ ma na-arụzi ihe ndị mebiri emebi na ha. Ha na-esokwa arụ ọrụ ndị ọzọ nzukọ Jehova na-arụ. Ndị ọzọ na-eji ego ha na-enye n’onyinye akwado ọrụ ndị a. E nwere ike ịsị na ha niile na-akụ mkpụrụ n’ala “ka e too Chineke.” (1 Kọr. 10:31) Ha ji ọṅụ na-arụ ọrụ ha, ọ na-anụkwa ha ọkụ n’obi ịrụ ya, n’ihi na ha ma na “ụdị àjà ndị a na-adị Chineke ezigbo mma.” (Hib. 13:16) Ì ji obi gị niile na-akwado ọrụ a?

Gịnị na gịnị ka anyị mụtara n’ihe dị iche iche Ezikiel kwuru a na-eme n’ọnụ ụzọ àmà nakwa n’ebe dị ha nso? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14-16)

“E Nwere Eluigwe Ọhụrụ na Ụwa Ọhụrụ O Kwere ná Nkwa Anyị Na-atụ Anya Ha”

17. (a) Olee otú ọhụụ Ezikiel hụrụ ga-esi emezu n’ọdịnihu karịa otú o mezuburu? (b) Mgbe Jizọs ga-achịwa otu puku afọ, ole ndị ka obodo ahụ ga-abara uru?

17 Ọhụụ Ezikiel hụrụ ala a ga-ewepụta iche ọ̀ ga-emezu n’ọdịnihu karịa otú o mezuburu? Ee. Chebagodịrị ihe a echiche: Ezikiel hụrụ na ala a kpọrọ ‘ala dị nsọ’ dị n’etiti ala e keere ndị Chineke. (Ezik. 48:10) A lụchaa agha Amagedọn, Jehova ga-anọnyekwara anyị n’agbanyeghị ebe anyị ga-ebi n’ụwa. (Mkpu. 21:3) Mgbe Jizọs ga-achịwa otu puku afọ, obodo ahụ, ya bụ, ndị a ga-ahọpụta n’ụwa ka ha na-elekọta ndị Chineke, ga na-enyekwuru ndị Chineke aka n’ụwa niile. Otú ha ga-esi eme ya bụ na ha ga na-eduzi mmadụ niile so ‘n’ụwa ọhụrụ,’ ya bụ, ndị ezi omume, ma na-enye ha ntụziaka otú gosiri na ha hụrụ ha n’anya.—2 Pet. 3:13.

18. (a) Gịnị mere obi ga-eji sie anyị ike na ntụziaka si n’obodo ahụ ga na-adaba n’ihe ọchịchị Chineke chọrọ? (b) Olee otú aha obodo ahụ si eme ka obi sie anyị ike?

18 Gịnị mere obi ga-eji sie anyị ike na ntụziaka si n’obodo ahụ ga na-adaba n’ihe ọchịchị Chineke chọrọ? Ọ bụ n’ihi na Okwu Chineke mere ka o doo anya na obodo ahụ dị n’ụwa, nke nwere ọnụ ụzọ àmà iri na abụọ, yiri obodo dị n’eluigwe nke nwekwara ọnụ ụzọ àmà iri na abụọ. Aha obodo a bụ Jeruselem Ọhụru, ya bụ, otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ (144,000) ha na Kraịst ga-eso chịa. (Mkpu. 21:2, 12, 21-27) Ihe a na-egosi na mkpebi obodo ahụ dị n’ụwa ga na-eme ga-adaba n’ihe Alaeze Chineke nke si n’eluigwe na-achị kpebiri, ha ga-ahụkwa na e mere ihe ndị e kpebiri otú kwesịrị ekwesị. N’eziokwu, aha obodo ahụ, nke bụ́ “Jehova Nọ Ebe Ahụ,” na-eme ka obi sie onye ọ bụla n’ime anyị ike na a ga-anọgide na-efe Chineke ezigbo ofufe, na-efekwa ya ruo mgbe ebighị ebi na paradaịs. Ọ bụ ezigbote ihe ọma ga-emere anyị n’ọdịnihu.