IGBE 6A
“Kpụọ Isi Gị na Afụ Ọnụ Gị”
Ezikiel mere ihe ndị gosiri ihe ndị ga-emecha mee na Jeruselem
-
“Kpụọ Isi Gị na Afụ Ọnụ Gị”
A ga-alụso ndị Juu agha ma gbuo ha
-
‘Tụọ Ntutu Gị ma Kee Ya’
Ihe niile Jehova kwuru a ga-eme Jeruselem ga-emezucha
-
‘Gbaa Otu Ụzọ Ọkụ’
Ụfọdụ ndị Juu ga-anwụ n’ime Jeruselem
-
‘Gbuo Otu Ụzọ Mma Agha’
A ga-egbu ụfọdụ ndị Juu n’ebe na-abụghị n’ime Jeruselem
-
‘Ghasasịa Otu Ụzọ’
A ga-achụsasị ndị fọrọ, ma obi agaghị eru ha ala
-
‘Chịrị Ole na Ole Fụchie’
Ụfọdụ n’ime ndị a dọọrọ n’agha ga-alọghachi Jeruselem malitekwa ife Chineke ezigbo ofufe