Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbakọ a na-agaghị echefu echefu e nwere n’afọ 1919 gosiri nnọọ na e sila na Babịlọn Ukwu ahụ tọhapụ ndị Chineke

IGBE 9B

Ihe Mere n’Afọ 1919

Ihe Mere n’Afọ 1919

Gịnị mere anyị ji kwuo na e si na Babịlọn Ukwu ahụ tọhapụ ndị Chineke n’afọ 1919? Ọ bụ amụma Baịbụl na ihe ndị mere eme mere anyị ji kwuo otú ahụ.

Amụma Baịbụl na ihe ndị mere eme gosiri n’eziokwu na Jizọs malitere ịchị n’eluigwe n’afọ 1914. Ọ bụkwa mgbe ahụ ka oge ikpeazụ nke ụwa ọjọọ Setan malitere n’ụwa ebe a. Gịnị ka Jizọs mere mgbe e chiri ya Eze? Ihe o mere ozugbo ọ̀ bụ isi na Babịlọn Ukwu ahụ tọhapụ ndị na-eso ụzọ ya nọ n’ụwa? Ọ̀ họpụtara “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” n’afọ 1914 ma malite nnukwu ọrụ iwe ihe ubi?—Mat. 24:45.

O doro anya na ọ bụghị ihe o mere. Cheta na Pita onyeozi si n’ike mmụọ nsọ kwuo na a ga-esi “n’ụlọ Chineke malite ikpe ikpe.” (1 Pita 4:17) Malakaị onye amụma bukwara amụma na e nwere oge Jehova ga-abịa n’ụlọ a na-anọ efe ya ofufe, ya na “onye ozi nke ọgbụgba ndụ,” ya bụ, Ọkpara Chineke. (Mal. 3:1-5) Oge ahụ ga-abụ oge a ga-anụcha ndị Chineke, nwaleekwa ha. Ihe ndị a e buru n’amụma hà dabara n’ihe ndị mere eme?

Ee, ha dabara. Afọ 1914 ruo ná mmalite afọ 1919 bụụrụ Ndị Mmụta Baịbụl, ya bụ, Ndịàmà Jehova, oge tara akpụ. Ọ bụ oge a nwalere ha ma nụchaa ha. N’afọ 1914, o wutere ọtụtụ ndị Chineke n’ụwa na ọgwụgwụ abịaghị n’oge ahụ otú ha tụrụ anya ya. Obi gbawara ha n’afọ 1916, mgbe Charles T. Russell, onye na-edu ndị Chineke n’oge ahụ, nwụrụ. A họpụtaziri Joseph F. Rutherford ka o duwezie ndị Chineke n’oge ahụ. Ma, ndị ha na Nwanna Russell dị n’ezigbo mma jụrụ na Nwanna Rutherford agaghị edu ha. Ihe a kpatara ọtụtụ nsogbu nke na ọ fọrọ obere ka ọgbakọ Chineke kewaa n’afọ 1917. N’afọ 1918, a kpụụrụ Nwanna Rutherford na ụmụnna asaa ndị ọzọ ya na ha na-arụkọ ọrụ, kpee ha ikpe mkpegbu, maa ha ikpe ma tụọ ha mkpọrọ. O doro anya na ọ bụ ndị isi okpukpe mere ka ndị ọchịchị mee ihe a. Ihe a meziri ka e mechie isi ụlọ ọrụ anyị dị na Bruklin. O doro anya na e sibeghị na Babịlọn Ukwu ahụ tọhapụ ndị Chineke n’oge ahụ.

Ma gịnị mere n’afọ 1919? Ihe gbanwere ngwa ngwa otú a na-atụghị anya ya. Ná mmalite afọ ahụ, e si n’ụlọ mkpọrọ tọhapụ Nwanna Rutherford na ụmụnna asaa ndị ahụ. Ha malitekwara ịrụ ọrụ ozugbo. N’egbughị oge, e mere ndokwa ka e nwee mgbakọ ukwu a na-agaghị echefu echefu. Ha malitekwara ọrụ na magazin ọhụrụ a ga-akpọ The Golden Age (a na-akpọzi ya Teta!). E wepụtara magazin ahụ ka e jiri ya na-ekwusa ozi ọma. A họpụtakwara onye nlekọta n’ọgbakọ ọ bụla ka ọ na-ahazi ọrụ ikwusa ozi ọma ma na-enyere ụmụnna aka ịga ozi ọma. N’afọ ahụ kwa, e bipụtara akwụkwọ a na-akpọ Bulletin (a na-akpọzi ya Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ) ka o nyere ụmụnna aka n’ịhazi ọrụ ikwusa ozi ọma.

Gịnị ka ihe niile a na-egosi? O doro anya na Kraịst esila na Babịlọn Ukwu ahụ tọhapụ ndị ya, họpụtakwa ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche. N’eziokwu, ọrụ iwe ihe ubi amalitela. Kemgbe afọ 1919, bụ́ afọ a na-agaghị echefu echefu, ọrụ ahụ na-aga n’ihu n’ihu otú dị ịtụnanya.