Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IGBE 10B

Olee Otú “Ọkpụkpụ Ndị Kpọrọ Nkụ” na ‘Ndị Àmà Abụọ’ Si Yie?

Olee Otú “Ọkpụkpụ Ndị Kpọrọ Nkụ” na ‘Ndị Àmà Abụọ’ Si Yie?

N’AFỌ 1919, amụma abụọ yiri ibe ha mezuru. Nke mbụ bụ nke “ọkpụkpụ kpọrọ nkụ,” nke abụọ abụrụ nke ‘ndị àmà abụọ.’ N’ọhụụ “ọkpụkpụ kpọrọ nkụ,” e buru amụma na a ga-enwe ogologo oge (nke mechara bụrụ ọtụtụ narị afọ) nke gwụrụ mgbe e mere ka ìgwè mmadụ buru ibu ndị na-efe Chineke dịrị ndụ. (Ezik. 37:2-4; Mkpu. 11:1-3, 7-13) Amụma e buru gbasara ‘ndị àmà abụọ’ kwuru banyere obere oge (nke mezuru malite ná ngwụcha afọ 1914 ruo ná mbido afọ 1919) nke gwụrụ mgbe e mere ka obere ìgwè ndị ohu Chineke dịrị ndụ. Amụma abụọ a gosiri na a ga-akpọlite ndị Chineke n’ọnwụ. Mana, ọ bụghị mbilite n’ọnwụ nkịtị. Ha abụọ mezuru n’afọ 1919 mgbe Jehova mere ka ndị ohu ya e tere mmanụ ‘jiri ụkwụ ha guzoro.’ N’oge ahụ, e si na Babịlọn Ukwu ahụ tọhapụ ha, ha anọrọzie n’ọgbakọ Chineke.—Ezik. 37:10.

Ma, buru n’uche na e nwere otu ihe dị iche n’otú amụma abụọ a si mezuo. Amụma e buru gbasara “ọkpụkpụ kpọrọ nkụ” na-ekwu na a ga-eme ka ndị niile so ná ndị e tere mmanụ fọrọ n’ụwa dị ndụ. Ma, amụma e buru gbasara ‘ndị àmà abụọ’ ahụ na-ekwu na a ga-eme ka ụfọdụ n’ime ndị e tere mmanụ fọrọ n’ụwa dị ndụ. Ọ bụ ha na-eduzi nzukọ Chineke, a họpụtakwara ha ka ha bụrụ “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche.”—Mat. 24:45; Mkpu. 11:6. a

“Ndagwurugwu Ọkpụkpụ Juru”—Ezik. 37:1

  1. MGBE AFỌ 100 O.N.K. GACHARA

    Malite mgbe afọ 100 O.N.K. gwụrụ gawa, bụ́ mgbe e gburu ọgbakọ Ndị Kraịst e tere mmanụ, “ọkpụkpụ” juru na “ndagwurugwu” ahụ

  2. MBIDO AFỌ 1919

    1919: ‘Ọkpụkpụ ndị ahụ kpọrọ nkụ’ bịara dịrị ndụ mgbe Jehova mere ka ndị niile e tere mmanụ si na Babịlọn Ukwu ahụ pụọ ma nọrọzie n’ọgbakọ Chineke

‘Ndị Àmà Abụọ’—Mkpu. 11:3

  1. NGWỤCHA AFỌ 1914

    ha yi “ákwà iru uju” na-ekwusa ozi ọma

    1914: ‘Ndị àmà abụọ’ ahụ yi “ákwà iru uju” kwusaa ozi ọma afọ atọ na ọkara. Mgbe oge ahụ gwụrụ, e gburu ha

  2. ha dị ka ndị nwụrụ anwụ

  3. MBIDO AFỌ 1919

    1919: ‘Ndị àmà abụọ’ ahụ bịara dịrị ndụ mgbe a hopụtara obere ìgwè ndị e tere mmanụ, bụ́ ndị na-eduzi ọgbakọ Chineke, ka ha bụrụ “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche”

a Gụọ Ụlọ Nche Mach 2016, “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ.”