Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IGBE 15A

Ụmụnne Abụọ Bụ́ Ndị Akwụna

Ụmụnne Abụọ Bụ́ Ndị Akwụna

N’Ezikiel isi 23, Chineke katọrọ ndị ya n’ihi na ha hapụrụ ya fewe chi ọzọ. Ọtụtụ n’ime ihe ndị e kwuru na ya yiri ihe dị n’isi 16. E jikwa nwaanyị akwụna mee ihe atụ n’isi 23 otú e mere n’isi 16. E kwuru na Jeruselem na Sameria bụ ụmụnne nakwa na ọ bụ Sameria tọrọ Jeruselem. Isi 16 na 23 gosiri na Jeruselem so nwanne ya nke nnukwu gbawa akwụna, mechazie ka ya n’ime ihe ọjọọ na n’ịkwa iko. N’isi 23, Jehova kwuru aha ụmụnne abụọ ahụ. Aha nke nnukwu bụ Ohola, ya bụ, Samaria, isi obodo alaeze ebo iri bụ́ Izrel. Aha nke obere bụ Oholiba, ya bụ, Jeruselem, isi obodo Juda. aEzik. 23:1-4.

E nwekwara ihe ndị ọzọ e kwuru n’isi 16 na isi 23 yiri ibe ha. E nwere ike ikwu na ndị kacha yie bụ na ndị akwụna ahụ bụbu ndị nwunye Jehova ma mechaa hapụ ya. Ọzọ abụrụ na ha ka nwere olileanya. E kwughị ọtụtụ ihe gbasara olileanya a n’isi nke 23. Ma, Jehova kwuru n’isi nke 23 a, sị: “M ga-eme ka ị kwụsị omume rụrụ arụ ị na-eme nakwa akwụna ị malitere ịgba.” Ihe a yiri ihe o kwuru n’isi 16.—Ezik. 16:16, 20, 21, 37, 38, 41, 42; 23:4, 11, 22, 23, 27, 37.

Ụmụ Nwaanyị Akwụna ahụ Hà Nọchiri Anya Ndị Kraịst Adịgboroja?

N’oge gara aga, akwụkwọ anyị kwuru na ụmụnne abụọ ahụ, bụ́ Ohola na Oholiba, nọchiri anya Ndị Kraịst adịgboroja, karịchaa, Chọọchị Katọlik na ndị nke Protestant. Ma, mgbe anyị kpekwuru ekpere, meekwuo nchọnchọ, anyị chọpụtara na e nwere ụfọdụ ajụjụ e kwesịrị ichebara echiche. Dị ka ihe atụ, è nwere mgbe e nwere ike ikwu na Ndị Kraịst adịgboroja bụ nwunye Jehova? È nwere mgbe ha na Jehova gbara ndụ? Mbanụ! Chọọchị ndị ahụ adịbedịghị mgbe Jizọs na Izrel nke Chineke gbara “ọgbụgba ndụ ọhụrụ.” E nwebeghịkwanụ mgbe chọọchị ndị ahụ so ná Ndị Kraịst e tere mmanụ bụ́ Izrel nke Chineke. (Jere. 31:31; Luk 22:20) Ọ bụ mgbe afọ 300 O.N.K. gafechara, bụ́ mgbe ndịozi Jizọs nwụcharala, ka a malitere inwe Ndị Kraịst adịgboroja. Ọ bụ ha bụ “ata” Jizọs kwuru okwu ya n’ihe atụ ọka wit na ata o mere.—Mat. 13:24-30.

Isi ihe ọzọ mere o ji bụrụ na ụmụnne abụọ ahụ anọchighị anya Ndị Kraịst adịgboroja bụ na Jehova kwuru na ọ bụrụ na ndị Jeruselem na ndị Sameria agbanwee, ya na ha ga-adị ná mma. (Ezik. 16:41, 42, 53-55) Baịbụl ò kwuru na Ndị Kraịst adịgboroja nwere ụdị olileanya a? Mbanụ! Ihe a ga-eme okpukpe ụgha niile so na Babịlọn Ukwu ka a ga-emekwa chọọchị ndị ahụ.

N’ihi ya, Ohola na Oholiba anọchighị anya chọọchị ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst. Ma, akụkọ ha na-enyere anyị aka ịghọta otu ihe dị ezigbo mkpa, ya bụ, otú Jehova si ele ndị na-emebi aha nsọ ya na ndị na-anaghị efe ya otú o kwuru ka e si na-efe ya anya. Ndị kacha eme ihe ọjọọ a bụ imeriime chọọchị adịgboroja sị na ha bụ Ndị Kraịst, ndị sịrị na ha na-anọchite anya Chineke, Onye nyere anyị Baịbụl. Ha sịkwara na ọ bụ Ọkpara Jehova, bụ́ Jizọs Kraịst, na-edu ha. Ma, ihe a ha kwuru bụ naanị n’ọnụ n’ihi na ha na-akụzi na Jizọs so na chi atọ n’ime otu. Ha anaghịkwa erube isi n’ihe Jizọs kwuru, nke bụ́ ka Ndị Kraịst ghara ịbụ “nke ụwa.” (Jọn 15:19) Chọọchị ndị a egosila na ha so bụrụ “oké nwaanyị akwụna” ahụ n’ihi na ha na-etinye aka n’ikpere arụsị nakwa ná ndọrọ ndọrọ ọchịchị. (Mkpu. 17:1) N’ihi ya, o doro anya na ihe ga-eme okpukpe ụgha niile e nwere n’ụwa ga-eme ha.

a E nwere ihe mere e ji kpọọ ha aha ndị ahụ. Ohola pụtara “Ụlọikwuu [Ofufe] Ya.” Ọ ga-abụ na a kpọrọ ya aha a maka na ndị Izrel na-arụrụ onwe ha ebe ha na-anọ efe ofufe kama ịna-aga n’ụlọ nsọ Jehova dị na Jeruselem. Ma, Oholiba pụtara “Ụlọikwuu [Ofufe] M Dị n’Ime Ya.” Ọ bụ na Jeruselem ka ụlọ nsọ Jehova dị.