Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IGBE 16A

Ndị Kraịst Adịgboroja Hà Nọchiri Anya Jeruselem Oge Ochie?

Ndị Kraịst Adịgboroja Hà Nọchiri Anya Jeruselem Oge Ochie?

N’oge gara aga, akwụkwọ anyị kwuru na Ndị Kraịst adịgboroja nọchiri anya ndị bi na Jeruselem kwụsịrị ife Chineke fewe chi ọzọ. Ihe ndị nnupụisi a bi na Jeruselem nọ na-eme, ma ikpere arụsị ma ime mpụ, na-echetara anyị ihe Ndị Kraịst adịgboroja na-eme taa. Ma na nso nso a, akwụkwọ anyị, ma nke a ị na-agụ ugbu a, anaghịzi ekwu na ihe e buru n’amụma nwere ihe ọ nọchiri anya ya, ọ gwụla ma è nwere ihe doro anya Baịbụl kwuru mere a ga-eji kwuo otú ahụ. È nwere ihe Baịbụl kwuru mere a ga-eji kwuo na Ndị Kraịst adịgboroja nọchiri anya Jeruselem oge ochie? Mba.

Chebagodịrị ihe ndị a echiche: E nwere mgbe a na-efe Chineke ezigbo ofufe na Jeruselem. E mechazie ndị bi na ya akwụsị ife Chineke fewe chi ọzọ. Ma, e nwebeghị mgbe Ndị Kraịst adịgboroja fere Chineke ezigbo ofufe. Ọ bụ ozizi ụgha ka ha na-akụzi kemgbe ha malitere, ya bụ, mgbe afọ 300 O.N.K. gafechara.

Mgbe ndị Babịlọn bibichara Jeruselem, Jehova na ndị bi na Jeruselem mechara dịrị ná mma, ya abụrụkwa ebe a na-anọ efe Chineke. Ma, e nweghị mgbe Ndị Kraịst adịgboroja na Chineke dị ná mma. E bibie okpukpe ụgha n’oge oké mkpagbu, ọ gaghị eselite isi ọzọ.

Gịnị ka ihe ndị a na-egosi? Anyị mụọ amụma ndị Baịbụl buru mezuru n’isi ndị nnupụisi biri na Jeruselem, anyị nwere ike ịsị, ‘Ihe a yiri ihe Ndị Kraịst adịgboroja na-eme taa.’ Ma, o yiri ka e nweghị ihe Baịbụl kwuru gosiri na Ndị Kraịst adịgboroja nọchiri anya Jeruselem oge ochie.