Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IGBE 21A

“Ala Unu Ga-ewepụta Iche”

“Ala Unu Ga-ewepụta Iche”

EZIKIEL 48:8

Ka anyị soro Ezikiel ka ọ na-elerukwu ala Jehova wepụtara iche anya. Ala a nwere mpaghara ise. Gịnị bụ aha ha? Gịnịkwa ka a na-eme na ha?

A. “Ala Unu Ga-ewepụta Iche”

Ọ bụ maka ndị ọchichị. A kpọkwara ya “ala ebe ndị nlekọta na-anọ ahazi ihe.”

EZIK. 48:8

B. “Ala Niile E Nyere Chineke”

E wepụtara ya iche maka ndị nchụàjà, ndị Livaị, nakwa maka obodo. Ihe ọzọ bụ na ndị niile si n’ebo iri na abụọ na-abanye n’ala a iji fee Jehova nakwa iji na-akwado ọchịchị obodo ahụ.

EZIK. 48:20

CH. “Ala Onyeisi”

“Ala ahụ ga-abụ nke ya n’Izrel.” “Ọ ga-abụkwa nke onyeisi.”

EZIK. 45:7, 8; 48:21, 22

D. “Ala Dị Nsọ”

A kpọrọ ebe a “ala dị nsọ.” Ebe elu ya bụ “nke ndị Livaị.” “Ọ dị nsọ.” E kwuru gbasara ebe etiti ya na “ọ bụ ndị nchụàjà ka a ga-enye ala a dị nsọ.” “Ọ ga-abụ ebe ha ga-arụ ụlọ, bụrụkwa ebe dị nsọ a ga-arụ ụlọ nsọ.”

EZIK. 45:1-5; 48:9-14, 20

E. “Ala nke Fọrọnụ”

“Ọ ga-abụ nke ndị Izrel niile” na “nke ndị obodo. Ha ga-ebi na ya, nweekwa ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa.”

EZIK. 45:6; 48:15-19

[Foto dị na peeji nke 220]