Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ndị Bịara Mgbakọ Kwesịrị Ịma

Ihe Ndị Bịara Mgbakọ Kwesịrị Ịma

NZUKỌ PỤRỤ ICHE

ỤLỌ AKWỤKWỌ MAKA NDỊ NA-EKWUSA OZI ỌMA ALAEZE N’ehihie Sọnde, a ga-enwe nzukọ maka ndị chọrọ ịga Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze. Ndị ọsụ ụzọ chọrọ ijikwu oge buru ibu na-ejere Jehova ozi nwere ike ịbịa nzukọ a. Ha ga-abụ ndị nọ n’agbata afọ iri abụọ na atọ na afọ iri isii na ise. A ga-ama ọkwa ebe a ga-enwe nzukọ a na oge ọ ga-abụ.

IHE NDỊ BỊARA MGBAKỌ KWESỊRỊ ỊMA

BAPTIZIM Ndị a ga-eme baptizim kwesịrị ịnọrọ ọdụ n’ebe e debeere ha oche tupu a malite ikwu okwu baptizim n’ụtụtụ Satọdee. Ha ga-anọ ọdụ n’oche ndị dị n’ihu ihu n’ụlọ mgbakọ, n’ebe chere ikpo okwu ihu. Onye ọ bụla n’ime ha kwesịrị iweta ákwà ọ ga-eji hichaa ahụ́ na uwe kwesịrị ekwesị ọ ga-eyi mgbe a na-eme ya baptizim.

EBE A NA-ANARA ỌGWỤ Biko, buru n’uche na ebe a bụ NAANỊ maka NDỊ E KWESỊRỊ ILEBARA ANYA NGWA NGWA.

EBE A NA-EDEBE IHE FURU EFU Ọ bụrụ na ị hụ ihe ọ bụla furu efu, wega ya n’Ebe A Na-edebe Ihe Furu Efu. Ọ bụrụ na o nwere ihe ọ bụla funahụrụ gị, gaa ná ngalaba a ka ị mara ma ọ̀ dị ebe ahụ. Ị hụ nwatakịrị furu efu, biko, kpọga ya ná ngalaba a. Ma, ọ pụtaghị na ọrụ ngalaba a bụ ilekọta ụmụaka. Biko, lekọta ụmụ gị, hụkwa na gị na ha nọ.

INWETA OCHE Biko, na-echebara ndị ọzọ echiche. Cheta na ọ bụ naanị ndị gị na ha bi n’otu ụlọ, ma ọ bụ ndị gị na ha ji otu ụgbọala bịa, ma ọ bụkwanụ ndị ị na-amụrụ Baịbụl ka i nwere ike inwetara oche. Biko, edosala ihe n’elu oche ma ọ bụrụ na o nweghị onye ị na-enwetara oche ahụ.

MMADỤ IWEPỤTA ONWE YA Ọ bụrụ na ị chọrọ iwepụta onwe gị iso na-arụ ọrụ ndị a ga-arụ ná mgbakọ a, biko, jee ná ngalaba a ka a gwa gị ebe ị ga-enye aka.

NDỊ ATENDANTỊ Ọrụ ndị atendantị bụ inyere gị aka. Biko, na-erubere ha isi ma ha gwa gị ebe ị ga-adọwa ụgbọala, ebe ị ga-esi banye n’ala mgbakọ, ebe ị ga-esi pụọ, ebe ị ga-anọ ọdụ, na ihe ndị ọzọ.

ONYINYE E mefuru nnukwu ego iji hụ na e nwere oche ga-ezu ndị bịara mgbakọ a, na ígwè okwu, na tiivi na vidio kamera, nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ ga-eme ka mgbakọ a tọọ gị ụtọ, ma mee ka i nwee ike ịbịarukwu Jehova nso. Ọ bụrụ na i nye onyinye si gị n’obi, a ga-eji ya kwụọ ụgwọ ihe e mefuru, jirikwa ya na-akwado ọrụ anyị na-arụ n’ụwa niile. E dewere igbe onyinye n’ebe niile n’ala mgbakọ a ka i nwee ike itinye onyinye gị na nke ọ bụla dị gị nso. Obi dị anyị ezigbo ụtọ maka ihe ọ bụla i tinyere. Òtù Na-achị Isi na-ekelekwa gị maka otú i si jiri onyinye gị na-akwado ihe ndị gbasara Alaeze Chineke.

Ọ bụ Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova haziri ya