Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE ỌMỤMỤ NKE 3

Ịjụ Ajụjụ

Ịjụ Ajụjụ

Matiu 16:13-16

IHE Ị GA-EME: Jiri akọ jụọ ndị na-ege gị ntị ajụjụ ndị ga-eme ka ha nwee mmasị n’ihe ị na-ekwu, chebara ihe ị na-ekwu echiche, meekwa ka isi ihe ndị dị n’okwu gị doo anya.

OTÚ Ị GA-ESI EME YA:

  • Dọta mmasị ndị ị na-agwa okwu. Na-ajụ ndị ị na-agwa okwu ajụjụ ndị ga-eme ka ha chebara ihe ị na-agwa ha echiche ma ọ bụkwanụ chọwa ka ha mata azịza ha.

  • Kwuo ihe ga-eme ka ndị ị na-agwa okwu chee echiche. Na-ajụ ndị ị na-agwa okwu ajụjụ ndị ga-eme ka ha chebara ihe ị na-agwa ha echiche, ka ha nwee ike ịmata nke bụ́ eziokwu.

  • Mee ka isi ihe ndị ị na-ekwu doo anya. Jụọ ajụjụ ma ị chọọ ịkọwa otu ihe gbara ọkpụrụkpụ. Jụọkwa ajụjụ ntụleghachi ma ị kọwachaa otu ihe dị mkpa ma ọ bụ mgbe ị na-apịachi okwu gị.