Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE ỌMỤMỤ NKE 5

Igụzi Ihe Agụzi

Igụzi Ihe Agụzi

1 Timoti 4:13

IHE Ị GA-EME: Gụpụta ihe e dere n’akwụkwọ otú e si dee ya.

OTÚ Ị GA-ESI EME YA:

  • Kwadebe nke ọma. Chọpụta ihe mere e ji dee ihe ị chọrọ ịgụ. Kama ịna-agụ ihe otu otu, mụta ịna-agụkọta okwu ụfọdụ ọnụ. Lezie anya ka ị ghara itinye okwu, ịmafe okwu ma ọ bụkwanụ iji okwu ọzọ gbanwee nke dị adị. Leruokwa akara niile dị n’ihe ị na-agụ anya.

  • Kpọzie okwu nke ọ bụla akpọzi. E nwee okwu ị na-amaghị otú e si akpọ ya n’akwụkwọ ị na-agụ, jụọ onye ị ma na-agụ ihe nke ọma ka o nyere gị aka ma ọ bụkwanụ gị egee akwụkwọ ahụ nke a na-egere egere.

  • Na-akpọpụta okwu nke ọma. Na-akpọpụta okwu nke ọma. Welite isi gị elu ma meghee ọnụ gị nke ọma mgbe ị na-ekwu okwu. Gbaa mbọ kpọpụta nkebi okwu nke ọ bụla.