Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE ỌMỤMỤ NKE 6

Kọwaa Ihe Ị Gụrụ n’Akwụkwọ Nsọ Otú Ga-edo Anya

Kọwaa Ihe Ị Gụrụ n’Akwụkwọ Nsọ Otú Ga-edo Anya

Jọn 10:33-36

IHE Ị GA-EME: Agụla amaokwu Baịbụl gafere n’ihe ọzọ n’akọwaghị ya akọwa. Mee ka ndị ị na-agwa okwu ghọta ihe jikọrọ amaokwu ị gụrụ na ihe ị na-agwa ha.

OTÚ Ị GA-ESI EME YA:

  • Kpọọ okwu ndị gbara ọkpụrụkpụ aha. Ị gụchaa amaokwu Baịbụl, gwa ndị na-ege gị ntị okwu ndị dị n’amaokwu ahụ gbasara isi ihe ị na-ekwu. Otú i nwere ike isi mee ya bụ ịgụghachị okwu ndị ahụ ọzọ, ma ọ bụ ịjụ ajụjụ ndị ga-eme ka ha jiri aka ha mata okwu ndị ahụ gbara ọkpụrụkpụ.

  • Mee ka ihe ị chọrọ ka a ghọta doo anya. Ọ bụrụ na ị kpọọ amaokwu Baịbụl, kwuo ihe mere i ji chọọ ịgụ ya, kọwaa otú okwu ndị gbara ọkpụrụkpụ n’amaokwu ahụ si gbasa ihe ahụ mere i ji gụọ ya.

  • Kọwaa ebe ị gụrụ na Baịbụl otú dị mfe nghọta. Lezie anya ka ị ghara ịna-akọwa ihe ndị na-adịghị mkpa na ihe ndị na-agbasaghị isi ihe ị na-ekwu. Jiri ihe ndị ị na-agwa okwu mabu banyere isiokwu gị kpebie ihe ole ị ga-akọwa ka ha nwee ike ịghọta ihe ị na-ekwu nke ọma.