Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE ỌMỤMỤ NKE 11

Ịnụ Ọkụ n’Obi

Ịnụ Ọkụ n’Obi

Ndị Rom 12:11

IHE Ị GA-EME: Jiri ịnụ ọkụ n’obi kwuo okwu otú ga-eme ka ndị ị na-agwa okwu mee ihe ị na-ekwu.

OTÚ Ị GA-ESI EME YA:

  • Ka ihe ị na-ekwu si gị n’obi. Ka ị na-akwadebe ihe omume gị, chesie echiche ike otú ihe omume gị dịruru ná mkpa. Mụọ ihe omume gị nke ọma ka i nwee ike isi n’obi gị kwuo ya.

  • Chebara ndị ị na-agwa okwu echiche. Chee echiche otú ihe ị ga-agụ ma ọ bụ ihe ị ga-akụzi ga-esi baara ndị ọzọ uru. Cheekwa echiche otú dị iche iche i nwere ike isi mee ihe omume gị ka ndị ị na-agwa okwu ghọta ihe ị na-ekwu nke ọma.

  • Mee ka okwu gị kpoo ọkụ. Jiri ịnụ ọkụ n’obi kwuo okwu. Ka otú i si emegharị ahụ́ na otú ihu gị dị gosi ndị ị na-agwa okwu otú obi dị gị n’ihe ị na-ekwu.