Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE ỌMỤMỤ NKE 12

Jiri Mmetụta Kwuo Okwu

Jiri Mmetụta Kwuo Okwu

1 Ndị Tesalonaịka 2:7, 8

IHE Ị GA-EME: Kwuo okwu otú gosiri na ị hụrụ ndị ị na-agwa okwu n’anya ma na-echebakwara ha echiche.

OTÚ Ị GA-ESI EME YA:

  • Chebara ndị ị na-agwa okwu echiche. Chebara nsogbu ndị ha na-enwe echiche. Gbalịakwa ka ị ghọta otú obi dị ha.

  • Na-ahọ okwu gị ahọ. Gbalịa ka okwu gị na-agba ndị na-ege gị ntị ume, na-akasi ha obi ma mee ka ha nweta ume ọhụrụ. Ekwula ihe ndị nwere ike ịkpasu ha iwe. Akatọkwala ndị na-anaghị efe Jehova ma ọ bụ katọọ ihe ndị ha kweere.

  • Mee ka ndị ị na-agwa okwu ghọta na i nwere mmasị n’ebe ha nọ: Otú i si jiri olu ọma na-ekwu okwu na otú i si na-emegharị ahụ́ ga-egosi ndị ị na-agwa okwu na ihe gbasara ha na-emetụ gị n’obi. Kama ịna-agbarụ ihu gị, na-amụmụrụ ha ọnụ ọchị.