Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE ỌMỤMỤ NKE 13

Mee Ka Uru Ihe Ị Na-ekwu Bara Doo Anya

Mee Ka Uru Ihe Ị Na-ekwu Bara Doo Anya

Aịzaya 48:17

IHE Ị GA-EME: Nyere ndị na-ege gị ntị aka ịghọta otú ihe ị na-ekwu si gbasa ndụ ha, gosikwa ha otú ha ga-esi jiri ihe ha mụtara nyere onwe ha aka.

OTÚ Ị GA-ESI EME YA:

  • Chebara ndị ị na-agwa okwu echiche. Chebara ihe mere ndị na-ege gị ntị ji kwesị ịnụ ihe ị chọrọ ịgwa ha echiche nakwa ihe ndị ga-abara ha ezigbo uru n’ihe ndị ị ga-agwa ha.

  • N’oge niile ị na-eme ihe omume gị, gosi ndị ị na-agwa okwu ihe ha ga-eme. Ozugbo i bidoro okwu gị, mee ka onye ọ bụla na-ege gị ntị ghọta na ihe ị na-ekwu gbasara ya. Mee ka ndị na-ege gị ntị ghọta otú ha nwere ike isi mee isi ihe nke ọ bụla ị na-ekwu. Na-akpọrọ ha okwu aha.