Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE ỌMỤMỤ NKE 17

Ikwu Ihe Ndị Ọzọ Ga-aghọtali

Ikwu Ihe Ndị Ọzọ Ga-aghọtali

1 Ndị Kọrịnt 14:9

IHE Ị GA-EME: Nyere ndị ị na-agwa okwu aka ka ha ghọta ihe ị na-ekwu nke ọma.

OTÚ Ị GA-ESI EME YA:

  • Mụọ ihe omume gị nke ọma. Gbalịa ghọta isiokwu ihe omume gị nke ọma ka i nwee ike iji okwu nke aka gị kọwaa ya otú ga-adị mfe nghọta.

  • Jiri okwu ndị dị mfe na okwu ndị na-etoghị ogologo kọwaa ya. Ọ bụ eziokwu na i nwere ike iji okwu ụfọdụ dị ogologo kọwaa ihe n’okwu gị, jiri okwu ndị dị mkpirikpi mee ka a ghọta isi ihe ndị dị n’okwu gị.

  • Kọwaa okwu ndị na-ege gị ntị na-amaghị nke ọma. Ọ kacha mma ịghara ikwu ihe ndị na-ege gị ntị na-amaghị. Ma ya dị ezigbo mkpa na ị ga-ekwu ihe ha na-amaghị, dị ka ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl, ihe ndị e ji atụ̀ ihe n’oge ochie ma ọ bụ omenala ndị oge ochie, kọwaa ha.