Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE ỌMỤMỤ NKE 18

Mee Ka Ndị Na-ege Ntị Mụta Ihe Na Ya

Mee Ka Ndị Na-ege Ntị Mụta Ihe Na Ya

1 Ndị Kọrịnt 9:19-23

IHE Ị GA-EME: Kwuo okwu otú ga-eme ka ndị ị na-agwa okwu chebara ihe ị na-ekwu echiche, ma hụkwa uru ọ baara ha.

OTÚ Ị GA-ESI EME YA:

  • Chọpụta ihe ndị ị na-agwa okwu mabu. Kama ikwughachiwa ihe ndị ha mabu, kwuo ya otú ọ ga-adị ha ka hà na-anụ ihe ọhụrụ.

  • Mee nchọnchọ, tụgharịakwa uche. O kwe mee, jiri ihe ndị mere eme ma ọ bụ okwu a kpụ n’ọnụ ndị na-ege gị ntị na-amachaghị gbasara ha mee ka ihe ị na-ekwu doo anya. Chebara ihe ndị ị na-aga ikwu echiche iji chọpụta ihe jikọrọ ha na ihe ndị i metara na nchọnchọ.

  • Gosi uru okwu gị bara. Kọwaara ndị na-ege gị ntị otú ihe Baịbụl kwuru ga-esi nyere ha aka ná ndụ. Kwuo ihe ụfọdụ na-eme ndị mmadụ, àgwà ụfọdụ ndị mmadụ na-akpa, na ihe ụfọdụ ndị mmadụ na-eme, bụ́ ndị gbasara ndị ị na-agwa okwu.