Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE ỌMỤMỤ NKE 19

Gbalịa Ka Ihe Ị Na-ekwu Ruo Ndị Mmadụ n’Obi

Gbalịa Ka Ihe Ị Na-ekwu Ruo Ndị Mmadụ n’Obi

Ilu 3:1

IHE Ị GA-EME: Nyere ndị na-ege gị ntị aka ka ha ghọta ihe ị na-ekwu ma mee ihe ha mụtara.

OTÚ Ị GA-ESI EME YA:

  • Nyere ndị na-ege gị ntị aka ichebara onwe ha echiche. Na-ajụ ha ajụjụ ndị ga-enyere ha aka ichebara onwe ha echiche.

  • Gbaa ha ume ime ihe dị mma. Gbaa ndị na-ege gị ntị ume ka ha chebara ihe mere ha ji na-eme ihe dị mma echiche. Nyere ha aka ịghọta na ihe mere ha kwesịrị iji na-eme ihe ọma bụ maka na ha hụrụ Jehova na mmadụ ibe ha nakwa eziokwu Baịbụl n’anya. Kwuo okwu otú ga-eme ka ndị ị na-agwa okwu na-echebara ihe ị na-ekwu echiche. Ekwula okwu ka ị̀ na-atụrụ ha ụka. Kama ikwu ihe ga-emechu ha ihu, kwuo okwu otú ga-agba ha ume nakwa otú ga-eme ka ha jiri obi ha niile na-agba mbọ.

  • Mee ka uche ha dịrị n’ebe Jehova nọ. Gosi otú ihe ndị Baịbụl kwuru na iwu Chineke si eme ka àgwà ndị Chineke nwere nakwa ịhụnanya o nwere n’ebe anyị nọ pụta ìhè. Mee ka ọ na-agụ ndị ị na-agwa okwu agụụ ịchọpụta ihe bụ́ uche Chineke na ime ihe dị ya mma.