Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE ỌMỤMỤ NKE 20

Mee Ka Okwu Mmechi Gị Kpoo Ọkụ

Mee Ka Okwu Mmechi Gị Kpoo Ọkụ

Ekliziastis 12:13, 14

IHE Ị GA-EME: I mechiwe okwu gị, gbaa ndị na-ege ntị ume ka ha jisie ike mee ihe ha mụtara.

OTÚ Ị GA-ESI EME YA:

  • I mechiwe okwu gị, ka ihe ị ga-ekwu daba n’isiokwu ihe omume gị. Kwughachi isiokwu gị na ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ n’okwu gị.

  • Gbaa ndị na-ege gị ntị ume. Gwa ndị na-ege gị ntị ihe ha kwesịrị ime, gwakwa ha ezigbo ihe mere ha ji kwesị ime ya. Jiri ịnụ ọkụ n’obi kwuo okwu otú gosiri na ihe ị na-ekwu doro gị anya nakwa na ọ dị mkpa.

  • Ka ihe ị ga-ekwu ma i mechiwe okwu gị dị nkenke ma dị mfe nghọta. Ekwula ihe ọhụrụ ná mmechi okwu gị. Kwuo okwu ole na ole iji gbaa ndị ị na-agwa okwu ume ka ha mee ihe ha mụtara.