Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 03

Obi Ò Kwesịrị Isi Gị Ike na Baịbụl Na-ekwu Eziokwu?

Obi Ò Kwesịrị Isi Gị Ike na Baịbụl Na-ekwu Eziokwu?

E nwere ọtụtụ nkwa Baịbụl kwere anyị, nweekwa ọtụtụ ndụmọdụ o nyere anyị. O nwere ike ịbụ na ị na-achọ ịma ihe ọ na-ekwu. Ma ikekwe, obi esichaghị gị ike na ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu. Obi ò kwesịrị isi gị ike na nkwa akwụkwọ a dịwara kemgbe kwere na ndụmọdụ o nyere nwere ike ịbara gị uru? Baịbụl kwuru na anyị ga-enweli obi ụtọ ugbu a nakwa n’ọdịnihu. Ì kwesịrị ikwere ihe a o kwuru? Ọtụtụ nde mmadụ achọpụtala na anyị kwesịrị ikwere. Ka anyị lee ma ị̀ ga-achọpụta ya.

1. Baịbụl ọ̀ bụ akwụkwọ na-ekwu eziokwu ka ọ̀ bụ akwụkwọ na-akọ akụkọ ifo?

Baịbụl kwuru na ihe ndị dị na ya bụ “okwu ndị e ji n’aka na ha bụ eziokwu.” (Ekliziastis 12:10) Ọ kọrọ ihe ndị mere eme gbasara ndị o nwere mgbe ha dịrị ndụ. (Gụọ Luk 1:3; 3:1, 2.) Ọtụtụ ndị na-akọ akụkọ ihe mere eme na ndị ọkachamara n’ihe ndị mgbe ochie achọpụtala na o nweghị ihe a na-enyo enyo na Baịbụl n’ihe banyere ụbọchị ndị o kwuru gbasara ha, ndị ọ kpọrọ aha, akụkọ ndị ọ kọrọ, na ebe ndị ọ kpọrọ aha.

2. Gịnị mere anyị ga-eji sị na Baịbụl ka bara uru n’agbanyeghị na o teela e dere ya?

N’oge e dere Baịbụl, e nwere ọtụtụ ihe ndị mmadụ na-amaghị Baịbụl kwuru gbasara ha. Dị ka ihe atụ, o kwuru ihe dị iche iche gbasara sayensị. N’oge e dere ha, ọtụtụ ndị ekweghị na ha bụ eziokwu. Ma, ndị sayensị achọpụtala taa na ihe ndị ahụ Baịbụl kwuru bụ eziokwu. “A ga-atụkwasịli ha obi mgbe niile, ma ugbu a ma ruo mgbe ebighị ebi.”Abụ Ọma 111:8.

3. Gịnị mere obi ji kwesị isi anyị ike na ihe Baịbụl kwuru na ha ga-eme n’ọdịnihu ga-eme?

Na Baịbụl, e nwere amụma a ndị kwuru banyere ihe ndị “a na-emebeghị.” (Aịzaya 46:10) E nweela ọtụtụ ihe merenụ, ma, ọtụtụ afọ tupu ha emee, Baịbụl kwuru na ha ga-eme. O kwukwara ihe ndị ga na-eme n’oge anyị a otú doro anya. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ụfọdụ amụma Baịbụl buru. Otú ha si emezu na-eme ka obi sie anyị ike na ọ na-ekwu eziokwu.

MỤTAKWUO IHE

Chọpụta otú ihe ndị sayensị kwuru si daba n’ihe Baịbụl kwuru, chebakwara amụma ole na ole ndị a Baịbụl buru echiche.

4. Ihe ndị sayensị kwuru dabara n’ihe Baịbụl kwuru

N’oge ochie, ọtụtụ ndị nọ na-eche na e nwere ebe e kokwasịrị ụwa. Kpọnyenụ VIDIO a.

Legodị ihe e dere n’akwụkwọ Job ihe dị ka puku afọ atọ na narị ise gara aga. Gụọnụ Job 26:7. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Gịnị mere ọ ga-eji ju anyị anya na ebe a kwuru na ‘e nweghị ihe e kokwasịrị ụwa na ya’?

Kemgbe ụwa, ihe gbasara otú mmiri si ezo, laghachi n’ígwé, zookwa ọzọ edochaghị ndị mmadụ anya. Ọ ka bụ n’ihe dị ka narị afọ abụọ gara aga ka ọ bịara doo ha anya. Ma, legodị ihe Baịbụl kwuru ihe dị ka puku afọ atọ na narị ise gara aga. Gụọnụ Job 36:27, 28. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Gịnị masịrị gị n’otú a doro anya e si kọwaa otú mmiri si ezo, laghachi n’ígwé, zookwa ọzọ?

  • Ebe a anyị gụrụ ugbu a ò mere ka obi sikwuo gị ike na ihe e dere na Baịbụl bụ eziokwu?

5. Baịbụl kwuru ihe ndị dị ezigbo mkpa ga-eme n’ọdịnihu

Gụọnụ Aịzaya 44:27–45:2. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee ihe dị iche iche Baịbụl kwuru gbasara ọdịda Babịlọn narị afọ abụọ tupu ha emee?

Akụkọ ihe mere eme gosiri na Saịrọs, bụ́ eze Peshia, na ndị agha ya meriri Babịlọn n’afọ 539 T.O.N.K. b Ha waara mmiri gbara obodo ahụ gburugburu ụzọ, chee ya ihu ebe ọzọ. Ha si n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ ghere oghe banye, merie obodo ahụ n’alụghị agha ọ bụla. Ọ karịala puku afọ abụọ na narị ise e bibiri Babịlọn. Ọ ka bụkwa ikpo nkume ruo taa. Ugbu a, ka anyị leba anya n’otu amụma dị na Baịbụl.

Gụọnụ Aịzaya 13:19, 20. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee otú amụma a e buru gbasara Babịlọn si mezuo?

Babịlọn bụzi ikpo nkume. Ọ dị n’ebe a na-akpọ Ịrak n’oge a

6. Baịbụl kwuru na ihe ndị na-eme n’oge anyị a ga-eme

Baịbụl kpọrọ oge anyị a “oge ikpeazụ.” (2 Timoti 3:1) Legodị ihe Baịbụl kwuru gbasara oge anyị a.

Gụọnụ Matiu 24:6, 7. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee ihe dị iche iche Baịbụl kwuru ga na-eme n’oge ikpeazụ?

Gụọnụ 2 Timoti 3:1-5. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Olee otú Baịbụl kwuru ndị mmadụ ga-esi na-akpa àgwà n’oge ikpeazụ?

  • Olee àgwà nke ị hụrụla ndị mmadụ na-akpa?

ỤFỌDỤ NA-ASỊ na Baịbụl bụ akwụkwọ na-akọ akụkọ ifo.

  • Olee ihe ị ga-asị na ọ bụ ya kacha egosi na Baịbụl na-ekwu eziokwu?

NCHỊKỌTA

Akụkọ ihe mere eme, sayensị, na amụma ndị dị na Baịbụl na-egosi na Baịbụl na-ekwu eziokwu.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Baịbụl ọ̀ bụ akwụkwọ na-ekwu eziokwu ka ọ̀ bụ akwụkwọ na-akọ akụkọ ifo?

  • Olee ihe ụfọdụ sayensị kwuru nke dabara n’ihe Baịbụl kwuru?

  • Ì chere na Baịbụl na-ekwu ihe ga-eme n’ọdịnihu? Gịnị mere i ji zaa ihe ị zara?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

È nwere ihe Baịbụl kwuru na-adabaghị n’ihe ndị sayensị kwuru?

“Baịbụl na Sayensị Hà Na-ekwu Otu Ihe?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)

Chọpụta otú amụma Baịbụl buru gbasara Alaeze ukwu Gris si mezuo.

Okwukwe Anyị Na-esikwu Ike ‘n’Okwu Amụma Ahụ’ 5:22

Chọpụta otú amụma ndị dị na Baịbụl si gbanwee otú otu nwoke si ele Baịbụl anya.

“Ekweghị M na Chineke Dị” (Ụlọ Nche Nke 5 2017)

a Ihe dị iche iche Chineke kwuru na ha ga-eme n’ọdịnihu so n’ihe a na-akpọ amụma.

b T.O.N.K. pụtara “Tupu Oge Ndị Kraịst.” O.N.K. pụtara “Oge Ndị Kraịst.”