Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 05

Baịbụl Bụ Okwu Chineke Gwara Anyị

Baịbụl Bụ Okwu Chineke Gwara Anyị

Baịbụl bụ onyinye pụrụ iche Jehova nyere anyị. Akwụkwọ iri isii na isii dị na ya. Ma i nwere ike ịna-eche, sị: ‘Olee otú Baịbụl si bido ịdị? Uche ònye ka e dere na ya?’ Anyị leba anya n’otú Okwu Chineke bụ́ Baịbụl si rute anyị aka, anyị ga-amata azịza ajụjụ ndị a.

1. Ebe ọ bụ ndị mmadụ dere Baịbụl, olee otú o si bụrụ uche Chineke ka e dere na ya?

Ọ bụ ihe dị ka mmadụ iri anọ dere Baịbụl. Ide ya were ihe dị ka otu puku afọ na narị isii. A malitere ide ya n’afọ 1513 Tupu Oge Ndị Kraịst, dechaa ya n’ihe dị ka n’afọ 98 Oge Ndị Kraịst. Ndị dere ya biri ndụ n’oge dị iche iche, nweekwa ihe dị iche iche ha na-arụ. N’agbanyeghị ya, ihe niile ha dere bụ otu. Gịnị mere o ji dị otú ahụ? Ọ bụ maka na ọ bụ Chineke gwara ndị ahụ ihe ha dere. (Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 2:13.) Ndị dere Baịbụl edeghị uche nke ha. Kama, ‘mmụọ nsọ nọ na-edu ha, ha ana-ekwu ihe Chineke chọrọ ka ha kwuo.’ a (2 Pita 1:21) Chineke ji mmụọ nsọ ya mee ka ndị mmadụ dee ihe bụ́ uche ya.—2 Timoti 3:16.

2. Olee ndị Baịbụl ga-abara uru?

Ozi ọma dị na Baịbụl nwere ike ịbara mmadụ niile uru, ya bụ, “mba niile na ebo niile na ndị na-asụ asụsụ niile na agbụrụ niile.” (Gụọ Mkpughe 14:6.) E nwere Baịbụl n’ọtụtụ asụsụ karịa akwụkwọ ọ bụla ọzọ. Ọ bụ Chineke mere ka ọ dị otú ahụ. N’agbanyeghị ebe ndị mmadụ bi ma ọ bụ asụsụ ha na-asụ, ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ onye ọ bụla nọ n’ụwa taa na-anụ ihe Baịbụl kwuru.

3. Olee otú Jehova si mee ka Baịbụl dịrị ruo taa?

N’oge e dere Baịbụl, e dere ya n’ihe ndị na-anaghị anọte aka, dị ka akpụkpọ anụ nakwa papaịrọs. Ma, ndị ji Baịbụl kpọrọ ihe ji aka na-edepụta ya. Ha kpachapụrụ anya mgbe ha nọ na-edepụta ya. Ụfọdụ ndị ọchịchị na ndị isi okpukpe gbara mbọ ka ha mee ka Baịbụl gharazie ịdị. Ma, e nwere ndị gbara mbọ mee ka Baịbụl dịgide n’agbanyeghị na ha ma na mbọ a nwere ike ịta isi ha. Jehova anaghị ekwe ka onye ọ bụla ma ọ bụ ihe ọ bụla mee ka ọ ghara ịgwa anyị ihe ndị ọ chọrọ ịgwa anyị. Baịbụl sịrị: “Okwu Chineke anyị na-adịru mgbe ebighị ebi.”Aịzaya 40:8.

MỤTAKWUO IHE

Chọpụtakwuo otú Chineke si jiri ike mmụọ nsọ mee ka ndị mmadụ dee Baịbụl, otú o si mee ka ọ dịrị ruo taa nakwa otú o si mee ka o ruo ndị mmadụ aka.

4. Baịbụl kwuru onye e dere uche ya na ya

Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu agụọ 2 Timoti 3:16. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Ọ bụrụ na ọ bụ ndị mmadụ dere Baịbụl, gịnị mere e ji akpọ ya Okwu Chineke?

  • Ì chere na mmadụ kwesịrị ikweta na Chineke ga-agwali ndị mmadụ uche ya ka ha dee ya?

Mmadụ nwere ike ịgwa odeakwụkwọ ya ka o dee akwụkwọ ozi. Ma, odeakwụkwọ ahụ ga-ede ihe ọ gwara ya dee. Ọ bụ otú ahụ ka Chineke gwara ndị dere Baịbụl ihe ha dere

5. Mbọ niile a gbara ka Baịbụl gharazie ịdị kụrụ afọ n’ala

Ọ bụrụ na Baịbụl si n’aka Chineke, o doro anya na Chineke agaghị ekwe ka ọ gharazie ịdị. Kemgbe ụwa, ụfọdụ ndị ọchịchị agbaala mbọ ka Baịbụl gharazie ịdị. Ndị isi okpukpe anwaakwala ka ndị mmadụ ghara inweta Baịbụl. Ma, ọtụtụ ndị agbaala mbọ ka Baịbụl dịgide n’agbanyeghị na e megidere ha, gwakwa ha na a ga-egbu ha. Unu chọọ ịmata gbasara otu onye n’ime ha, kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Ì kpebisikwuola ike ịna-agụ Baịbụl ugbu a ị matarala mbọ ndị mmadụ gbara ime ka ọ dịgide? Maka gịnị?

Gụọnụ Abụ Ọma 119:97. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee ihe mere ọtụtụ ndị ji gbaa mbọ sụgharịa Baịbụl, kesaakwara ya ndị ọzọ n’agbanyeghị na ha ma na o nwere ike ịta isi ha?

6. Akwụkwọ bụ́ maka mmadụ niile

O nwetụbeghị akwụkwọ ọzọ a sụgharịrịla ole a sụgharịrị Baịbụl. Ọ bụkwa ya bụ akwụkwọ ndị mmadụ kacha enweta. Gụọnụ Ọrụ Ndịozi 10:34, 35. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Gịnị mere Chineke ji chọọ ka a sụgharịa Okwu ya n’ọtụtụ asụsụ, chọọkwa ka ọtụtụ ndị nweta ya?

  • Olee ihe na-amasị gị gbasara Baịbụl?

Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ

mmadụ niile

nọ n’ụwa

ka Baịbụl dị n’asụsụ ha na-aghọta

Baịbụl dị n’ihe karịrị

asụsụ

3,000,

ụfọdụ zuru ezu, ụfọdụ ezughị ezu

Baịbụl niile e bipụtarala dị ihe dị ka

5,000,000,000,

e nweghịkwa akwụkwọ ọzọ hụrụla azụ ya anya

ỤFỌDỤ NA-ASỊ na ihe Baịbụl bụ bụ naanị akwụkwọ mgbe ochie ndị mmadụ dere.

  • Gịnị ka i chere?

  • Olee ihe ndị na-egosi na Baịbụl bụ Okwu Chineke?

NCHỊKỌTA

Baịbụl bụ Okwu Chineke. Chineke emeekwala ka ọ dịrị mmadụ niile mfe inweta ya.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • E kwuo na Chineke nyere ndị mmadụ mmụọ nsọ ka ha dee Baịbụl, gịnị ka ọ pụtara?

  • Gịnị masịrị gị gbasara otú Baịbụl si dịrị ruo taa, asụsụ ole ọ dị na ya, nakwa otú ọtụtụ ndị sirila nweta ya?

  • Ugbu a ị matarala mbọ niile Chineke gbara ka i nwee ike ịnụ ihe ọ na-agwa gị, olee otú obi dị gị?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Gụọ gbasara otú e si si n’akwụkwọ mpịakọta ndị e ji dee Baịbụl n’oge ochie sụgharịa Baịbụl ndị anyị nwere taa.

“Otú Baịbụl Si Rute Anyị Aka” (Teta!, Nọvemba 2007)

Chọpụta otú Baịbụl si dịgide n’agbanyeghị ihe atọ gaara eme ka ọ gharazie ịdị.

“Olee Otú Baịbụl Si Dịgide?” (Ụlọ Nche Nke 4 2016)

Chọpụta otú ụfọdụ ndị si gbaa mbọ sụgharịa Baịbụl n’agbanyeghị na ha ma na mbọ a nwere ike ịta isi ha.

Ha Ji Baịbụl Kpọrọ Ihe (14:26)

E depụtala Baịbụl ọtụtụ ugboro, sụgharịakwa ya ọtụtụ ugboro. Olee ihe ga-eme ka obi sie gị ike na o nweghị ihe Chineke chọrọ ka anyị mara dị na Baịbụl a gbanwere?

“À Gbanwere Ihe E Dere na Baịbụl Ma Ọ Bụ Kpaa Ya Aka?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)

a Mmụọ nsọ bụ ike Chineke ji arụ ọrụ. A ga-akọwakwu ya n’Isi nke 07.