Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 09

Ekpere Ga-enyere Gị Aka Ịbịaru Chineke Nso

Ekpere Ga-enyere Gị Aka Ịbịaru Chineke Nso

È nwetụla mgbe ọ dị gị ka a gwa gị ihe ị ga-eme? È nwere ajụjụ ndị dị gị ezigbo mkpa ị na-ajụ? Ị̀ chọrọ onye ga-akasi gị obi ma ọ bụ gbaa gị ume? Ị̀ ga-achọ ịbịarukwu Jehova nso? Ekpere nwere ike inyere gị aka n’ihe a niile. Ma, olee otú anyị kwesịrị isi na-ekpe ekpere? Chineke ọ̀ na-anụ ekpere niile? Olee ihe ị ga-eme ka i jide n’aka na Chineke ga-anụ ekpere gị? Ka anyị chọpụta.

1. Ònye ka anyị kwesịrị ịna-agwa okwu n’ekpere? Oleekwa ihe anyị nwere ike ikpe ekpere gbasara ya?

Jizọs kwuru na ọ bụ Nna anyị bi n’eluigwe ka anyị kwesịrị ịna-agwa okwu n’ekpere. Ọ bụ Jehova ka Jizọs gwara okwu mgbe ọ na-ekpe ekpere. Jizọs sịrị: “Kpeenụ ekpere otú a: ‘Nna anyị nke bi n’eluigwe . . . ’” (Matiu 6:9) Ọ bụrụ na anyị na-agwa Jehova okwu n’ekpere, anyị na ya na-abịa bụrụ ezigbo enyi.

Anyị nwere ike ikpe ekpere gbasara ihe ọ bụla. Ma, tupu Chineke aza ekpere anyị, anyị ga-ekperịrị ya otú dabara n’uche ya. “Ihe ọ bụla anyị rịọrọ [Chineke] nke dabara n’uche ya, ọ na-anụ olu anyi.” (1 Jọn 5:14) Jizọs kwuru ihe ụfọdụ dị mma anyị kwesịrị ịna-ekpe ekpere maka ha. (Gụọ Matiu 6:9-13.) Anyị kwesịrị ịna-ekpe ekpere ka Chineke gbooro anyị mkpa anyị. Ma, anyị ekwesịghị ichefu ịna-ekele ya maka ihe ndị o meere anyị, na-arịọkwa ya ka o nyere ndị ọzọ aka.

2. Olee otú anyị kwesịrị isi na-ekpe ekpere?

Baịbụl gwara anyị ka anyị ‘na-agwa Chineke ihe niile dị anyị n’obi.’ (Abụ Ọma 62:8) Ọ pụtara na anyị kwesịrị ịna-esi n’ala ala obi anyị ekpe ekpere. Anyị nwere ike ikpepụta ekpere anyị ekpepụta ma ọ bụkwanụ anyị ekpee ya n’obi anyị. Anyị nwekwara ike ịnọ otú ọ bụla gosiri na anyị na-akwanyere Chineke ùgwù kpee ya. Anyị nwere ike ikpe ekpere mgbe ọ bụla anyị chọrọ nakwa n’ebe ọ bụla anyị nọ.

3. Olee otú Chineke si aza ekpere anyị?

E nwere ọtụtụ ụzọ Jehova si aza ekpere anyị. O nyere anyị Okwu ya, bụ́ Baịbụl. N’ime ya, anyị na-ahụ azịza ajụjụ dị iche iche na-echu anyị ụra. Ịgụ Okwu Chineke “na-eme ka onye na-amaghị ihe mara ihe.” (Abụ Ọma 19:7; gụọ Jems 1:5.) Jehova na-eme ka obi ruo anyị ala ma nsogbu bịara anyị. Ọ na-emekwa ka ndị na-efe ya nyere anyị aka ma anyị nọrọ ná nsogbu.

MỤTAKWUO IHE

Chọpụta otú ị ga-esi si n’obi gị na-ekpe ekpere, Chineke anụ ya. Chọpụtakwa uru ekpere ga-abara gị.

4. Ihe ndị na-eme ka Chineke nụ ekpere anyị

Olee ihe ndị ga-eme ka Chineke nụ ekpere anyị ma ọ bụkwanụ ghara ịnụ ya? Kpọnyenụ VIDIO a.

Jehova chọrọ ka anyị na-agwa ya okwu n’ekpere. Gụọnụ Abụ Ọma 65:2. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Ì chere na “Onye na-anụ ekpere” chọrọ ka  na-ekpe ekpere? Gịnị mere i ji zaa ihe ị zara?

Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke nụ ekpere anyị, anyị ga-agbarịrị mbọ na-eme ihe o kwuru. Gụọnụ Maịka 3:4 na 1 Pita 3:12. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee ihe anyị ga-eme ka Jehova zaa ekpere anyị?

E nwee mba abụọ na-alụ agha, ha abụọ na-ekpecha ekpere ka ha merie. Ì chere na Chineke ga-aza ekpere mba abụọ ahụ?

5. Ekpere anyị kwesịrị isi anyị n’obi

A na-akụziri ụfọdụ ndị ekpere ndị ha ga-eburu n’isi ma na-ekpeghachi ha mgbe ọ bụla ha chọrọ ikpe ekpere. Ma, ọ̀ bụ otú ahụ ka Chineke chọrọ ka anyị si na-ekpe ekpere? Gụọnụ Matiu 6:7. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee otú ị ga-esi ghara ‘ịna-ekwughachi otu ihe ugboro ugboro’ mgbe ị na-ekpe ekpere?

N’ụbọchị ọ bụla, cheta otu ihe ọma meere gị ma kelee Jehova maka ya. Ọ bụrụ na ị na-eme ya kwa ụbọchị ruo otu izu, ọ pụtara na i kpeela ụzọ ihe asaa n’ekpere n’ekwughachighị otu ihe ugboro ugboro.

Obi na-adị ezigbo nna ụtọ ma nwa ya na-agwa ya ihe si ya n’obi. Jehova chọkwara ka anyị na-agwa ya ihe si anyị n’obi ma anyị kpewe ekpere

6. Ekpere bụ onyinye Chineke nyere anyị

Olee otú ekpere ga-esi enyere anyị aka, ma n’oge ihe dị mma ma n’oge ihe dị njọ? Kpọnyenụ VIDIO a.

Baịbụl kwuru na ekpere ga-enyere anyị aka ka obi ruo anyị ala. Gụọnụ Ndị Filipaị 4:6, 7. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Ọ bụ eziokwu na ọ bụghị mgbe niile ka ekpere na-eme ka nsogbu anyị bie, ma, olee otú o si enyere anyị aka?

  • Olee ihe ụfọdụ i nwere ike ikpe ekpere gbasara ha?

Ị̀ ma ihe a?

“Amen” pụtara “ka ọ dị otú ahụ,” ma ọ bụ “n’eziokwu.” Ma n’oge a na-ede Baịbụl ma taa, ndị mmadụ na-asị “amen” ma e kpechaa ekpere.—1 Ihe E Mere 16:36.

7. Na-ewepụta oge ekpe ekpere

Ọrụ nwere ike izu anyị ahụ́ mgbe ụfọdụ, anyị echefuo ikpe ekpere. Olee otú Jizọs si were ekpere? Gụọnụ Matiu 14:23 na Mak 1:35. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Olee otú Jizọs si wepụta oge maka ekpere?

  • Olee oge i nwere ike ikpe ekpere?

ỤFỌDỤ NA-ASỊ na Chineke anaghị aza ekpere ngwa ngwa.

  • Gịnị ka i chere?

NCHỊKỌTA

Anyị si n’obi anyị na-ekpe ekpere, ọ ga-eme ka Chineke nọrọ anyị nso, mee ka obi na-eru anyị ala, nyekwara anyị aka ịna-eme ihe dị Jehova mma.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Ònye ka anyị kwesịrị ịna-agwa okwu n’ekpere?

  • Olee otú anyị kwesịrị isi na-ekpe ekpere?

  • Olee ụfọdụ uru ekpere bara?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Chọpụta azịza nke ajụjụ dị iche iche ndị mmadụ na-ajụkarị gbasara ekpere.

“Ihe Asaa Ọ Dị Mkpa Ka Ị Mara Banyere Ekpere” (Ụlọ Nche, Ọktoba 1, 2010)

Chọpụta ihe ndị mere i ji kwesị ịna-ekpe ekpere nakwa otú ekpere gị ga-esi na-akakwu mma.

“Gịnị Mere M Kwesịrị Iji Na-ekpe Ekpere?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)

Chọpụta ihe Baịbụl kwuru gbasara onye anyị kwesịrị ịna-agwa okwu ma anyị kpewe ekpere.

“M̀ Kwesịrị Ikpegara Ndị Sent Ekpere?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)

Ka ị na-ele vidio egwú a, chọpụta ma ebe mmadụ nọ kpee ekpere na mgbe o ji kpee ya hà ga-eme ka Chineke ghara ịnụ ya.

Na-ekpe Ekpere n’Oge Ọ Bụla (1:22)