ISI NKE 12
Gịnị Ga-enyere Gị Aka Ka Ị Ghara Ịkwụsị Ịmụ Baịbụl?
Ịmụ Baịbụl bara uru. Ma, ọ naghị adịcha mfe mgbe niile. Mgbe ụfọdụ, i nwere ike ịna-eche ma ọ̀ ga-adịkwara gị mfe ịmụrụ Baịbụl na-aga. Gịnị mere o ji bụrụ na mbọ ọ bụla ị gbara ka ị ghara ịkwụsị ịmụ Baịbụl efughị ọhịa? Gịnị ga-enyere gị aka ka ị ghara ịkwụsị ịmụ ya n’agbanyeghị na ọ dịchaghị mfe?
1. Gịnị mere ịmụ Baịbụl ji baa uru?
Baịbụl sịrị na “okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike.” (Ndị Hibru 4:12) Baịbụl bara uru n’ihi na o kwuru ihe Chineke na-eche gbasara gị, kwuokwa na Chineke hụrụ gị n’anya. Baịbụl na-akụziri gị ọtụtụ ihe ma na-eme ka ndụ gị ka mma. Ọ na-emekwa ka i nwee olileanya. Nke ka nke bụ na ọ ga-enyere gị aka ka ị bụrụ enyi Jehova. Ọ bụrụ na ị na-amụ Baịbụl, ọ ga-eme ka ị na-enwekwu obi ụtọ ná ndụ.
2. Gịnị mere ịmara uru Baịbụl bara ji dị mkpa?
Eziokwu ndị dị na Baịbụl yiri akụ̀ bara ezigbo uru. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji gwa anyị, sị: “Zụta eziokwu, erekwala ya.” (Ilu 23:23) Ọ bụrụ na anyị ana-echeta mgbe niile na eziokwu dị na Baịbụl bara uru, anyị ga-agba mbọ na-amụ ihe mgbe niile, ọ bụrụgodị na e nwere ihe ndị na-eme ka o siere anyị ike.—Gụọ Ilu 2:4, 5.
3. Olee otú Jehova ga-esi nyere gị aka ka ị ghara ịkwụsị ịmụ Baịbụl?
Ebe ọ bụ na Jehova, onye kere ihe niile na onye pụrụ ime ihe niile, bụ enyi gị, ọ chọrọ inyere gị aka ka ị mụta gbasara ya. O nwere ike ime ka ‘i nwee mmasị ime ihe, nyekwa gị ike i ji eme ya.’ (Gụọ Ndị Filipaị 2:13.) N’ihi ya, mgbe ọ bụla ọ dị gị ka ị gaghị amụli ihe ma ọ bụ na ị gaghi emeli ihe ị mụtara, o nwere ike inyere gị aka. O nwere ike inyekwu gị ume ga-enyere gị aka ịna-amụ Baịbụl n’agbanyeghị mmegide ma ọ bụ ihe ọ bụla na-eme ka o siere gị ike ịmụ ya. Na-arịọ Jehova mgbe niile n’ekpere ka o nyere gị aka ka ị ghara ịkwụsị ịmụ Baịbụl.—1 Ndị Tesalonaịka 5:17.
MỤTAKWUO IHE
Chọpụta ihe ga-eme ka ị ghara ịkwụsị ịmụ Baịbụl a sịgodị na ị naghị enwe ohere ma ọ bụ na ndị ọzọ na-enye gị nsogbu ka ị kwụsị ịmụ ya. Chọpụta otú Jehova ga-esi nyere gị aka ka ị mụrụ ya na-aga.
4. Mee ka ọmụmụ ihe gị bụrụ ihe kacha gị mkpa
Mgbe ụfọdụ, mere nke a mere nke ọzọ nwere ike mee ka o yie ka anyị enweghịzi ohere anyị ga-eji na-amụ Baịbụl. Ma, gịnị nwere ike inyere anyị aka? Gụọnụ Ndị Filipaị 1:10. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
-
Olee ụfọdụ ihe ndị i chere “ka mkpa” ná ndụ?
-
Olee otú ị ga-esi gosi na Baịbụl ị na-amụ bụ ihe kacha gị mkpa?
-
Ọ bụrụ na ị wụnye ájá na bọket ma tinyewe okwute na ya, okwute ndị ahụ agaghị aba
-
Ma ọ bụrụ na i tinyechaa okwute ndị ahụ na bọket tupu wụnyewe ya ájá, ọ ga-afọ obere ka ájá ahụ niile banyechaa na ya. Otú ahụ ka ọ ga-adịkwa ma ọ bụrụ na ọ bụ “ihe ndị ka mkpa” ka ị na-ebu ụzọ eme ná ndụ gị. Ị ga-emecha ha, nweekwa ohere ị ga-eji eme ihe ndị ọzọ
Ịmụ Baịbụl ga-eme ka anyị mara Chineke ma na-efe ya, si otú ahụ gosi na anyị ma na ọ bụ ya kwesịrị ịna-eduzi anyị. Gụọnụ Matiu 5:3. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
-
Olee uru anyị ga-erite ma anyị mee ka ịmụ Baịbụl buru ihe kacha anyị mkpa?
5. Na-amụ Baịbụl ọ bụrụgodị na a na-emegide gị
Mgbe ụfọdụ, ndị ọzọ nwere ike ime ihe ga-eme ka ị kwụsị ịmụ Baịbụl. Chọpụta otú udị ihe ahụ si mee Francesco. Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
-
Na vidio a, gịnị ka ndị enyi Francesco na mama ya mere mgbe ọ gwara ha ihe ndị ọ na-amụta na Baịbụl?
-
Olee uru o ritere maka na ọ kwụsịghị ịmụ Baịbụl?
Gụọnụ 2 Timoti 2:24, 25. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
-
Olee otú obi dị ndị ezinụlọ unu na ndị enyi gị gbasara ihe ị na-amụ?
-
Olee ihe ebe a kwuru i kwesịrị ime ma e nwee onye obi na-adịghị mma maka na ị na-amụ Baịbụl? Maka gịnị?
6. Tụkwasị Jehova obi na ọ ga-enyere gị aka
Ka anyị na-abịarukwu Jehova nso, ime ihe dị ya mma ga na-agụkwu anyị agụụ. Ma, ọ ka nwere ike ịna-esitụrụ anyị ike ịhapụ ihe na-adịghị mma anyị na-eme ma mewe ihe dị ya mma. Mgbe ọ bụla o siiri gị ike otú ahụ, ike agwụla gị. Jehova ga-enyere gị aka. Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
-
Na vidio a, olee ihe ndị Jim kwụsịrị ime iji mee ihe dị Jehova mma?
-
Gịnị masịrị gị n’akụkọ ya?
Gụọnụ Ndị Hibru 11:6. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
-
Gịnị ka Jehova ga-emere ndị “na-achọsi ya ike,” ya bụ, ndị na-agbasi mbọ ike ka ha mata ya, na-emekwa ihe dị ya mma?
-
Gịnị ka ihe a na-akụziri gị gbasara otú obi na-adị Jehova ma ọ hụ mbọ ị na-agba ịmụ Baịbụl?
MMADỤ NWERE IKE ỊJỤ GỊ ihe mere i ji na-amụ Baịbụl.
-
Gịnị ka ị ga-aza onye ahụ?
NCHỊKỌTA
Ịmụ Baịbụl mgbe niile anaghị adịcha mfe, ma ịmụ ya nwere ike ime ka ị na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi. Jehova ga-akwụ gị ụgwọ ma ị tụkwasị ya obi mgbe niile.
Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ
-
Gịnị mere na i jighị eziokwu ndị dị na Baịbụl egwu egwu?
-
Ebe ọ bụ na ‘ị chọpụtala ihe ndị ka mkpa,’ gịnị ka i kwesịrị ime?
-
Gịnị mere i kwesịrị iji na-arịọ Jehova ka o nyere gị aka ka ị ghara ịkwụsị ịmụ Baịbụl?
IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA
Chọpụta ihe anọ nyeerela ọtụtụ ndị aka iji oge ha na-eme ihe bara uru.
“Otú Ị Ga-esi Jiri Oge Gị Na-eme Ihe Bara Uru” (Teta!, Febụwarị 2014)
Chọpụta otú Jehova si nyere otu nwaanyị aka mgbe di ya na-aghọtaghị ihe mere o ji kpebie ife Chineke.
Chọpụta uru otu nwoke ritere maka na nwunye ya tachiri obi.
Ndị mmadụ na-ekwu na Ndịàmà Jehova na-eme ka iro dịrị n’ezinụlọ. Ihe a ha na-ekwu ọ̀ bụ eziokwu?
“Ndịàmà Jehova Hà Na-etisa Ezinụlọ Ka Ha Na-eme Ka Ezinụlọ Dịrị n’Udo?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)