Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 16

Gịnị Ka Jizọs Mere Mgbe Ọ Nọ n’Ụwa?

Gịnị Ka Jizọs Mere Mgbe Ọ Nọ n’Ụwa?

Ọtụtụ ndị na-eche na Jizọs bụ nwa ọhụrụ, ma ọ bụ otu onye amụma ma ihe, ma ọ bụkwanụ otu nwoke a chọrọ igbu egbu. Ma, ọ bụrụ na anyị eleruo ndụ Jizọs biri n’ụwa anya, è nwere ihe anyị ga-amụta na ya? N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ụfọdụ n’ime ihe ndị kacha mkpa Jizọs mere mgbe ọ nọ n’ụwa na otú ihe ndị ahụ o mere ga-esi baara gị uru.

1. Olee ọrụ kacha mkpa Jizọs rụrụ?

Ọrụ kacha mkpa Jizọs rụrụ bụ ‘ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke.’ (Gụọ Luk 4:​43.) Ozi ọma o ziri ụmụ mmadụ bụ na Chineke ga-ehiwe alaeze ma ọ bụ ọchịchị nke ga-ewepụ nsogbu niile na-echi ndị mmadụ ọnụ n’ala. a Jizọs gbasiri mbọ ike kwusaara ndị mmadụ ozi ọma a nke mere ka ha nwee olileanya. O kwusara ya afọ atọ na ọkara.​—Matiu 9:​35.

2. Gịnị mere Jizọs ji rụọ ọrụ ebube ndị ọ rụrụ?

Baịbụl kwuru na ‘Chineke si n’aka Jizọs rụọ ọrụ ebube ma mee ihe ndị dị ịtụnanya.’ (Ọrụ Ndịozi 2:​22) Jizọs ji ike Chineke nyere ya mee ka oké ifufe kwụsị, nye ọtụtụ mmadụ ihe oriri, gwọ ndị ahụ́ na-adịghị, kpọlitekwa ndị nwụrụ anwụ. (Matiu 8:​23-​27; 14:​15-​21; Mak 6:​56; Luk 7:​11-​17) Ọrụ ebube ndị a ọ rụrụ mere ka o doo anya na ọ bụ Chineke zitere ya. Ha gosikwara na o nweghị nsogbu Jehova na-agaghị akwụsịli.

3. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’otú Jizọs si bie ndụ?

Jizọs rubeere Jehova isi n’agbanyeghị otú ihe si dịrị ya. (Gụọ Jọn 8:​29.) O mere otú a ná ndụ ya niile n’ụwa n’agbanyeghị na ọtụtụ ndị nọ na-emegide ya. Ihe a o mere gosiri na ndị mmadụ ga-efeli Chineke ọ bụrụgodị na ihe esiere ha ezigbo ike. Otú a ka Jizọs si ‘gosi anyị ihe anyị ga na-eme ka anyị na-esosi nzọụkwụ ya ike.’​—1 Pita 2:​21.

MỤTAKWUO IHE

Chọpụta otú Jizọs si kwusaa ozi ọma nakwa otú o si rụọ ọrụ ebube ndị ọ rụrụ.

4. Jizọs kwusara ozi ọma

Jizọs ji ụkwụ gaa ọtụtụ narị maịl n’okporo ụzọ ndị uzuzu juru ka o nwee ike zie ọtụtụ mmadụ ozi ọma. Gụọnụ Luk 8:1. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Ọ̀ bụ naanị ndị gakwuuru Jizọs ka o ziri ozi ọma?

  • Olee mbọ Jizọs gbara ka ọ gakwuru ndị ọ ga-ezi ozi ọma?

Chineke buru amụma na Mezaya ga-ezi ndị mmadụ ozi ọma. Gụọnụ Aịzaya 61:​1, 2. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Olee otú Jizọs si mezuo amụma a?

  • Ì chere na ndị mmadụ kwesịrị ịnụ ozi ọma a taa?

5. Jizọs kụziri ihe ndị bara ezigbo uru

E wezụga ozi ọma gbasara Alaeze Chineke Jizọs kwusaara ndị mmadụ, ọ kụzikwaara ha ihe ndị bara ezigbo uru. Legodị ụfọdụ n’ime ihe ndị o kwuru mgbe ọ nọ n’elu ugwu na-akụzi ihe. Gụọnụ Matiu 6:​14, 34 na 7:12. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Olee ihe ndị bara uru Jizọs kwuru n’amaokwu ndị a?

  • Ì chere na ihe ndị a o kwuru ka bara uru taa?

6. Jizọs rụrụ ọrụ ebube dị iche iche

Jehova nyere Jizọs ike o ji rụọ ọtụtụ ọrụ ebube. Unu chọọ ịhụ otu n’ime ọrụ ebube ndị ahụ, gụọnụ Mak 5:​25-​34 ma ọ bụkwanụ unu akpọnye VIDIO a. Unu mechaa, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Na vidio a anyị lere, gịnị ka obi siri nwaanyị ahụ ike na Jizọs ga-emere ya?

  • Olee ihe masịrị gị n’ọrụ ebube ahụ Jizọs rụrụ?

Gụọnụ Jọn 5:​36. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Gịnị ka ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ “na-agba àmà” ya ma ọ bụ gịnị ka ha na-egosi gbasara Jizọs?

Ị̀ ma ihe a?

Ọ bụ n’akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn ka anyị si mata ọtụtụ n’ime ihe ndị anyị ma gbasara Jizọs. Nke ọ bụla n’ime akwụkwọ anọ ndị a kwuru ụfọdụ ihe ibe ya na-ekwughị gbasara Jizọs. Anyị gụọ ihe niile a ha dere, otú Jizọs si bie ndụ na-abịa doo anyị anya.

  • MATIU

    bu ụzọ dee akwụkwọ nke ya. O dere ihe dị iche iche Jizọs kụziri, karịchaa ihe ndị ọ kụziri gbasara Alaeze Chineke.

  • MAK

    kacha dee ihe pere mpe. O dere akụkọ ndị dị ụtọ n’akwụkwọ ya. O dekwara ha ná nkenke.

  • LUK

    kwuru otú ekpere si dị Jizọs mkpa nakwa otú o si jiri obiọma mesoo ụmụ nwaanyị ihe.

  • JỌN

    kwuru ihe ga-enyere anyị aka ịmata ụdị onye Jizọs bụ. O dere ụka dị iche iche Jizọs na ndị ezigbo enyị ya nakwa ndị ọzọ kparịtara.

ỤFỌDỤ NA-ASỊ na Jizọs bụ naanị ezigbo mmadụ nakwa na ọ bụghị ya bụ Mezaya.

  • Gịnị ka i chere?

NCHỊKỌTA

Jizọs kwusara ozi ọma Alaeze Chineke, rụọ ọrụ ebube dị iche iche, rubekwara Jehova isi ma mgbe ihe dị mma ma mgbe ihe dị njọ.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Olee ọrụ kacha mkpa Jizọs rụrụ mgbe ọ nọ n’ụwa?

  • Gịnị ka ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ na-egosi?

  • Olee ihe ndị ọzọ bara uru Jizọs kụziri?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Chọpụta ihe mere obi ga-eji sie gị ike na Jizọs rụrụ ọrụ ebube ndị ahụ e kwuru na ọ rụrụ n’eziokwu.

“Ọrụ Ebube Jizọs​—Gịnị Ka Ị Pụrụ Ịmụta?” (Ụlọ Nche, Julaị 15, 2004)

Gụọ gbasara otú otu nwoke si gbanwee otú o si ebi ndụ mgbe ọ mụtara otú ihe banyere ndị ọzọ si echu Jizọs ụra.

“Ihe M Na-eche Mgbe Niile Bụ Gbasara Onwe M” (Ụlọ Nche, Ọktoba 1, 2014)

a Anyị ga-amụtakwu ihe ndị ọzọ gbasara Alaeze Chineke n’isi nke 31-​33.