Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 20

Otú E Si Hazie Ọgbakọ Ndị Kraịst

Otú E Si Hazie Ọgbakọ Ndị Kraịst

Jehova bụ Chineke na-eme ihe n’usoro. (1 Ndị Kọrịnt 14:​33, 40) N’ihi ya, anyị ga-atụ anya na a ga-ahazi ndị na-efe ya ahazi. Olee otú e si hazie ọgbakọ Ndị Kraịst? Olee otú anyị ga-esi nye aka mee ka ọ nọgide na-aga n’usoro?

1. Ònye bụ onyeisi ọgbakọ Ndị Kraịst?

‘Kraịst bụ onyeisi ọgbakọ ya.’ (Ndị Efesọs 5:​23) Ọ nọ n’eluigwe na-ahazi ihe ndị ohu Jehova na-eme n’ụwa niile. Ọ bụ Jizọs họpụtara “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche,” ya bụ, Ndị Kraịst ole na ole ferela Jehova ọtụtụ afọ. A na-akpọkwa ha Òtù Na-achị Isi. (Gụọ Matiu 24:​45-​47.) Ọ bụ Òtù Na-achị Isi na-agwa ọgbakọ Ndị Kraịst n’ụwa niile ihe ha na-eme, otú ahụ ndịozi na ndị okenye nọ na Jeruselem na-agwa Ndị Kraịst oge mbụ ihe ha na-eme. (Ọrụ Ndịozi 15:2) Ma, Òtù Na-achị Isi abụghị ndị isi anyị. Ha na-amụ Baịbụl ka ha mara ihe Jehova chọrọ ka ha mee. Ha na-erubekwara Jizọs bụ́ onyeisi anyị isi.

2. Gịnị bụ ọrụ ndị okenye?

Ndị okenye bụ ụmụ nwoke ndị ferela Jehova ọtụtụ afọ, ndị na-eji Baịbụl akụziri ndị ohu Jehova ihe, na-enyere ha aka, na-agbakwa ha ume. A naghị akwụ ha ụgwọ maka ihe ndị a ha na-arụ. Kama, ha na-eji ‘obi ha niile arụ ha otú ga-amasị Chineke. Ha anaghị arụ ha ka ha rigbuo mmadụ, kama ha na-anụ ọkụ n’obi.’ (1 Pita 5:​1, 2) E nwekwara ndị a na-akpọ ndị ohu na-eje ozi. Ọrụ ha bụ inyere ndị okenye aka na-arụ ọrụ ụfọdụ n’ọgbakọ. Ka oge na-aga, ọ bụrụ na ndị ohu na-eje ozi ana-akpa àgwà ndị okenye kwesịrị ịna-akpa, a na-ahọpụta ha ka ha bụrụ ndị okenye.

Òtù Na-achị Isi na-ahọpụta ụfọdụ ndị okenye ka ha bụrụ ndị nlekọta sekit. Ha na-eleta ọgbakọ dị iche iche iji mara otú ihe si na-aga na ha nakwa iji gbaa ha ume. Ha na-eji ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru ahọpụta ndị okenye nakwa ndị ohu na-eje ozi.​—1 Timoti 3:​1-​10, 12; Taịtọs 1:​5-9.

3. Olee ihe Onyeàmà Jehova ọ bụla kwesịrị ịna-eme?

Mmadụ niile nọ n’ọgbakọ ‘na-eto aha Jehova.’ Otú ha si eto ya bụ ịga ọmụmụ ihe, iso na-eme ihe ndị a na-eme ma a gaa ọmụmụ ihe nakwa ịna-ekwusa ozi ọma otú ike kwere ha.​—Gụọ Abụ Ọma 148:​12, 13.

MỤTAKWUO IHE

Chọpụta ụdị onyeisi Jizọs bụ, otú ndị okenye si eme ka ya nakwa otú anyị ga-esi na-erubere ma ndị okenye ma Jizọs isi.

4. Jizọs bụ onyeisi dị nwayọọ n’obi

E nwere otu ihe ga-abara anyị uru Jizọs gwara anyị mee. Gụọnụ Matiu 11:​28-​30. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Olee ụdị onyeisi Jizọs bụ? Oleekwa uru ọ chọrọ ka anyị rite maka na ọ bụ onyeisi anyị?

Olee otú ndị okenye si eme ka Jizọs? Kpọnyenụ VIDIO a.

Otú Baịbụl kwuru ndị okenye ga-esi na-arụ ọrụ ha doro nnọọ anya.

Gụọnụ Aịzaya 32:2 na 1 Pita 5:​1-3. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Olee otú obi dị gị ugbu a ị matarala na ndị okenye na-agbalị ime ka ndị ọzọ nweta ume otú ahụ Jizọs mere?

  • Olee ụfọdụ ụzọ ndị ọzọ ndị okenye si eme ka Jizọs?

5. Ndị okenye na-eme ihe ha na-akụzi

Olee otú Jizọs chọrọ ka ndị okenye si were ọrụ ha? Kpọnyenụ VIDIO a.

Jizọs kụziiri ndị okenye otú ha ga-esi na-arụ ọrụ ha. Gụọnụ Matiu 23:​8-​12. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Gịnị masịrị gị ma a bịa n’ihe dị iche n’otú Baịbụl kwuru ndị okenye kwesịrị isi na-arụ ọrụ ha na otú ị na-ahụ ndị isi chọọchị dị iche iche si arụ ọrụ ha?

  1. A. Ndị okenye na-agba mbọ ka ha na Jehova dịrị ná mma. Ha na-enyekwara ndị ezinụlọ ha aka ime otú ahụ

  2. B. Ihe gbasara ndị niile nọ n’ọgbakọ na-emetụ ndị okenye n’obi

  3. CH. Ndị okenye na-ekwusa ozi ọma mgbe niile

  4. D. Ndị okenye bụ ndị nkụzi. Ha na-eso edewe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha, na-esokwa arụ ọrụ ndị ọzọ

6. Anyị kwesịrị ịna-erubere ndị okenye isi

Baịbụl gwara anyị ezigbo ihe mere anyị ga-eji na-erubere ndị okenye isi. Gụọnụ Ndị Hibru 13:17. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Ọ̀ dị mma na Baịbụl gwara anyị ka anyị na-erubere ndị na-eduzi anyị isi, na-edokwa onwe anyị n’okpuru ha? Gịnị mere i ji zaa ihe ị zara?

Gụọnụ Luk 16:10. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-erubere ndị okenye isi, ọ bụrụgodị n’ihe anyị chere na ọ bụ obere ihe?

ỤFỌDỤ NA-ASỊ na ọ bụghị iwu na mmadụ ga-enwe chọọchị ọ na-aga.

  • Olee uru i chere na mmadụ ga-erite ma ọ bụrụ na onye ahụ esoro ọgbakọ Chineke na-efe ya ofufe?

NCHỊKỌTA

Jizọs bụ onyeisi ọgbakọ Ndị Kraịst. Obi na-adị anyị ụtọ irubere ndị okenye nọ n’okpuru ya isi n’ihi na ha na-azụ anyị, na-akụziri anyị ihe, na-emekwa ihe ha na-akụziri anyị.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Ònye bụ onyeisi ọgbakọ Ndị Kraịst?

  • Olee otú ndị okenye si enyere ndị nọ n’ọgbakọ aka?

  • Gịnị ka onye ọ bụla na-efe Jehova kwesịrị ịna-eme?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Chọpụta ihe na-egosi na ihe gbasara ọgbakọ dị iche iche na-echu Òtù Na-achị Isi na ndị okenye ndị ọzọ ụra.

Otú E Si Na-agba Ụmụnna Anyị Ume Mgbe A Machibidoro Ọrụ Anyị Iwu (4:22)

Chọpụta ọrụ ndị nlekọta sekit na-arụ.

Otú Nleta Onye Nlekọta Sekit Na-adị n’Ime Obodo (4:51)