Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 25

Gịnị Ka Chineke Bu n’Obi Kee Anyị?

Gịnị Ka Chineke Bu n’Obi Kee Anyị?

Baịbụl kwuru na ụmụ mmadụ ‘anaghị ebite ndụ aka nakwa na nsogbu na-ezu ha ahụ́.’ (Job 14:1) Ma, ọ̀ bụ otú a ka Chineke chọrọ ka ndụ anyị dịrị? Ọ bụrụ na ọ bụghị, oleekwanụ otú o bu n’obi ka ndụ anyị dịrị? È nwere mgbe ihe ga-emecha dịrị anyị otú o bu n’obi? Chọpụta otú na-akasi obi Baịbụl si zaa ajụjụ ndị a.

1. Olee otú Chineke chọrọ ka ihe dịrị anyị ná ndụ?

Jehova chọrọ ka ihe dịrị anyị nnọọ mma. Mgbe o kere mmadụ abụọ mbụ, bụ́ Adam na Iv, o mere ka ha biri ebe mara mma a na-akpọ paradaịs, ma ọ bụ ogige Iden. Baịbụl kwuru, sị: “Chineke gọziri ha. Chineke sịkwara ha: ‘Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, junụ n’ụwa, na-elekọtakwanụ ya.’” (Jenesis 1:​28) Jehova chọrọ ka ha mụọ ụmụ, mee ka ụwa niile bụrụ paradaịs, na-elekọtakwa ụmụ anụmanụ. Ihe o bu n’obi mgbe ahụ bụ na mmadụ niile ga-ezu okè, ahụ́ agbasie ha ike, ha adịrịkwa ndụ ruo mgbe ebighị ebi.

Ọ bụ eziokwu na ihe niile agaghị otú Chineke si chọọ, a ma ihe o bu n’obi agbanwebeghị. (Aịzaya 46:​10, 11) Ọ ka chọrọ ka ndị na-erubere ya isi dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi mgbe ọ ga-eme ka ihe niile dị mma.​—Gụọ Mkpughe 21:​3, 4.

2. Olee ihe anyị ga-eme ka ndụ anyị nwee isi?

Jehova kere anyị otú anyị ga-ama ‘na ọ bụ ya kwesịrị ịna-eduzi anyị,’ ya bụ, o kere anyị ka ịmụ gbasara ya na ife ya na-agụ anyị agụụ. (Gụọ Matiu 5:​3-6.) Ọ chọrọ ka anyị na ya dịrị n’ezigbo mma, ‘ka anyị na-eme uche ya n’ihe niile, ka anyị hụ ya n’anya, ka anyị jirikwa obi anyị niile’ na-efe ya. (Diuterọnọmi 10:12; Abụ Ọma 25:14) Anyị mee ihe ndị a, obi ga na-atọ anyị ezigbo ụtọ n’agbanyeghị nsogbu ndị anyị nwere. Ọ bụrụ na anyị ana-efe Jehova, ndụ anyị ga-enwe isi n’ihi na anyị ma na anyị na-eme ihe dị ya mma.

MỤTAKWUO IHE

Chọpụta otú Jehova si gosi na ọ hụrụ anyị n’anya mgbe ọ na-eke ụwa maka anyị. Chọpụtakwa ihe Okwu ya na-akụziri anyị gbasara ihe mere o ji kee anyị.

3. Otú Jehova chọrọ ka ihe dịrị ụmụ mmadụ magburu nnọọ onwe ya

Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Gịnị mere Chineke ji kee ụwa anyị a mara ezigbo mma?

Gụọnụ Ekliziastis 3:​11. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Gịnị ka ihe amaokwu a kwuru na-akụziri gị gbasara Jehova?

4. Ihe Jehova bu n’obi agbanwebeghị

Gụọnụ Abụ Ọma 37:​11, 29 na Aịzaya 55:11. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee otú anyị si mara na otú Jehova bu n’obi ka ndụ dịrị anyị agbanwebeghị?

5. Ife Jehova na-eme ka ndụ anyị nwee isi

Anyị na-enwe obi ụtọ ma anyị mara ihe mere Chineke ji kee anyị. Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee uru ịmụta ihe mere Chineke ji kee anyị baara Terumi?

Gụọnụ Ekliziastis 12:13. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Ebe ọ bụ na Jehova emeerela anyị ọtụtụ ihe ọma, olee otú anyị ga-esi gosi ya na obi dị anyị ụtọ?

MMADỤ NWERE IKE ỊJỤ GỊ ihe mere Chineke ji kee anyị.

  • Gịnị ka ị ga-aza onye ahụ?

NCHỊKỌTA

Jehova chọrọ ka anyị dị ndụ ebighị ebi n’ụwa ebe a mgbe ọ ga-eme ka ihe niile dị mma. Ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile na-efe ya, ndụ anyị ga-enwe isi, ma taa ma echi.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Olee otú Jehova chọrọ ka ndụ dịrị Adam na Iv mgbe o kere ha?

  • Olee otú anyị si mara na otú Chineke chọrọ ka ihe dịrị ụmụ mmadụ agbanwebeghị?

  • Gịnị ka ị ga-eme ka ndụ gị nwee isi?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Chọpụta ihe na-egosi na e nwere ebe bụbu ogige Iden n’eziokwu.

“Ogige Iden Ọ̀ Dịrị Adị Ka Ọ̀ Bụ Akụkọ Ifo?” (Ụlọ Nche, Jenụwarị 1, 2011)

Chọpụta ihe mere obi ga-eji sie anyị ike na ụwa ga-adị ruo mgbe ebighị ebi.

“À Ga-ebibi Ụwa?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)

Chebara ihe Baịbụl kwuru mere Chineke ji kee gị echiche.

“Oleedị Ihe Chineke Bu n’Obi Kee Anyị?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)

Chọpụta otú otu nwoke chere na ụwa zuuru ya si chọpụta otu ihe kọrọ ya.

Ndụ M Enweela Isi Ugbu A (3:55)

a N’isiokwu na-eso nke a, ị ga-amata ihe mere na ihe niile agaghịzi otú o si chọọ.