Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 27

Olee Otú Ọnwụ Jizọs Ga-esi Zọpụta Anyị?

Olee Otú Ọnwụ Jizọs Ga-esi Zọpụta Anyị?

Anyị na-emehie, na-ata ahụhụ, na-anwụkwa anwụ maka na di na nwunye mbụ, bụ́ Adam na Iv, nupụụrụ Chineke isi. a Ma, anyị nwere olileanya. Jehova haziri otú ọ ga-esi si n’aka Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst napụta anyị n’aka mmehie na ọnwụ. Baịbụl kwuru na Jizọs nwụrụ iji gbapụta anyị. Ihe mgbapụta bụ ụgwọ a kwụrụ iji gbapụta mmadụ. Ụgwọ Jizọs kwụrụ ka a gbapụta anyị bụ ndụ ya zuru okè o ji chụọ àjà. (Gụọ Matiu 20:28.) Jizọs ruru eru ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa. Ma, o ji obi ya niile kweta ka e gbuo ya. Ihe a o mere ga-eme ka anyị nwee ike inweta ihe niile Adam na Iv tụfuru. Jizọs gosikwara anyị na otú ya na Jehova si hụ anyị n’anya enweghị atụ. Isiokwu a ga-eme ka i jiri ọnwụ Jizọs nwụrụ kpọrọkwuo ihe.

1. Olee otú ọnwụ Jizọs si abara anyị uru ugbu a?

Anyị na-eme ọtụtụ ihe na-adịghị Jehova mma maka na anyị bụ ndị mmehie. Ma, ọ bụrụ na mmehie anyị mere ewute anyị, anyị esi n’aka Jizọs rịọ Jehova mgbaghara, gbaakwa mbọ ka anyị ghara ime mmehie ahụ ọzọ, anyị na Chineke ga-adị n’ezigbo mma. (1 Jọn 2:1) Baịbụl kwuru, sị: “Kraịst, bụ́ onye ezi omume, nwụrụ naanị otu ugboro n’ihi ndị mmehie ka o duga unu ebe Chineke nọ.”​—1 Pita 3:​18.

2. Olee otú ọnwụ Jizọs ga-esi baara anyị uru n’ọdịnihu?

Jehova zitere Jizọs Kraịst ka o jiri ndụ ya zuru okè chụọ àjà “ka a ghara ibibi onye ọ bụla nwere okwukwe na [Jizọs], kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:​16) N’ihi ihe a Jizọs mere, ọ gaghị adị anya Jehova emezie ihe niile isi Adam nupụrụ mebiri. Ọ pụtara na ọ bụrụ na anyị enwee okwukwe n’àjà Jizọs chụrụ, anyị ga-enwe ike inwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi n’ụwa mgbe ọ ga-abụ paradaịs.​—Aịzaya 65:​21-​23.

MỤTAKWUO IHE

Chọpụtakwuo ihe mere Jizọs ji jiri ndụ ya chụọ àjà nakwa otú àjà ahụ ga-esi baara gị uru.

3. Ọnwụ Jizọs napụtara anyị n’aka mmehie na ọnwụ

Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee ihe Adam tụfuru mgbe o nupụụrụ Chineke isi?

Gụọnụ Ndị Rom 5:​12. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee ihe mmehie Adam kpataara gị?

Gụọnụ Jọn 3:​16. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Gịnị mere Jehova ji zite Ọkpara ya n’ụwa?

  1. Adam bụ mmadụ zuru okè. N’ihi mmehie o mere, ụmụ mmadụ na-emehie, na-anwụkwa anwụ

  2. Jizọs bụ mmadụ zuru okè. N’ihi otú o si rubere Chineke isi, ụmụ mmadụ ga-ezu okè, dịkwa ndụ ruo mgbe ebighị ebi

4. Ọnwụ Jizọs nwere ike ịbara mmadụ niile uru

Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee otú ọnwụ otu onye ga-esi baara mmadụ niile uru?

Gụọnụ 1 Timoti 2:​5, 6. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Adam bụ mmadụ zuru okè, ma n’ihi mmehie o mere, mmadụ niile na-emehie, na-anwụkwa anwụ. Jizọs bụkwa mmadụ zuru okè. Olee otú o si “nye ihe dabara adaba a ga-eji agbapụta mmadụ niile”?

5. Àjà Jizọs chụrụ bụ onyinye Jehova nyere gị

Ndị enyi Jehova na-ewere àjà ahụ Jizọs chụrụ ka onyinye Jehova nyere ha. Dị ka ihe atụ, gụọnụ Ndị Galeshia 2:​20. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee otú Pọl onyeozi si gosi na o weere àjà ahụ Jizọs chụrụ ka onyinye Chineke nyere ya?

Mgbe Adam mehiechara, a mara ya na ụmụ ọ ga-amụta ikpe ọnwụ. Ma Jehova zitere Ọkpara ya ka ọ bịa nwụọ, nke mere na i nwere ike ịdị ndụ ebighị ebi.

Ka ị na-agụ amaokwu ndị a, chegodị otú ọ ga-abụ na obi dị Jehova mgbe Ọkpara ya nọ na-ata ahụhụ. Gụọnụ Jọn 19:​1-7, 16-​18. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee otú obi dị gị maka ihe Jehova na Jizọs meere gị?

MMADỤ NWERE IKE ỊJỤ GỊ ma otu onye ọ̀ ga-anwụli maka mmadụ niile.

  • Gịnị ka ị ga-aza onye ahụ?

NCHỊKỌTA

Ọnwụ Jizọs mere ka Jehova na-agbaghara anyị mmehie anyị, meekwa ka o kwe omume na anyị ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Gịnị mere Jizọs ji nwụọ?

  • Olee otú o si bụrụ na ndụ Jizọs nke zuru okè bụ ihe mgbapụta dabara adaba?

  • Olee otú ọnwụ Jizọs nwere ike isi baara gị uru?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Chọpụta ihe mere e ji kpọọ àjà Jizọs ji ndụ ya zuru okè chụọ ihe mgbapụta.

“Olee Otú Àjà Jizọs Chụrụ Si Bụrụ ‘Ihe Mgbapụta n’Ọnọdụ Ọtụtụ Mmadụ’?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)

Chọpụta ihe anyị ga-eme ka a zọpụta anyị.

“Olee Otú Jizọs Si Azọpụta Anyị?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)

Jehova ò nwere ike ịgbaghara onye mere mmehie jọrọ ezigbo njọ?

“Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara” (Ụlọ Nche, Mee 1, 2013)

Chọpụta otú ịmụta na Jizọs ji ndụ ya chụọ àjà si nyere otu nwoke aka ịgbanwe otú o si ebi ndụ.

“Anaghịzi M Agbara Tigbuo Zọgbuo Ohu” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)

a Mmehie abụghị naanị mgbe mmadụ mere ihe ọjọọ. Otú ime ihe ọjọọ si agụ anyị agụụ maka na anyị bụ ụmụ Adam na Iv bụkwa mmehie.