Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 30

Ndị Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ Ga-adị Ndụ Ọzọ

Ndị Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ Ga-adị Ndụ Ọzọ

Ọnwụ na-akpata iru uju na obi mgbawa. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji sị na ọnwụ bụ onye iro. (1 Ndị Kọrịnt 15:26) N’isi nke 27, ị mụtara na Jehova ga-eme ka ọnwụ gharazie ịdị. Ma, gịnịzi ga-eme ndị nwụrụla anwụ? N’isiokwu a, ị ga-amụtakwu gbasara ọmarịcha nkwa ọzọ Jehova kwere anyị. Nkwa ahụ bụ na ọ ga-akpọlite ọtụtụ ijeri mmadụ ndị nwụrụ anwụ ka ha dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ọ ga-eme ka ha dịrị ndụ ọzọ. Ihe a ọ̀ ga-ekwe omume? Ọ̀ ga-akpọlite ha ka ha biri n’eluigwe ka ọ̀ bụ n’ụwa?

1. Gịnị ka Jehova chọrọ imere ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ?

Ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ na-agụ Jehova agụụ. Obi siri otu nwoke nwere okwukwe aha ya bụ Job ike na Chineke agaghị echefu ya ma ọ nwụọ. Ọ gwara Chineke, sị: “Ị ga-akpọ òkù, m ga-azakwa gị,” ya bụ, ọ ga-anọ n’ili zaa.​—Gụọ Job 14:​13-​15.

2. Olee otú anyị si mara na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ?

Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, Chineke nyere ya ike ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ. Jizọs kpọlitere otu nwatakịrị nwaanyị dị afọ iri na abụọ, kpọlitekwa nwa otu nwaanyị isi mkpe. (Mak 5:​41, 42; Luk 7:​12-​15) Ka oge na-aga, Lazarọs enyi Jizọs nwụrụ. N’agbanyeghị na Lazarọs anwụọla, e liekwa ya kemgbe abalị anọ, Jizọs kpọlitere ya. Mgbe Jizọs kpechara ekpere, o kwuru, sị: “Lazarọs, pụta!” Mgbe o kwuchara ihe a “nwoke ahụ nwụrụ anwụ wee pụta.” Lazarọs adịla ndụ ọzọ. (Jọn 11:​43, 44) Chegodị ụdị obi ụtọ ndị enyi Lazarọs na ndị ezinụlọ ha nwere mgbe ihe a mere.

3. Olee ihe anyị na-atụ anya n’ọdịnihu a ga-emere ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ?

Baịbụl kwuru, sị: “Chineke ga-akpọlite ndị . . . nwụrụ anwụ.” (Ọrụ Ndịozi 24:15) E nweghị onye n’ime ndị Jizọs kpọlitere n’ọnwụ mgbe ọ nọ n’ụwa, nke gara eluigwe. (Jọn 3:​13) Obi dị ha niile ụtọ mgbe a kpọlitere ha ka ha dịrịkwa ndụ n’ụwa. N’oge na-adịghị anya, Jizọs ga-akpọlitekwa ijeri kwuru ijeri ndị nwụrụ anwụ ka ha dịrị ndụ ebighị ebi n’ụwa mgbe ọ ga-abụ paradaịs. Jizọs sịrị na a ga-akpọlite “ndị niile nọ n’ili ncheta,” ya bụ na Chineke ga-akpọlite ndị niile o kwesịrị icheta, ma ndị o yiri ka è chefuola.​—Jọn 5:​28, 29.

MỤTAKWUO IHE

Chọpụta ihe dị na Baịbụl mere obi ga-eji sie gị ike na Jizọs nwere ike ọ ga-eji akpọlite ndị nwụrụ anwụ nakwa na ọ ga-akpọlite ha. Chọpụtakwa otú mbilite n’ọnwụ ga-esi kasie gị obi, meekwa ka i nwee olileanya.

4. Jizọs gosiri na ọ ga-akpọliteli ndị nwụrụ anwụ

Chọpụtakwuo gbasara ihe Jizọs meere Lazarọs enyi ya. Gụọnụ Jọn 11:​14, 38-​44. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Olee otú anyị si mara na Lazarọs nwụrụ n’eziokwu? ​—Leruonụ anya n’amaokwu nke 39.

  • A sị na Lazarọs gara eluigwe mgbe ahụ ọ nwụrụ, ì chere na ọ gaara abụ ihe ọma ka Jizọs meere ya kpọlite ya ka ọ bịakwa dịrị ndụ n’ụwa?

Kpọnyenụ VIDIO a.

5. A ga-akpọlite ọtụtụ ndị n’ọnwụ

Gụọnụ Abụ Ọma 37:29. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee ebe ijeri kwuru ijeri ndị mmadụ a ga-akpọlite n’ọnwụ ga-ebi?

Ọ bụghị naanị ndị na-efe Chineke ka Jizọs ga-akpọlite n’ọnwụ, ọ ga-akpọlitekwa ọtụtụ ndị na-anaghị efe Jehova. Gụọnụ Ọrụ Ndịozi 24:15. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee onye ị ga-achọ ịhụ ma a kpọlite ya n’ọnwụ?

Chegodị gbasara ihe a: Otú ahụ ọ na-enweghị ihe ọ bụụrụ nna ịkpọte nwa ya n’ụra ka ọ na-​enweghị ihe ọ bụụrụ Jizọs ịkpọlite mmadụ n’ọnwụ

6. Mbilite n’ọnwụ nwere ike ịkasi gị obi, meekwa ka i nwee olileanya

Ihe Baịbụl kọrọ gbasara otú Jizọs si kpọlite nwa Jaịrọs akasiela ọtụtụ ndị na-eru uju obi, nyekwara ha aka idi ọnwụ onye ha nwụrụ anwụ. Gụọnụ gbasara ya na Luk 8:​40-​42, 49-​56.

Tupu Jizọs akpọlite nwa Jaịrọs ahụ, ọ gwara Jaịrọs, sị: “Atụla egwu, naanị nwee okwukwe.” (Ọ dị n’amaokwu nke 50.) I nwee olileanya na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ, olee otú o nwere ike isi nyere gị aka . . .

  • ma onye ị hụrụ n’anya nwụọ?

  • ma ihe nwere ike igbu mmadụ mee gị?

Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee otú olileanya mbilite n’ọnwụ si akasi nne na nna Phelicity obi, na-emekwa ka obi sie ha ike?

ỤFỌDỤ NA-ASỊ na ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ agaghị ekwe omume.

  • Gịnị ka i chere?

  • Olee amaokwu Baịbụl ị ga-agụrụ mmadụ iji gosi ya na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ?

NCHỊKỌTA

Baịbụl kwuru na a ga-akpọlite ijeri kwuru ijeri ndị mmadụ nwụrụ anwụ. Ịkpọlite ha n’ọnwụ na-agụ Jehova agụụ, o nyekwalanụ Jizọs ike ịkpọlite ha.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Olee otú anyị si mara na ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ na-agụ Jehova na Jizọs agụụ?

  • Ọ̀ bụ n’eluigwe ka ọ̀ bụ n’ụwa ka ijeri kwuru ijeri ndị mmadụ a ga-akpọlite n’ọnwụ ga-ebi? Gịnị mere i ji zaa ihe ị zara?

  • Gịnị mere obi ji sie gị ike na ndị ị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ga-adị ndụ ọzọ?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Chọpụta ụfọdụ ihe nwere ike inyere gị aka n’oge ị na-eru uju.

“Ihe Ga-enyere Ndị Na-eru Uju Aka” (Teta! Nke 3 2018)

Ihe ndị Baịbụl kwuru hà ga-enyeliri onye na-eru uju aka n’eziokwu?

Ihe Ga-enyere Gị Aka Idi Ọnwụ Onye Ị Hụrụ n’Anya (5:06)

Olee ihe nwere ike ịkasi ụmụaka obi ma onye ha hụrụ n’anya nwụọ?

Àjà Mgbapụta Jizọs (2:07)

È nwere ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ha agaa eluigwe? Olee ndị a na-agaghị akpọlite n’ọnwụ?

“Gịnị Bụ Mbilite n’Ọnwụ?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)