Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 32

Alaeze Chineke Na-achị Achị Ugbu A

Alaeze Chineke Na-achị Achị Ugbu A

Alaeze Chineke malitere ịchị n’eluigwe n’afọ 1914. Ọ bụkwa mgbe ahụ ka oge ọgwụgwụ nke ọchịchị ụmụ mmadụ malitere. Olee otú anyị si mara? Anyị ga-eleba anya n’amụma ndị dị na Baịbụl gbasara oge ọgwụgwụ, lebakwa anya n’ihe na-emegasị n’ụwa nakwa n’otú ụmụ mmadụ si akpa àgwà kemgbe afọ 1914.

1. Gịnị ka amụma dị na Baịbụl na-egosi?

Akwụkwọ Daniel na-egosi na Alaeze Chineke ga-amalite ịchị n’ọgwụgwụ nke oge Baịbụl kpọrọ “oge asaa.” (Daniel 4:​16, 17) Ka ọtụtụ narị afọ gachara, Jizọs kpọrọ otu oge ahụ “oge ndị mba ọzọ,” kwuokwa na ọ gwụbeghị. (Luk 21:24) Dị ka anyị ga-ahụ, oge asaa ahụ gwụrụ n’afọ 1914.

2. Olee ihe ndị na-emegasị n’ụwa kemgbe afọ 1914? Oleekwa otú ndị mmadụ si akpa àgwà kemgbe ahụ?

Ndị na-eso ụzọ Jizọs jụrụ ya, sị: ‘Gịnị ga-abụ ihe àmà nke ọnụnọ gị na nke ọgwụgwụ oge a?’ (Matiu 24:3) Mgbe Jizọs na-aza ha ajụjụ a, o kwuru ọtụtụ ihe ga na-eme ma ya malitechaa ịchị n’Alaeze Chineke n’eluigwe. Ụfọdụ n’ime ha bụ agha, ụkọ nri, na ala ọma jijiji. (Gụọ Matiu 24:7.) Baịbụl kwukwara na otú ndị mmadụ ga-esi na-akpa àgwà ‘n’oge ikpeazụ’ ga-eme ka ibi ndụ ‘taa akpụ.’ (2 Timoti 3:1-5) Ihe ndị ahụ a ga-eji mara oge ikpeazụ na-eme aghara aghara kemgbe afọ 1914. Ndị mmadụ na-akpakwa àgwà ndị ahụ Baịbụl kwuru a ga-eji mara mgbe ikpeazụ kemgbe afọ 1914 karịa mgbe ọ bụla ọzọ.

3. Olee ihe mere ihe ji ka njọ kemgbe Alaeze Chineke malitere ịchị?

Obere oge Jizọs ghọchara Eze Alaeze Chineke, ọ lụsoro Setan na ndị mmụọ ọjọọ agha n’eluigwe. O meriri Setan n’agha ahụ. Baịbụl kwuru na “a chụdatara [Setan] na ndị mmụọ ozi ya” n’ụwa. (Mkpughe 12:9, 10, 12) Ezigbo iwe na-ewe Setan n’ihi na ọ ma na a ga-ebibi ya. Ọ bụ ya mere o ji mee ka ihe isi ike na ahụhụ jupụta ụwa. Ihe a ga-enyere anyị aka ịma ihe mere ụwa ji bụrụ chi bọọ, a nụ ọzọ. Ma, Alaeze Chineke ga-akwụsị nsogbu a niile.

MỤTAKWUO IHE

Chọpụta otú anyị si mara na Alaeze Chineke malitere ịchị n’afọ 1914. Chọpụtakwa otú anyị ga-esi gosi na anyị kwetara na Alaeze ahụ na-achị achị ugbu a.

4. Oge e ji amụma ndị dị na Baịbụl gụkọọ na-egosi na Alaeze Chineke malitere ịchị n’afọ 1914

Chineke mere ka Nebukadneza, eze Babịlọn, rọọ nrọ, ya egosi ya ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. Nrọ ahụ na otú Daniel si kọwaa ya gosiri na ọ gbasara ma ọchịchị Nebukadneza ma Alaeze Chineke.​—Gụọnụ Daniel 4:​17. a

Gụọnụ Daniel 4:​20-​26. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

Otú Nrọ ahụ Si Gbasa Alaeze Chineke

Ọchịchị

(A) Nnukwu osisi

A kwụsịrị ọchịchị

(B) “Gbutuonụ osisi ahụ” ka “oge asaa” gafee

E weghachiri ọchịchị

(CH) “Ị ga-emecha chịwakwa n’alaeze gị”

Mgbe amụma a mezuru nke mbụ ya . . .

MMEZU NKE MBỤ

Ọchịchị

(D) Nebukadneza, Eze Babịlọn

A kwụsịrị ọchịchị

(E) Mgbe afọ 606 T.O.N.K. gachara, isi gbakara Nebukadneza. O nweghịkwa ike ịchị ruo mgbe afọ asaa zuru ezu gafere

E weghachiri ọchịchị

(F) Isi bịara dị Nebukadneza mma, ya amalitekwa ịchị ọzọ

Mgbe amụma a mezuru nke abụọ ya . . .

  • (G) Ònye ka osisi ahụ nọchiri anya ya?​—Gụọnụ 1 Ihe E Mere 29:23.

  • (H) Olee mgbe a kwụsịrị ọchịchị ha? Olee otú anyị si mara na ha anaghị achị mgbe Jizọs nọ n’ụwa?​—Gụọnụ Luk 21:24.

  • (I) Olee mgbe a maliteghachiri ọchịchị a? Oleekwa ebe a maliteghachiri ya?

MMEZU NKE ABỤỌ

Ọchịchị

(G) Ndị eze Izrel, ndị na-anọchi anya ọchịchị Chineke

A kwụsịrị ọchịchị

(H) Mbibi e bibiri Jeruselem mere ka a kwụsị ọchịchị ndị Izrel ruo puku afọ abụọ na narị ise na iri abụọ

E weghachiri ọchịchị

(I) Jizọs malitere ịchị n’Alaeze Chineke n’eluigwe

Oge asaa ahụ ọ̀ bụ afọ ole?

Amaokwu ụfọdụ dị na Baịbụl na-enyere anyị aka ịghọta amaokwu ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ Mkpughe kwuru na oge atọ na ọkara bụ otu puku ụbọchị na narị ụbọchị abụọ na iri isii. (Mkpughe 12:6, 14) E were abụọ mụbaa ụbọchị ole ahụ, ya abụrụ puku ụbọchị abụọ na narị ise na iri abụọ. Mgbe ụfọdụ na Baịbụl, otu ụbọchị na-anọchi anya otu afọ. (Ezikiel 4:6) Ọ bụ otú a ka a ga-esi ghọta oge asaa ahụ dị n’akwụkwọ Daniel. N’ihi ya, oge asaa ahụ na-anọchi anya puku afọ abụọ na narị ise na iri abụọ.

5. Ụwa agbanweela kemgbe afọ 1914

Jizọs buru amụma otú ụwa ga-adị ma ya ghọchaa Eze. Gụọnụ Luk 21:9-11. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee nke ị na-ahụ ma ọ bụ nke ị na-anụ gbasara ya n’ime ihe a niile anyị gụpụtara na Baịbụl?

Pọl onyeozi kwuru otú ndị mmadụ ga-esi na-akpa àgwà n’oge ọgwụgwụ nke ọchịchị ụmụ mmadụ. Gụọnụ 2 Timoti 3:1-5. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee àgwà nke ị na-ahụ ndị mmadụ na-akpa n’ime àgwà ndị a?

6. Gosi na i kwetara na Alaeze Chineke na-achị achị ugbu a

Gụọnụ Matiu 24:3, 14. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Olee ọrụ dị mkpa a na-arụ n’ụwa nke na-egosi na Alaeze Chineke na-achị achị ugbu a?

  • Olee otú ị ga-esi soro na-arụ ọrụ a?

Alaeze Chineke na-achị achị ugbu a n’eluigwe, ọ fọkwara obere ka ọ malite ịchị ụwa. Gụọnụ Ndị Hibru 10:​24, 25. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Gịnị ka onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ime ka anyị “na-ahụ ụbọchị ahụ ka ọ na-eru nso”?

Ị mata ihe nwere ike inyere ndị ọzọ aka ma ọ bụ zọọ ha ndụ, gịnị ka ị ga-eme?

MMADỤ NWERE IKE ỊJỤ GỊ ihe mere Ndịàmà Jehova ji akpụkarị afọ 1914 n’ọnụ.

  • Gịnị ka ị ga-aza onye jụrụ gị ụdị ihe a?

NCHỊKỌTA

Amụma ndị dị na Baịbụl, oge e ji amụma ndị ahụ gụkọọ, na ihe ndị na-eme n’ụwa na-egosi na Alaeze Chineke na-achị achị ugbu a. Otú anyị si egosi na anyị kwetara ihe a bụ ịna-agwa ndị ọzọ gbasara ya nakwa ịna-aga ọmụmụ ihe.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Gịnị mere mgbe oge asaa ahụ akwụkwọ Daniel kwuru gbasara ya gwụrụ?

  • Gịnị mere i ji kweta na Alaeze Chineke malitere ịchị n’afọ 1914?

  • Olee otú ị ga-esi gosi na i kwetara na Alaeze Chineke na-achị achị ugbu a?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Chọpụta ihe ndị na-akọ akụkọ ihe mere eme na ndị ọzọ kwuru gbasara otú ihe si agbanwe n’ụwa kemgbe afọ 1914.

“Mgbe Omume Ọma Bidoro Lawa n’Ike n’Ike” (Teta!, Eprel 2007)

a Gụọ isiokwu  Ụlọ Nche abụọ dị ná ngwụcha isiokwu a, n’ebe a kpọrọ Ihe Ị Ga-elebakwu Anya.