Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 33

Ihe Alaeze Chineke Ga-emere Anyị

Ihe Alaeze Chineke Ga-emere Anyị

Alaeze Chineke na-achị achị ugbu a. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-eme ka ọtụtụ ihe gbanwee n’ụwa. Ka anyị leba anya n’ụfọdụ n’ime ihe ọma ndị Alaeze Chineke ga-emere gị.

1. Olee otú Alaeze Chineke ga-esi mee ka udo dịrị n’ụwa, a na-ekpekwa ikpe ziri ezi na ya?

Jizọs bụ́ Eze Alaeze Chineke, ga-ebibi ndị na-eme ihe ọjọọ, bibiekwa ọchịchị ụmụ mmadụ n’agha Amagedọn. (Mkpughe 16:​14, 16) N’oge ahụ, nkwa a dị na Baịbụl ga-emezuru n’isi. Baịbụl sịrị: “N’oge na-adịghị anya, ndị ajọ omume agaghịzi anọ.” (Abụ Ọma 37:10) Jizọs ga-eji Alaeze ahụ mee ka udo dịrị ebe niile n’ụwa, a na-ekpekwa ikpe ziri ezi.​—Gụọ Aịzaya 11:4.

2. Olee otú ndụ ga-adị mgbe uche Chineke ga-eme n’ụwa?

Alaeze Chineke chịwa ụwa “ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa na ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 37:29) Chegodị otú ụwa ga-adị mgbe ndị niile bi na ya bụ ndị ezi omume hụrụ ma Jehova ma mmadụ ibe ha n’anya. O nweghị onye ga-arịa ọrịa. Ha niile ga-adịkwa ndụ ruo mgbe ebighị ebi.

3. Olee ihe Alaeze Chineke ga-emere anyị ma e bibicha ndị na-eme ihe ọjọọ?

E bibicha ndị na-eme ihe ọjọọ, Jizọs ga-achị otu puku afọ. N’oge ahụ, ya na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ndị ga-eso ya achị ga-eme ka ndị mmadụ zuo okè, gharakwa ịna-eme mmehie. Ná ngwụcha otu puku afọ ahụ, ụwa niile ga-abụ paradaịs mara ezigbo mma. Ndị niile bi na ya ga-enwe obi ụtọ n’ihi na ha na-erubere Jehova isi. Jizọs ga-enyeghachizi Nna ya, bụ́ Jehova, ọchịchị ka ọ chịrị gawa. N’oge ahụ, ‘a ga-edo aha Chineke nsọ’ otú a na-edotụbeghị ya na mbụ. (Matiu 6:​9, 10) Ọ ga-edo ewu na ọkụkọ anya mgbe ahụ na Jehova bụ ezigbo onye ọchịchị, onye ihe gbasara ndị ọ na-achị na-emetụ n’obi. Jehova ga-ebibizi Setan, ndị mmụọ ọjọọ, na onye ọ bụla ọzọ na-enupụrụ ya isi. (Mkpughe 20:​7-​10) Ihe ọma ndị Alaeze Chineke ga-emere anyị ga-adịru mgbe ebighị ebi.

MỤTAKWUO IHE

Chọpụta ihe mere obi kwesịrị iji sie anyị ike na Chineke ga-eji Alaeze ya mezuo ihe niile o kwuru na Baịbụl na ọ ga-emere anyị n’ọdịnihu.

4. Alaeze Chineke ga-ebibi ọchịchị ụmụ mmadụ

Baịbụl kwuru na “mmadụ nọ na-achị mmadụ ibe ya ọchịchị nchịgbu.” (Ekliziastis 8:9) Jehova ga-eji Alaeze ya mee ka ọchịchị nchịgbu a kwụsị.

Gụọnụ Daniel 2:​44 na 2 Ndị Tesalonaịka 1:​6-8. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Gịnị ka Jehova na Ọkpara ya, bụ́ Jizọs, ga-eme ndị ọchịchị na ndị niile na-akwado ha?

  • Olee otú ihe ị mụtarala gbasara Jehova na Jizọs si eme ka obi sie gị ike na ha agaghị emegbu onye ọ bụla?

5. O nweghị eze dị ka Jizọs

Jizọs, bụ́ Eze Alaeze Chineke, ga-emere ndị ọ ga na-achị n’ụwa ọtụtụ ihe ọma. Kpọnyenụ VIDIO a ka unu hụ otú Jizọs sirila gosi na inyere ndị mmadụ aka na-agụ ya agụụ nakwa na Chineke nyere ya ikike inyere ha aka.

Ihe ndị Jizọs mere mgbe ọ nọ n’ụwa gosiri anyị ihe ndị Alaeze Chineke ga-emere anyị. N’ihe ndị e depụtara ebe a Jizọs ga-emere anyị, olee ndị ị kacha atụ anya ịhụ mgbe ha ga-eme? Gụọnụ amaokwu Baịbụl ya na nkwa nke ọ bụla so ka unu mụtakwuo gbasara nkwa ahụ.

MGBE JIZỌS NỌ N’ỤWA, . . .

JIZỌS GA-ESI N’ELUIGWE . . .

  • kpọlite ndị nwụrụ anwụ, meekwa ka ọnwụ gharazie ịdị.​—Mkpughe 21:​3, 4.

6. Ihe Alaeze Chineke ga-emere anyị n’ọdịnihu magburu onwe ya

Alaeze Chineke ga-eme ka ọmarịcha ihe niile Jehova bu n’obi imere ụmụ mmadụ ruo ha aka. Ha ga-ebi n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi mgbe ọ ga-abụ paradaịs. Kpọnyenụ VIDIO a ka unu hụ ihe ndị Jehova si n’aka Ọkpara ya na-eme iji mezuo ihe o bu n’obi.

Gụọnụ Abụ Ọma 145:16. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee otú obi dị gị ịmara na Jehova ga-eji “ihe na-agụ ihe ọ bụla dị ndụ nyejuo ya afọ”?

ỤFỌDỤ NA-ASỊ na ọ bụrụ na anyị niile agbakọọ aka na anyị ga-akwụsịli nsogbu ndị dị n’ụwa.

  • Olee nsogbu ndị Alaeze Chineke ga-akwụsị, ndị ọchịchị ụmụ mmadụ na-agaghị akwụsịli?

NCHỊKỌTA

Alaeze Chineke ga-eme ihe Chineke chọrọ ka o mee. Ọ ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs, ndị ga-ebikwa na ya bụ ndị ga na-efe Jehova ruo mgbe ebighị ebi.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Olee otú Alaeze Chineke ga-esi doo aha Chineke nsọ?

  • Olee ihe mere anyị ga-eji kwere na nkwa ndị dị na Baịbụl ga-emezu n’Alaeze Chineke?

  • N’ime ihe niile Alaeze Chineke ga-emere anyị, olee nke ị kacha atụ anya ya?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Chọpụta ihe ndị ga-eme mgbe Jizọs ga na-achị otu puku afọ nakwa ihe ndị ga-eme mgbe ọ chịchara.

“Gịnị Ga-eme n’Ụbọchị Ikpe?” (Ụlọ Nche, Septemba 1, 2012)

Chọpụta otú ezinụlọ nwere ike isi nọkọọ tụgharịa uche n’ihe ọma ndị Alaeze Chineke ga-emere ha n’ọdịnihu.

Hụ Onwe Gị na Paradaịs (1:50)

Gụọ isiokwu bụ́ “Ọtụtụ Ihe Nọ Na-enye M Nsogbu n’Obi” ka ị hụ otú otu onye na-enupụburu ọchịchị isi si chọta ihe ọ na-achọ.

“Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ” (Ụlọ Nche, Jenụwarị 1, 2012)