Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 35

Otú Anyị Ga-esi Na-ekpebi Ime Ihe Dị Mma

Otú Anyị Ga-esi Na-ekpebi Ime Ihe Dị Mma

Anyị niile nwere ihe dị iche iche anyị kwesịrị ikpebi. Ọtụtụ n’ime mkpebi ndị a nwere ike ịbara anyị uru ma ọ bụ ghọọ anyị ahịa. Ha nwekwara ike ime ka anyị na Jehova dịrị ná mma ma ọ bụkwanụ gharazie ịdị ná mma. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ikpebi ebe anyị ga-ebi, ihe anyị ga-eji na-akpa afọ anyị, ma ànyị ga-alụ di ma ọ bụ ma ànyị ga-alụ nwaanyị. Ikpebi ihe dị mma nwere ike ime ka anyị na-enwe obi ụtọ ma na-eme ihe Jehova chọrọ.

1. Olee otú Baịbụl nwere ike isi nyere gị aka ịna-ekpebi ihe dị mma ị ga-eme?

Tupu gị ekpebie ihe ị ga-eme, rịọ Jehova ka o nyere gị aka. Mụọkwa Baịbụl ka ị mata otú o si ele ihe ị chọrọ ikpebi anya. (Gụọ Ilu 2:3-6.) Mgbe ụfọdụ, Jehova na-enye iwu kwuru hoo haa ihe a ga-eme. Ọ dị otú a, ihe kacha mma ị ga-eme bụ ime ihe ahụ o kwuru.

Ma, gịni ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na e nweghị iwu doro anya dị na Baịbụl kwuru ihe ị ga-eme? Jehova ka ga-enyere gị aka ịma ‘ụzọ i kwesịrị iso.’ (Aịzaya 48:17) Olee otú ọ ga-esi enyere gị aka? Ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru nwere ike inyere gị aka. Ihe ndị a Baịbụl kwuru bụ eziokwu ndị na-enyere anyị aka ịmata otú Chineke si ele ihe anya na otú o si eche echiche. Ọtụtụ mgbe, anyị na-amata otú Chineke si ele otu ihe anya ma anyị gụọ ebe ụfọdụ na Baịbụl. Ọ bụrụ na anyị achọpụta otú Jehova si ele ihe anya, ọ ga-enyere anyị aka ikpebi ihe ga-adị ya mma.

2. Olee ihe ndị i kwesịrị ichebara echiche tupu i kpebie ihe ị ga-eme?

Baịbụl sịrị na “onye ma ihe na-echebara ihe ọ bụla ọ chọrọ ime echiche.” (Ilu 14:15) Ihe a pụtara na tupu anyị ekpebie ihe ọ bụla, anyị kwesịrị ịnọdụ ala chebara ya echiche. Ka ị na-echebara ya echiche, jụọ onwe gị, sị: ‘Olee ihe Baịbụl kwuru ga-enyere m aka ịma ihe m ga-eme? Olee ihe m ga-ekpebi ga-eme ka obi ruo m ala? Olee otú ihe a m chọrọ ikpebi ga-esi gbasa ndị ọzọ? Nke ka nke, ihe a m chọrọ ikpebi, ọ̀ ga-eme Jehova obi ụtọ?’​—Diuterọnọmi 32:29.

Jehova nwere ikike ịgwa anyị ihe bụ́ ihe ọma na ihe bụ́ ihe ọjọọ. Ọ bụrụ na anyị amara iwu Chineke na ihe ndị o kwuru na Baịbụl, kpebiekwa ịna-eme ha, anyị si otú ahụ azụ akọnuche anyị. Akọnuche bụ ihe Chineke kenyere anyị n’ahụ́ nke na-agwa anyị ihe dị mma na ihe na-adịghị mma. (Ndị Rom 2:​14, 15) Anyị ga na-ekpebi ihe dị mma ma ọ bụrụ na anyị azụọ akọnuche anyị nke ọma.

MỤTAKWUO IHE

Chọpụtakwuo otú ihe dị iche iche Baịbụl kwuru nakwa akọnuche anyị si enyere anyị aka ma e nwee ihe anyị chọrọ ikpebi.

3. Kwere ka Baịbụl nyere gị aka mgbe ị chọrọ ikpebi ihe

Olee otú ihe dị iche iche Baịbụl kwuru nwere ike isi nyere anyị aka ikpebi ihe? Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Gịnị ka Jehova hapụrụ anyị ka anyị na-emere onwe anyị?

  • Gịnị mere Jehova ji hapụ anyị ka anyị na-ekpebiri onwe anyị ihe anyị ga-eme?

  • Olee ihe o nyere anyị ga-enyere anyị aka ịna-ekpebi ihe ga-akacha baara anyị uru?

Unu chọọ ịhụ otu n’ime ihe ndị Baịbụl kwuru nwere ike ịbara anyị uru, gụọnụ Ndị Efesọs 5:15, 16. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’otú unu ga-esi ‘jiri oge unu na-eme ihe kacha mkpa’ n’ihe gbasara . . .

  • ịna-agụchi Baịbụl anya.

  • ịbụ ezigbo di ma ọ bụ ezigbo nwunye, ịbụ ezigbo nne ma ọ bụ ezigbo nna, nakwa ịbụ ezigbo nwa.

  • ịna-aga ọmụmụ ihe.

4. Zụọ akọnuche gị ka o nyere gị aka ịna-ekpebi ime ihe dị mma

O nwere ike ịdịrị anyị mfe ịma ihe anyị ga-eme n’ihe ndị Baịbụl nyere iwu a kapịrị ọnụ gbasara ha. Ma, gịnị ka anyị ga-eme ma a bịa n’ihe ndị Baịbụl na-enyeghị iwu ọ bụla gbasara ha? Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee ihe ndị nwanna nwaanyị anyị lere na vidio a mere iji zụọ akọnuche ya na iji kpebie ihe ga-eme Jehova obi ụtọ?

Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịgwa ndị ọzọ ka ha kpebiere anyị ihe anyị kwesịrị ikpebi? Gụọnụ Ndị Hibru 5:14. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Ọ bụ eziokwu na ịhapụ ndị ọzọ ka ha kpebiere anyị ihe nwere ike yie ihe dị mfe ime, gịnị ka anyị kwesịrị ịmata n’onwe anyị?

  • Olee ihe ndị anyị nwere, ndị ga-enyere anyị aka ịna-azụ akọnuche anyị ka anyị nwee ike ịna-ekpebi ime ihe dị mma?

Akọnuche anyị na-enyere anyị aka ikpebi ihe dị mma otú ahụ map na-enyere mmadụ aka ikpebi ụzọ ọ ga-esi

5. Hapụ ndị ọzọ ka ha mee ihe akọnuche ha gwara ha

Ihe otu onye kpebiri ime nwere ike ịdị iche n’ihe onye ọzọ kpebiri ime. Olee otú anyị ga-esi hapụ ndị ọzọ ka ha mee ihe akọnuche ha gwara ha? Chegodị gbasara ihe atụ abụọ a:

Ihe atụ nke mbụ: Otu nwanna nwaanyị itecha ntecha na-amasị gafere ọgbakọ ọzọ ma chọpụta na itecha ntecha na-ewe ọtụtụ ụmụnna nwaanyị nọ na ya iwe.

Gụọnụ Ndị Rom 15:1 na 1 Ndị Kọrịnt 10:23, 24. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Gịnị ka nwanna nwaanyị ahụ nwere ike ikpebi ime n’ihi ihe amaokwu ndị a kwuru? Olee otú ị ga-esi eme ihe amaokwu ndị a kwuru ma ọ bụrụ na akọnuche onye gị na ya nọ anabataghị ya ime ihe ndị akọnuche gị nabatara gị ime?

Ihe atụ nke abụọ: Otu nwanna kpebiri na ya agaghị na-aṅụ mmanya na-aba n’anya n’agbanyeghị na ọ ma na Baịbụl ekwughị na ịṅụru ya n’ókè bụ ihe ọjọọ. Ma mgbe ọ gara otu oriri, ọ hụrụ ụmụnna ndị ọzọ ka ha na-aṅụ mmanya na-aba n’anya.

Gụọnụ Ekliziastis 7:16 na Ndị Rom 14:1, 10. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee otú ị ga-esi eme ihe amaokwu ndị a kwuru ma ọ bụrụ na ị hụ ka ndị ọzọ na-eme ihe akọnuche gị na-anabataghị?

 Olee ihe ndị ga-enyere anyị aka ịna-ekpebi ihe dị mma?

1.Rịọ Jehova ka o nyere gị aka ikpebi ihe ị ga-eme.​—Jems 1:5.

2.Mee nchọnchọ na Baịbụl nakwa n’akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl ka ị mata ihe Baịbụl kwuru gbasara ihe ahụ ị chọrọ ikpebi. I nwekwara ike ịjụ Ndị Kraịst ma nke a na-akọ ihe ha chere.

3.Chee gbasara ihe ihe ahụ ị chọrọ ikpebi nwere ike ime akọnuche gị nakwa akọnuche ndị ọzọ.

ỤFỌDỤ NA-ASỊ na i kwesịrị ime ihe ọ bụla ị chọrọ ime n’ihi na o nweghị onye ihe ị na-eme gbasara.

  • Gịnị mere anyị kwesịrị iji chee gbasara otú ihe anyị chọrọ ime ga-adị Chineke na ndị ọzọ?

NCHỊKỌTA

Ihe ga-eme ka anyị kpebie ihe dị mma bụ ibu ụzọ chọpụta otú Jehova ga-esi ele ihe ahụ anya, cheekwa ma ihe ahụ ọ̀ ga-abara ndị ọzọ uru ka ọ̀ ga-emebiri ha ihe.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Olee ihe ga-enyere anyị aka ịna-ekpebi ihe ndị na-amasị Jehova?

  • Olee otú ị ga-esi zụọ akọnuche gị?

  • Olee otú ị ga-esi gosi na ị na-ahapụ ndị ọzọ ka ha mee ihe akọnuche ha gwara ha?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Gịnị ka anyị ga-eme ka ihe ndị anyị na-ekpebi ime mee ka anyị na Chineke dịrịkwuo ná mma?

Mee Mkpebi Ndị Na-ewetara Chineke Otuto” (Ụlọ Nche, Eprel 15, 2011)

Chọpụtakwuo otú Jehova si akụziri anyị ihe.

Jehova Na-eduzi Ndị Ya (9:50)

Chọpụta ihe ndị nyeere otu nwoke aka ikpebi otu ihe siiri ya ike ikpebi.

Ihe Ọma Niile Jehova Na-enye Anyị Bụ Ihe E Ji n’Aka (5:46)

Chọpụtakwuo otú anyị nwere ike isi mee ihe dị Jehova mma mgbe ọ na-enyeghị iwu a kapịrị ọnụ gbasara otu okwu.

“Iwu Bible Ọ̀ Dị Gị Mkpa n’Ihe Nile?” (Ụlọ Nche, Disemba 1, 2003)