Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 38

Gosi na Obi Dị Gị Ụtọ Maka Ndụ Chineke Nyere Gị

Gosi na Obi Dị Gị Ụtọ Maka Ndụ Chineke Nyere Gị

E nwere ọtụtụ ihe nwere ike ime anyị obi ụtọ maka na anyị dị ndụ. Ọ bụrụgodị na anyị nọ ná nsogbu, a ka nwere ihe ụfọdụ ga na-eme anyị obi ụtọ. Olee otú anyị ga-esi gosi Jehova na obi dị anyị ụtọ maka ndụ o nyere anyị? Oleekwa ihe kachanụ mere anyị ga-eji gosi ya na obi dị anyị ụtọ maka ndụ o nyere anyị?

1. Olee ihe mere obi kwesịrị iji dị anyị ụtọ maka ndụ anyị dị?

Obi kwesịrị ịdị anyị ụtọ na anyị dị ndụ n’ihi na ndụ bụ onyinye Nna anyị hụrụ anyị n’anya, bụ́ Jehova, nyere anyị. Ọ bụ ya “na-enye ndụ,” ya bụ, ọ bụ ya kere ihe niile dị ndụ. (Abụ Ọma 36:9) “Ọ bụ yanwa na-enye mmadụ niile ndụ na ume na ihe niile.” (Ọrụ Ndịozi 17:25, 28) Jehova na-enye anyị ihe niile anyị kwesịrị inwe iji dịrị ndụ. Ọ na-emekwa ka ndụ na-atọ anyị ụtọ.​—Gụọ Ọrụ Ndịozi 14:17.

2. Olee otú anyị ga-esi gosi Jehova na obi dị anyị ụtọ maka ndụ o nyere anyị?

Jehova malitere ilekọta gị ozugbo a tụụrụ ime gị. Mmụọ nsọ mere ka Devid, bụ́ otu n’ime ndị fere Chineke, gwa ya, sị: “Ị hụdịrị m mgbe m na-akabeghị aka n’afọ nne m.” (Abụ Ọma 139:16) Jehova ji ndụ gị kpọrọ ezigbo ihe. (Gụọ Matiu 10:29-31.) Ezigbo iwe na-ewe ya ma e nwee onye kpachaara anya gbuo mmadụ, ma ọ bụdị gbuo onwe ya. a (Ọpụpụ 20:13) Ọ na-ewutekwa Jehova ma anyị na-eme ihe nwere ike ịta isi anyị ma ọ bụ na-eme ihe n’akpachapụghị anya nke nwere ike ime ka ndị ọzọ nwụọ. Ọ bụrụ na anyị akpachara anya ka ihe ọ bụla ghara ime anyị, jirikwa ndụ ndị ọzọ kpọrọ ihe, anyị na-egosi na obi dị anyị ụtọ maka ndụ Chineke nyere anyị.

MỤTAKWUO IHE

Chọpụta ụzọ ndị ọzọ i nwere ike isi gosi na obi dị gị ụtọ maka ndụ Chineke nyere anyị.

3. Na-elekọta onwe gị

Ndị Kraịst nyefere Jehova onwe ha na-eji ndụ ha niile ejere ya ozi. Ọ dị ka à ga-asị na ha ji ahụ́ ha chụọrọ Chineke àjà. Gụọnụ Ndị Rom 12:1, 2. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Gịnị mere i kwesịrị iji na-elekọta onwe gị?

  • Olee ụfọdụ n’ime ụzọ i nwere ike isi na-elekọta onwe gị?

4. Na-akpachapụ anya n’ihe ndị ị na-eme ka onye ọ bụla ghara imerụ ahụ́ ma ọ bụ nwụọ

Baịbụl gwara anyị ka anyị ghara ime ihe ọ bụla nwere ike imerụ mmadụ ahụ́ ma ọ bụ taa isi mmadụ. Kpọnyenụ VIDIO a ka unu hụ ihe ụfọdụ unu nwere ike ime ka onye ọ bụla ghara imerụ ahụ́ ma ọ bụ nwụọ.

Gụọnụ Ilu 22:3. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ihe unu na ndị ọzọ ga-eme ka unu ghara imerụ ahụ́ . . .

  • n’ụlọ unu.

  • n’ebe unu na-arụ ọrụ.

  • mgbe unu na-emega ahụ́.

  • mgbe unu na-anya ụgbọala ma ọ bụ mgbe onye ọzọ bu unu.

5. Jiri ndụ nwa e bu n’afọ kpọrọ ihe

Devid kwuru na Jehova ejighị ihe niile na-eme mmadụ mgbe a ka bu ya n’afọ egwu egwu. Gụọnụ Abụ Ọma 139:13-17. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • N’anya Jehova, ọ̀ bụ mgbe a tụụrụ ime mmadụ ka ọ̀ bụ mgbe a mụrụ ya ka ọ na-amalite ịdị ndụ?

Jehova nyere ndị Izrel iwu ndị nyere aka mee ka ihe ọ bụla ghara ime nwaanyị dị ime na nwa o bu n’afọ. Gụọnụ Ọpụpụ 21:22, 23. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Olee otú Jehova si ele mmadụ anya ma ihe o mere n’amaghị ama mee ka nwa e bu n’afọ nwụọ?

  • Olee otú obi ga-adị ya ma mmadụ kpachara anya gbuo nwa e bu n’afọ? b

  • Olee otú obi dị gị maka otú a Chineke si ele onye gburu nwa e bu n’afọ anya?

Kpọnyenụ VIDIO a.

Nwaanyị ji ndụ kpọrọ ihe nwedịrị ike iche na e nweghị ihe ọzọ ọ ga-eme ma ọ́ bụghị ite ime. Gụọnụ Aịzaya 41:10. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Ọ bụrụ na otú ihe si dịrị nwaanyị emee ka ọ dị ka e nweghị ihe ọzọ ọ ga-eme ma ọ́ bụghị ite ime, onye ka o kwesịrị ịgakwuru ka o nyere ya aka? Maka gịnị?

ỤFỌDỤ NA-ASỊ na ọ bụ nwaanyị ga-ekwu ma ọ̀ ga-ete ime ma ọ̀ bụ na ọ gaghị ete n’ihi na ọ bụ yanwa dị ime ahụ.

  • Gịnị mere i ji kwetasie ike na Jehova ejighị ndụ nwaanyị dị ime na nke nwa o bu n’afọ egwu egwu?

NCHỊKỌTA

Baịbụl gwara anyị ka ndụ na-atọ anyị ụtọ, ka anyị jiri ya kpọrọ ihe, nakwa ka anyị na-akpachara anya ka ihe ọ bụla ghara ime ndụ Jehova nyere anyị, ya bụ, ma ndụ nke anyị ma nke ndị ọzọ.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Gịnị mere Jehova ji jiri ndụ ụmụ mmadụ kpọrọ ihe?

  • Olee otú obi na-adị Jehova ma mmadụ kpachara anya gbuo mmadụ?

  • Gịnị mere obi ji atọ gị ụtọ maka ndụ Chineke nyere anyị?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Olee otú anyị nwere ike isi kelee Jehova maka ndụ o nyere anyị?

Abụ nke 141​—Ndụ Bụ Ọrụ Ebube (2:41)

Chọpụta ma Chineke ò nwere ike ịgbaghara onye terela ime.

“Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Ite Ime?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)

Chọpụta otú otú Chineke si ele ndụ anya kwesịrị isi gbasa ihe ndị anyị ji eme onwe anyị obi ụtọ.

“‘Egwuregwu Ndị Dị Ize Ndụ’ Ì Kwesịrị Ime Ha?” (Teta!, Ọktoba 8, 2000)

Chọpụta otú Baịbụl nwere ike isi nyere onye na-eche echiche igbu onwe ya aka.

“Baịbụl Ò Nwere Ike Inyere M Aka ma Echiche Igbu Onwe M Batawa M n’Obi?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)

a Jehova ejighị ndị obi gbawara egwu egwu. (Abụ Ọma 34:18) Ọ na-aghọta otú obi dị ndị obi mgbawa mere ka ha chọọ igbu onwe ha. Ọ na-achọkwa inyere ha aka. Ị chọọ ịhụ otú o nwere ike isi nyere onye chọrọ igbu onwe ya aka, gụọ isiokwu bụ́ “Baịbụl Ò Nwere Ike Inyere M Aka ma Echiche Igbu Onwe M Batawa M n’Obi?” Ọ dị n’isiokwu a, n’ebe a kpọrọ Ihe Ị Ga-elebakwu Anya.

b Ndị wepụtụrụla afọ ime ekwesịghị ikwe ka obi amamikpe mee ka ha chee na Jehova emekataghị gbaghara ha. Jehova nwere ike ịgbaghara ha. Ị chọọ ịmatakwu gbasara ya, gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Ite Ime?” Ọ dị n’isiokwu a, n’ebe a kpọrọ Ihe Ị Ga-elebakwu Anya.