Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 40

Olee Otú Anyị Ga-esi Dịrị Ọcha Otú Chineke Chọrọ?

Olee Otú Anyị Ga-esi Dịrị Ọcha Otú Chineke Chọrọ?

Ị̀ hụtụla ebe ezigbo nne na-ejikere nwa ya ka ọ gaa ụlọ akwụkwọ? Ọ na-asa nwa ahụ ahụ́, yiwekwa ya uwe dị ọcha. Ihe a na-eme ka nwa ahụ dị mma n’anya, na-emekwa ka ndị ọzọ mata na nne na nna ya na-elekọta ya nke ọma. Otú ahụkwa ka Jehova, bụ́ Nna anyị hụrụ anyị n’anya, chọrọ ka anyị na-adị ọcha, chọọkwa ka otú anyị si eche echiche, otú anyị si ekwu okwu na omume anyị gosi na anyị dị ọcha. Ịdị ọcha na-abara anyị uru, na-emekwa ka a na-eto Jehova.

1. Olee otú anyị ga-esi na-adị ọcha?

Jehova gwara anyị, sị: “Unu ga-adị nsọ, n’ihi na adị m nsọ.” (1 Pita 1:16) Ịdị nsọ pụtara na omume anyị ga-adị mma, e jirikwa ịdị ọcha mara anyị. A ga-asị na anyị na-adị ọcha ma ọ bụrụ na anyị na-asa ahụ́ mgbe niile, na-asa ákwà anyị, na-edebekwa ụlọ anyị na ụgbọala anyị ọcha. Anyị nwekwara ike ịna-enye aka n’idebe Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị ọcha. Ọ bụrụ na anyị ana-adị ọcha, ndị ọzọ ga na-eto Jehova.​—2 Ndị Kọrịnt 6:3, 4.

2. Anyị chọọ ịna-adị ọcha, olee àgwà ndị anyị na-agaghị na-akpa?

Baịbụl gwara anyị “ka anyị sachapụ ihe niile na-emerụ ahụ́ anyị na obi anyị.” (2 Ndị Kọrịnt 7:1) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịgba mbọ ka anyị ghara ime ihe ọ bụla nwere ike imebi ahụ́ anyị ma ọ bụ obi anyị. Ihe anyị na-eche kwesịrị ịbụ ihe dị Jehova mma. Ọ bụ ya mere anyị kwesịrị iji gbasie mbọ ike ka anyị ghara ịna-eche ihe na-adịghị mma. (Abụ Ọma 104:34) Anyị ekwesịghịkwa ịna-ekwu okwu rụrụ arụ.​—Gụọ Ndị Kọlọsi 3:8.

Olee ihe ọzọ nwere ike ime ka anyị ghara ịdị ọcha n’ahụ́ ma ọ bụ mee ka otú anyị si eche echiche, otú anyị si ekwu okwu na omume anyị ghara ịdị ọcha? E nwere ihe ụfọdụ nwere ike imerụ ahụ́ anyị. N’ihi ya, anyị ekwesịghị ịna-akpọ ụtaba, ịna-aṅụ sịga, ịna-ata akị osisi bitel ma ọ bụ ahịhịa koka, ma ọ bụkwanụ ịna-aṅụ ọgwụ ike. Anyị kwesịrị izere ha na ihe ndị yiri ha. Anyị hapụ ime ihe ndị a, anyị agaghị na-arịa ọrịa ndị ha na-akpata, anyị na-egosikwa na anyị ji ndụ Chineke nyere anyị kpọrọ ihe. Otú anyị ga-esikwa eme ka omume anyị dị ọcha bụ ịgba mbọ ghara ime omume abụọ na-adịghị ọcha, ya bụ, igbo onwe anyị agụụ mmekọahụ na ile ndị gba ọtọ. (Abụ Ọma 119:37; Ndị Efesọs 5:5) Ịkwụsị àgwà ndị a adịchaghị mfe, ma Jehova ga-enyere anyị aka ịkwụsị ha.​—Gụọ Aịzaya 41:13.

MỤTAKWUO IHE

Chọpụta otú anyị ịdị ọcha si eme ka a na-eto Jehova nakwa ihe ga-enyere mmadụ aka ịkwụsị àgwà dị iche iche na-adịghị ọcha.

3. A na-eto Jehova ma anyị na-adị ọcha

Anyị leba anya n’iwu Jehova nyere ndị Izrel oge ochie, anyị ga-amata otú o si ele ịdị ọcha anya. Gụọnụ Ọpụpụ 19:10 na 30:17-19. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Gịnị ka amaokwu ndị a na-egosi gbasara otú Jehova si ele ịdị ọcha anya?

  • Olee ụfọdụ ihe ị ga na-eme ndị ga-eme ka ị na-adị ọcha?

Ịdị ọcha na-ewe oge, a na-agbakwara ya mbọ. Ma anyị nwere ike ịna-adị ọcha, ma ànyị bara ọgaranya ma ọ bụ na anyị abaghị. Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a.

  • Olee otú idebe ihe anyị nwere ọcha ga-esi mee ka ndị anyị na-aga ezi ozi ọma na-eto Jehova?

4. Kwụsị ịkpa àgwà ọjọọ

Jehova ga-enyeliri anyị aka ịkwụsị ịkpa àgwà ọjọọ

Ọ bụrụ na ị na-aṅụ sịga ma ọ bụ na-aṅụ ọgwụ ike, ị ga-aghọta na ịkwụsị ya adịghị mfe. Gịnị ga-enyere gị aka? Chebara aka ọjọọ ọ na-akpa gị echiche. Gụọnụ Matiu 22:37-39. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ụdị aka ọjọọ ịkpọ ụtaba ma ọ bụ ịṅụ sịga ma ọ bụ ịṅụ ọgwụ ike nwere ike ịkpa . . .

  • adịm ná mma mmadụ na Jehova.

  • ezinụlọ mmadụ na ndị ọzọ nọ ya nso.

Mee atụmatụ otú ị ga-esi kwụsị àgwà ọjọọ ị na-akpa. a Kpọnyenụ VIDIO a.

Gụọnụ Ndị Filipaị 4:13. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee otú ikpechi ekpere anya, ịgụ Baịbụl mgbe niile, na ịgachi ọmụmụ ihe anya ga-esi nyere mmadụ aka ịkwụsị àgwà ọjọọ riri ya ahụ́?

5. Na-agba mbọ ka ị ghara ịna-eche ihe na-adịghị mma ma ọ bụ na-akpa àgwà ọjọọ

Gụọnụ Ndị Kọlọsi 3:5. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Olee otú anyị si mara na ile ndị gba ọtọ, iji ekwentị ezigara mmadụ ozi iberiibe, na mmadụ igbo onwe ya agụụ mmekọahụ adịghị Jehova mma?

  • Ì chere na anyị ga-akwụsịli ịkpa àgwà dị iche iche Jehova chọrọ ka anyị ghara ịna-akpa? Maka gịnị?

Chọpụta ihe mmadụ nwere ike ime ka ọ kwụsị ịna-eche ihe na-adịghị mma. Kpọnyenụ VIDIO a.

O nwere ihe atụ Jizọs mere iji gosi na e nwere ihe anyị kwesịrị ịna-eme ka anyị ghara ime ihe ọjọọ. Gụọnụ Matiu 5:29, 30. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Ọ bụ eziokwu na Jizọs anaghị ekwu na anyị kwesịrị imerụ onwe anyị ahụ́, ma ihe o kwuru gosiri na e nwere ihe anyị kwesịrị ime. Olee ụfọdụ ihe mmadụ nwere ike ime ga-enyere ya aka ka ọ kwụsị ịna-eche ihe na-adịghị mma? b

Ọ bụrụ na ị na-agba mbọ ka ị kwụsị ịna-eche ihe na-adịghị mma, Jehova na-ahụ mbọ ị na-agba. Gụọnụ Abụ Ọma 103:13, 14. Unu gụcha ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Ọ bụrụ na e nwere àgwà ọjọọ ị na-agba mbọ ka ị kwụsị ịkpa, olee otú amaokwu ndị a si agba gị ume ka ị ghara ịkwụsị mbọ a ị na-agba?

Otu ugboro i mere ihe ahụ ọzọ apụtaghị na ị gaghị akwụsịli ime ya

I nwere ike ịna-eche, sị ‘Ebe ọ bụ na m mere ihe a ọzọ, ịgbawa mbọ ka m kwụsị ya abaghịzi uru.’ Ma chegodị ihe a: Ọ bụrụ na onye na-agba ọsọ azọhie ụkwụ ma daa, ọ pụtaghị na e nweghịzi ihe ọ ga-agbata n’ọsọ ahụ ma ọ bụkwanụ na ọ ga-agazi malite n’isi. Ọ bụ otú ahụ ka ime ihe ị na-agba mbọ ka ị kwụsị ime na-apụtaghị na ị gaghị akwụsịli ime ihe ahụ. Ọ pụtaghịkwa na mbọ niile ị gbara efuola ọhịa. Imejọ ihe na ịgba mbọ na-agakọ. Onye ọ bụla na-agba mbọ ka ọ kwụsị ime ihe na-adịghị mma ga-enwerịrị mgbe ọ ga-eme ihe ahụ na-adịghị mma. N’ihi ya, adala mbà. Jehova ga-enyere gị aka ka ị kwụsị ime ihe ahụ na-adịghị mma.

ỤFỌDỤ NA-ASỊ na àgwà ha na-akpa eriela ha ahụ́ nakwa na ha agaghịzi akwụsịli ya.

  • Olee ebe i nwere ike ịgụrụ ụdị onye ahụ na Baịbụl iji gosi ya na Jehova ga-enyere ya aka ịkwụsị àgwà ọjọọ ahụ?

NCHỊKỌTA

Anyị na-eme Jehova obi ụtọ ma ọ bụrụ na anyị ana-edebe onwe anyị ọcha, ghara ịna-eche ihe na-adịghị mma, na-akpakwa àgwà ọma.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-adị ọcha?

  • Olee ụfọdụ ihe ị ga na-eme ka ị na-adị ọcha?

  • Gịnị ga-enyere gị aka ka ị ghara ịna-eche ihe na-adịghị mma, gharakwa ịna-eme ihe na-adịghị mma?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Chọpụta ihe ụfọdụ mmadụ nwere ike ime ka ọ na-adị ọcha a sịgodị na o nweghị ego?

Ahụ́ Ike na Ịdị Ọcha​—Ịkwọ Aka (3:01)

Chọpụta ihe ụfọdụ mmadụ nwere ike ime ga-enyere ya aka ịkwụsị ịṅụ sịga.

“Otú E si Akwụsị Ịṅụ Sịga” (Teta!, Mee 2010)

Chọpụta nsogbu ile ndị gba ọtọ nwere ike ịkpatara mmadụ.

“Mmadụ Ikiri Ndị Gba Ọtọ Ò Nwere Ihe O Mere?” (Ụlọ Nche, Ọgọst 1, 2013)

E nwere otu nwoke ikiri ndị gba ọtọ riri ahụ́. Chọpụta ihe nyeere ya aka ịkwụsị ya.

“Mbọ M Gbara Ibi Ndụ Dị Mma Kụrụ Afọ n’Ala Ọtụtụ Ugboro” (Ụlọ Nche Nke 4 2016)

a Isiokwu bụ́ “Otú E Si Akwụsị Ịṅụ Sịga” nke dị n’ebe a kpọrọ Ihe Ị Ga-elebakwu Anya, kwuru ihe ndị mmadụ nwere ike ime ga-enyere ya aka ịkwụsị ịṅụ sịga.

b Ị chọọ ịhụ ihe nwere ike inyere mmadụ aka ịkwụsị igbo onwe ya agụụ mmekọahụ, gụọ isiokwu bụ́ “Olee Otú M Ga-esi Kwụsị Igbo Onwe M Agụụ Mmekọahụ?” Ọ dị n’akwụkwọ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ​—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1, isi nke 25.