Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 41

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Mmekọahụ?

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Mmekọahụ?

Ahụ́ anaghị eru ọtụtụ ndị ala ikwu gbasara mmekọahụ. Ma, mgbe ọ bụla Baịbụl kwuru gbasara mmekọahụ, ọ na-ekwu ya otú dị mma ná ntị, ya edookwa onye ukwu na onye nta anya. Ihe o kwuru na-abara anyị uru. Ọ bụkwa otú o kwesịrị ịdị n’ihi na Baịbụl si n’aka Jehova, bụ́ Onye kere anyị. Ebe ọ bụ ya kere anyị, ọ ma ihe ga-akacha abara anyị uru. Ọ na-agwa anyị ihe anyị ga na-eme ka obi na-atọ ya ụtọ nakwa ihe anyị ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi.

1. Olee otú Jehova si ele mmekọahụ anya?

Mmekọahụ bụ onyinye Jehova nyere ụmụ mmadụ. Ọ chọrọ ka di na nwunye jiri ya na-eme onwe ha obi ụtọ. Di na nwunye nwere ike inwe mmekọahụ iji mụta ụmụ, ha nwekwara ike inwe ya iji mee onwe ha obi ụtọ ma si otú ahụ gosi na ha hụrụ ibe ha n’anya. Ọ bụ ya mere Okwu Chineke ji gwa nwoke, sị: “Ka gị na nwunye ị lụrụ n’okorobịa na-aṅụrị ọṅụ.” (Ilu 5:18, 19) Jehova chọrọ ka ndị di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst ghara ịgba n’èzí, ya bụ, ha ekwesịghị ịga kwaa iko.​—Gụọ Ndị Hibru 13:4.

2. Gịnị bụ ịkwa iko?

Baịbụl gwara anyị na “ndị na-akwa iko . . . agaghị eketa Alaeze Chineke.” (1 Ndị Kọrịnt 6:​9, 10) Ihe ndị dere Baịbụl n’asụsụ Grik kpọrọ ịkwa iko bụ por·neiʹa. Ọ pụtara (1) nwoke na nwaanyị na-abụghị di na nwunye inwe mmekọ, a (2) nwoke na nwoke ma ọ bụ nwaanyị na nwaanyị inwe mmekọ, na (3) mmadụ na anụmanụ inwe mmekọ. Ọ bụrụ na anyị ‘aghara ịna-akwa iko,’ ọ ga-abara anyị uru, meekwa Jehova obi ụtọ.​—1 Ndị Tesalonaịka 4:3.

MỤTAKWUO IHE

Chọpụta otú i nwere ike isi zere ịkwa iko nakwa uru ị ga-erite ma ọ bụrụ na ị naghị eme omume rụrụ arụ.

3. Gbaara ịkwa iko ọsọ

Mgbe otu nwaanyị gwara otu ohu Chineke aha ya bụ Josef ka ha kwaa iko, Josef ekweghị. Gụọnụ Jenesis 39:1-12. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Gịnị mere Josef ji gbaa ọsọ?​—Leruonụ anya n’amaokwu nke 9.

  • Ì chere na ihe a Josef mere dị mma? Gịnị mere i ji chee otú ahụ?

Olee otú ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa n’oge a nwere ike isi mee ka Josef ma gbaara ịkwa iko ọsọ? Kpọnyenụ VIDIO a.

Jehova chọrọ ka anyị ghara ịna-akwa iko. Gụọnụ 1 Ndị Kọrịnt 6:18. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Olee ihe ụfọdụ nwere ike ime ka mmadụ kwaa iko?

  • Olee otú i nwere ike isi gbaara ịkwa iko ọsọ?

4. Ị ga-emerili ọnwụnwa

Ọnwụnwa bịara anyị ka anyị kwaa iko, gịnị nwere ike ime ka imeri ya siere anyị ike? Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Mgbe nwanna a anyị lere na vidio chọpụtara na ihe ndị ọ na-eche na ihe ndị ọ na-eme nwere ike ime ka ọ gbawa n’èzí, gịnị ka o mere?

Ezigbo Ndị Kraịst nwedịrị ike iche ihe na-adịghị mma mgbe ụfọdụ. Gịnị ga-enyere gị aka ka ị ghara ịnọgịde na-eche ihe na-adịghị mma? Gụọnụ Ndị Filipaị 4:8. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Olee ụdị ihe ndị anyị kwesịrị ịna-eche?

  • Olee otú ịgụ Baịbụl na ịrụsi ọrụ ike n’ozi Jehova nwere ike isi nyere anyị aka ka anyị ghara ime ihe ọjọọ?

5. Iwu dị iche iche Jehova nyere anyị na-abara anyị uru

Jehova ma ihe ga-akacha abara anyị uru. Ọ gwara anyị ihe anyị ga-eme ka anyị ghara ime ihe ọjọọ nakwa uru irubere ya isi ga-abara anyị. Gụọnụ Ilu 7:7-27 ma ọ bụ unu akpọnye VIDIO a. Unu mechaa, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee otú otu nwa okorobịa si mee ihe tinyere ya n’ọnwụnwa?​—Leruonụ anya n’Ilu 7:8, 9.

  • Baịbụl kwuru n’Ilu 7:23, 26 na ịkwa iko nwere ike ịkpatara mmadụ ezigbo nsogbu. Ọ bụrụ na anyị anaghị eme omume rụrụ arụ, olee nsogbu ndị na-agaghị abịara anyị?

  • Olee otú izere omume rụrụ arụ nwere ike isi mee ka anyị na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi?

Ụfọdụ ndị na-eche na ihe Baịbụl kwuru gbasara nwoke na nwoke ma ọ bụ nwaanyị na nwaanyị inwe mmekọ na-egbochi mmadụ inwe obi ụtọ. Ma, Jehova, bụ́ Chineke hụrụ anyị n’anya, chọrọ ka anyị niile na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi. Anyị chọọ iso ná ndị ga na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi, anyị ga na-erubere ya isi. Gụọnụ 1 Ndị Kọrịnt 6:9-11. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Ọ̀ bụ naanị nwoke na nwoke ma ọ bụ nwaanyị na nwaanyị inwe mmekọ ka Chineke na-achọghị ka ọ na-agụ anyị agụụ?

Anyị kwesịrị ịgbanwe otú ụfọdụ anyị si akpa àgwà ka anyị nwee ike ịna-eme ihe dị Chineke mma. Ò nwere uru ọ ga-abara anyị? Gụọnụ Abụ Ọma 19:​8, 11. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Ì chere na iwu dị iche iche Jehova nyere dị mma? Gịnị mere i ji zaa ihe ị zara?

Jehova enyerela ọtụtụ ndị aka, ha amalite idebe iwu ya. Ọ ga-enyekwara gịnwa aka

ỤFỌDỤ NA-ASỊ na mmadụ abụọ inwe mmekọ adịghị njọ ma ọ bụrụ na ha hụrụ ibe ha n’anya.

  • Gịnị ka i chere?

NCHỊKỌTA

Mmekọ nwoke na nwaanyị bụ onyinye Jehova nyere ndị di na nwunye ha ga-eji na-eme onwe ha obi ụtọ.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Gịnị na gịnị so n’ịkwa iko?

  • Gịnị ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ịkwa iko?

  • Olee uru anyị ga-erite ma anyị na-erubere Jehova isi?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Chọpụta ihe mere Chineke ji chọọ ka nwoke na nwaanyị buru ụzọ lụọ tupu ha ebiri.

“Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Nwoke na Nwaanyị Ibikọ Ọnụ n’Alụghị Alụ?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)

Baịbụl sịrị na mmekọ nwoke na nwoke na nke nwaanyị na nwaanyị dị njọ. Chọpụta ma ọ̀ pụtara na anyị ga-akpọ ndị na-eme ya asị.

“Mmekọ Nwoke na Nwoke ma Ọ Bụ Mmekọ Nwaanyị na Nwaanyị Ọ̀ Dị Njọ?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)

Chọpụta otú iwu dị iche iche Chineke nyere anyị gbasara ụdị mmekọahụ niile si abara anyị uru.

“Mmadụ Iji Ọnụ Amị Ihe E Ji Bụrụ Nwoke ma Ọ Bụ Ihe E Ji Bụrụ Nwaanyị Ọ̀ Dị Njọ n’Eziokwu?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)

Gụọ isiokwu bụ́ “Ha Kwanyeere M Ùgwù,” ka ị chọpụta ihe mere otu nwoke ya na ndị nwoke ibe ya inwe mmekọ riri ahụ́ ji gbanwe ma fewe Chineke.

“Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ” (Ụlọ Nche, Eprel 1, 2011)

a Ụfọdụ n’ime ihe so ná mmekọ a na-ekwu ebe a bụ ihe mmadụ ji bụrụ nwoke ịba n’ihe mmadụ ji bụrụ nwaanyị, isi n’ọnụ enwe mmekọ, isi n’otule enwe mmekọ, na ịdịda ihe onye ọzọ ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị aka.