Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 42

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Ndị Lụrụ Di na Nwunye na Ndị Na-alụghị?

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Ndị Lụrụ Di na Nwunye na Ndị Na-alụghị?

N’obodo ụfọdụ, ndị mmadụ na-ekwu na mmadụ emekataghị nwee obi ụtọ ná ndụ ma ọ bụrụ na ọ lụghị di ma ọ bụ na ọ lụghị nwunye. Ma, ọ bụghị ndị niile lụrụ di ma ọ bụ ndị niile lụrụ nwunye na-enwe obi ụtọ. Ọ bụghịkwa ndị niile na-alụghị ka obi na-ajọ njọ. N’eziokwu, Baịbụl kwuru na mmadụ ịlụ di ma ọ bụ mmadụ ịlụ nwunye nakwa mmadụ ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ n’alụghị nwunye bụcha onyinye si n’aka Chineke.

1. Olee ụfọdụ uru onye na-alụghị di ma ọ bụ onye na-alụghị nwunye na-erite?

Baịbụl sịrị: “Onye lụrụ di ma ọ bụ onye lụrụ nwunye ga-erite uru. Ma, onye na-alụghị ga-aka erite uru.” (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 7:32, 33, 38.) Olee otú o si bụrụ na onye na-alụghị di ma ọ bụ onye na-alụghị nwunye “ga-aka erite uru”? Ndị Kraịst na-alụghị di ma ọ bụ na-alụghị nwunye enweghị di ma ọ bụ nwunye ha ga na-elekọta. N’ihi ya, ha ka ndị nke lụrụ di ma ọ bụ ndị nke lụrụ nwunye enwe efe ime ọtụtụ ihe. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ n’ime ha na-ewepụta onwe ha na-eme ọtụtụ ihe n’ozi ha na-ejere Jehova, dị ka ịkwaga ebe ọzọ a na-enwechaghị ndị na-ezi ozi ọma, ka ha nwee ike ịna-ezi ndị bi ebe ahụ ozi ọma. Nke kachanụ bụ na ha nwere ike iji oge buru ibu na-eme ka ha na Jehova dịkwuo ná mma.

2. Olee uru ndị dị na mmadụ ịlụ di ma ọ bụ mmadụ ịlụ nwunye otú iwu obodo kwuru?

Otú ahụ onye na-alụghị di ma ọ bụ onye na-alụghị nwunye na-erite uru ụfọdụ ka onye lụrụ di ma ọ bụ onye lụrụ nwunye na-eritekwa. Baịbụl sị na “abụọ dị mma karịa otu.” (Ekliziastis 4:9) Ndị na-akacha aghọta na ihe amaokwu Baịbụl a kwuru bụ eziokwu bụ ezigbo Ndị Kraịst ndị na-eme ihe Baịbụl kwuru n’ezinụlọ ha. Di na nwunye lụrụ otú iwu obodo kwuru na-ekwe ibe ha nkwa na ha ga-ahụ ibe ha n’anya, na-akwanyere ha ùgwù ma jiri ha kpọrọ ihe. Ha anaghị echegbu onwe ha otú ndị bi n’alụghị otú iwu obodo kwuru na-echegbu onwe ha na e nwere ike ịgbahapụ ha. Obi na-esikwa ụmụ ha ike na nne ha ma ọ bụ nna ha agaghị agbahapụ ha otu ụbọchị.

3. Olee otú Jehova si ele alụmdi na nwunye anya?

Mgbe Jehova jikọrọ di na nwunye mbụ, ọ sịrị: ‘Nwoke ga-ahapụ nne ya na nna ya ma rapara n’ahụ́ nwunye ya.’ (Jenesis 2:24) Jehova chọrọ ka di na nwunye hụ ibe ha n’anya ma ghara ịhapụ ibe ha n’oge niile ha dị ndụ. Naanị ihe Jehova kwuru nwere ike ime ka ha hapụ ibe ha bụ ịkwa iko. O kwuru na e nwee onye n’ime ha kwara iko, onye nke ọzọ nwere ike ikpebi ịgba onye nke kwara iko alụkwaghịm. a (Matiu 19:9) Jehova achọghị ka Onye Kraịst nwee karịa otu di ma ọ bụ karịa otu nwunye.​—1 Timoti 3:2.

MỤTAKWUO IHE

Ma ị̀ lụrụ di ma ị̀ lụrụ nwunye ma ọ bụ na ị́ lụghị, chọpụta ihe ị ga-eme ka i nwee ike ịna-enwe obi ụtọ ma na-eme ka Jehova ṅụrịa.

4. Jiri oge ị na-alụbeghị di ma ọ bụ ị na-alụbeghị nwunye mee ihe bara uru

Jizọs ma na alụghị di ma ọ bụ alụghị nwunye bụ onyinye si n’aka Chineke. (Matiu 19:11, 12) Gụọnụ Matiu 4:23. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee otú Jizọs si jiri oge ọ na-alụghị nwunye jeere Nna ya ozi ma nyere ndị ọzọ aka?

Ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye nwere ike ịna-enwe obi ụtọ ma ha jiri oge ahụ na-eme ihe Jizọs ji ụdị oge ahụ mee. Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee ihe ndị bara uru Ndị Kraịst nwere ike iji oge ha na-alụbeghị di ma ọ bụ oge ha na-alụbeghị nwunye mee?

Ị̀ ma ihe a?

Baịbụl ekwughị afọ ole ọ ga-abụ mmadụ ruo ya abụrụ na o toruola ịlụ di ma ọ bụ ịlụ nwaanyị. Ma, o kwuru na ọ dị mma ka mmadụ lụọ di ma ọ bụ nwunye mgbe ‘ọ na-abụghịzi nwata.’ Oge ahụ bụ mgbe mmadụ ga-ejideli onwe ya ka agụụ mmekọ nwoke na nwaanyị ghara imegharị ya anya, ya emee ihe ọ ga-emecha kwaara ụta.​—1 Ndị Kọrịnt 7:36.

5. Saa anya ná mmiri họrọ onye ị ga-alụ

Ịhọrọ onye ị ga-alụ bụ otu n’ime ihe kacha mkpa i nwere ike ikpebi ná ndụ. Gụọnụ Matiu 19:4-6, 9. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee ihe mere na ịlụ di ma ọ bụ ịlụ nwunye ekwesịghị ịdị Onye Kraịst ọkụ ọkụ?

Baịbụl ga-enyere gị aka ịchọpụta ma onye ị chọrọ ịlụ ọ̀ na-akpakwa ezigbo àgwà. Ihe kacha mkpa ị ga-agba mbọ mee bụ ịchọpụta ma onye ị chọrọ ịlụ ọ̀ hụrụ Jehova n’anya. b Gụọnụ 1 Ndị Kọrịnt 7:39 na 2 Ndị Kọrịnt 6:14. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Olee ihe mere anyị ji kwesị ịlụ naanị Onye Kraịst ibe anyị?

  • Olee otú i chere obi ga-adị Jehova ma anyị lụọ onye na-ahụghị ya n’anya?

Ọ bụrụ na e jiri yok kekọta anụ abụọ na-abụghị otu ụdị anụ, ha abụọ ga-ata ahụhụ. Ọ dị ka mgbe Onye Kraịst gara lụrụ onye na-abụghị Onye Kraịst, ya na ọtụtụ nsogbu ga na-alụ

6. Na-ele alụmdi na nwunye anya otú Jehova si ele ya

N’oge ochie, ihe mere ndị Izrel ụfọdụ ji gbaa ndị nwunye ha alụkwaghịm bụ iji nweta ihe na-agụ anụ ahụ́ ha. Gụọnụ Malakaị 2:13, 14, 16. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Gịnị mere o ji ewute Jehova ma anyị jiri maka ihe na-enweghị isi gbaa di anyị ma ọ bụ nwunye anyị alụkwaghịm?

Ịkwa iko na ịgba alụkwaghịm ya na ya so na-agbawa di ma ọ bụ nwunye aka ya dị ọcha na ụmụ ya obi

Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Ọ bụrụ na di gị ma ọ bụ nwunye gị abụghị Onye Kraịst, olee ihe ị ga-eme ka unu na-ebi n’udo?

7. Na-eme ihe Jehova chọrọ ka di ma ọ bụ nwunye na-eme n’ezinụlọ

O nwere ike isiri mmadụ ike ime ihe Jehova chọrọ ka di ma ọ bụ nwunye na-eme n’ezinụlọ. c Ma, Jehova na-agọzi ndị na-agba mbọ na-eme ihe ha kwesịrị ime. Kpọnyenụ VIDIO a.

Gụọnụ Ndị Hibru 13:4. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Ì chere na ihe Jehova chọrọ ka di ma ọ bụ nwunye na-eme n’ezinụlọ dị mma? Gịnị mere i ji zaa ihe ị zara?

Jehova chọrọ ka Ndị Kraịst bụ́ di na nwunye dejupụta akwụkwọ na-egosi na ha bụ di na nwunye. Ọ chọkwara ka ha dejupụta nke na-egosi na ha gbara alụkwaghịm mgbe ọ bụla ha gbara alụkwaghịm. Anyị kwesịrị ime ihe abụọ a maka na ha bụ ihe ndị ọchịchị chọrọ ka a na-eme n’ọtụtụ ebe n’ụwa. Gụọnụ Taịtọs 3:1. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Ọ bụrụ na ị lụọla di ma ọ bụ na ị lụọla nwunye, ì meela ihe ndị ọchịchị kwuru a ga-eme ka ha mara na unu alụọla?

MMADỤ NWERE IKE ỊJỤ GỊ ihe mere ọ ga-eji gaa lụwa di ma ọ bụ nwunye ebe ọ bụ na nwoke na nwaanyị nwere ike biri n’alụghị alụ.

  • Gịnị ka ị ga-aza onye ahụ?

NCHỊKỌTA

Ma ịlụ di ma ọ bụ ịlụ nwunye ma alụghị alụ bụcha onyinye si n’aka Jehova. Ma mmadụ ọ̀ lụrụ ma ọ bụ na ọ lụghị, o nwere ike ịna-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na ọ na-ebi ndụ otú Jehova si chọọ.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Olee otú mmadụ ga-esi jiri oge ọ na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye mee ihe bara uru?

  • Gịnị mere Baịbụl ji gwa anyị ka anyị na-alụ Ndị Kraịst ibe anyị?

  • Gịnị ka Baịbụl kwuru bụ naanị ihe ga-eme ka mmadụ gbaa di ya ma ọ bụ nwunye ya alụkwaghịm?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Gịnị ka mmadụ ịlụ “naanị onye na-eso ụzọ Onyenwe anyị” pụtara?

“Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” (Ụlọ Nche, Julaị 1, 2004)

Lee obere vidio abụọ ga-enyere gị aka ikpebi ihe na-agaghị aghọ gị ahịa mgbe gị na onye ị chọrọ ịlụ na-akpa.

Ịkwadebe Maka Alụmdi na Nwunye (11:53)

Chọpụta ihe mere otu nwanna nwoke ji kwuo na ihe Jehova meere ya karịrị ihe ya hapụrụ iji fee ya.

M Nọ Na-eche na Ọ Ga-emecha Bụrụ Onyeàmà Jehova (1:56)

Gịnị na gịnị ka mmadụ kwesịrị ichebara echiche tupu ya achọwa ịgba di ya ma ọ bụ nwunye ya alụkwaghịm ma ọ bụ chọwa ka ha kewaa?

“Na-akwanyere ‘Ihe Chineke Kekọtara’ Ùgwù” (Ụlọ Nche, Disemba 2018)

a Gụọ Ihe nke 4 E Dere ná Ngwụcha Akwụkwọ A gbasara ihe ga-eme ka mmadụ hapụ di ya ma ọ bụ nwunye ya mgbe ọ na-akwaghị iko.

b N’ebe ụfọdụ, ọ bụ ndị nne na nna na-achọtara ụmụ ha di ma ọ bụ nwunye. Ọ bụrụ otú ọ dị n’obodo unu, unu ndị nne na nna hụrụ ụmụ ha n’anya, ihe unu kwesịrị ịchọpụta bụ ma onye ahụ ọ̀ hụrụ Jehova n’anya, ọ bụghị ụdị ego o nwere ma ọ bụ otú o si buru onye ukwu n’obodo.

c Ọ bụrụ na onye gị na ya bi ugbu a abụghị di gị ma ọ bụ nwunye gị, ọ bụ gịnwa ga-ekpebi ma ị̀ ga-ahapụ ya ma ị̀ ga-alụwa ya.