Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 44

Ọ̀ Bụ Ememme Niile Dị Chineke Mma?

Ọ̀ Bụ Ememme Niile Dị Chineke Mma?

Jehova chọrọ ka anyị na-enwe obi ụtọ. Ọ chọdịrị ka anyị na-eme ememme mgbe ụfọdụ. Ma, ọ̀ bụ ememme niile dị ya mma? Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị hụrụ Jehova n’anya ma a bịa n’ime ememme?

1. Gịnị mere na ọtụtụ ememme adịghị Jehova mma?

O nwere ike ịtụ gị n’anya ịmara na ọtụtụ ememme ndị mmadụ na-eme hiwere isi n’ozizi ndị na-adịghị na Baịbụl, ndị malitekwara ime ha bụ ndị na-ekpere arụsị. Ọ bụ ndị okpukpe ụgha na-eme ụdị ememme ndị ahụ. Ihe ụfọdụ a na-eme mgbe a na-eme ha nwere ike ịbụ ụzọ e si etinye aka n’ime mgbaasị ma ọ bụkwanụ iji gosi na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ. Ememme ụfọdụ hiwere isi na nkwenkwe ụgha ma ọ bụ na chi ihu ọma. (Aịzaya 65:11) Jehova gwara ndị ohu ya, sị: ‘Nọrọnụ iche. Unu emetụzila ihe na-adịghị ọcha aka.’​—2 Ndị Kọrịnt 6:17. a

2. Olee otú obi na-adị Jehova gbasara ememme ndị e ji akwanyere mmadụ ùgwù gafere ókè?

Jehova gwara anyị ka anyị ghara ‘ịtụkwasị mmadụ nkịtị obi.’ (Gụọ Jeremaya 17:5.) A na-eji ụfọdụ ememme akwanyere ndị ọchịchị ma ọ bụ ndị agha ùgwù, na-ejikwa ụfọdụ akwanyere ihe na-anọchi anya obodo, dị ka ọkọlọtọ, ùgwù. A na-ejikwa ememme ụfọdụ echeta ụbọchị obodo nweere onwe ya. (1 Jọn 5:21) E nwekwara ndị nke e ji akwado ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ ọdịmma ọhaneze. Olee otú obi ga-adị Jehova ma anyị na-akwanyere mmadụ ùgwù gafere ókè ma ọ bụ ma anyị jiri òtù ụmụ mmadụ hiwere kpọrọ ihe gabiga ókè, karịchaa òtù nke na-eme ka ndị mmadụ na-eme ihe Jehova na-achọghị?

3. Gịnị na gịnị ka e ji amata ememme na-adịghị Chineke mma?

Baịbụl kwuru na ‘ịṅụ oké mmanya, ime oriri oké mkpọtụ, na mmadụ na ibe ya ịma aka onye ga-aṅụkarị ná mmanya’ adịghị mma. (1 Pita 4:3) Ndị mmadụ mewe ememme ụfọdụ, ha na-eme ọtụtụ ihe ara ara, na-emekwa omume rụrụ arụ. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka anyị na Jehova dịrị ná mma na-aga, anyị ekwesịghị itinye aka n’ụdị omume rụrụ arụ ndị ahụ.

MỤTAKWUO IHE

Chọpụta otú ị ga-esi amata ememme nke ị na-ekwesịghị ime, gị esikwa otú ahụ mee Jehova obi ụtọ.

4. Emela ememme na-adịghị Jehova mma

Gụọnụ Ndị Efesọs 5:10. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Gịnị ka anyị kwesịrị ịchọpụta mgbe anyị na-ekpebi ma ànyị ga-eme otu ememme ka ọ̀ bụ na anyị agaghị eme ya?

  • Olee ememme ndị a na-emekarị ebe i bi?

  • Ì chere na ememme ndị ahụ dị Chineke mma?

Dị ka ihe atụ, ì chetụla gbasara otú Chineke si ele ememme ụbọchị ọmụmụ anya? O nweghị onye fere Jehova n’oge ochie Baịbụl kwuru na o mere ememme ụbọchị ọmụmụ ya. Ma, Baịbụl kọrọ akụkọ mmadụ abụọ na-anaghị efe Jehova mere ememme ụbọchị ọmụmụ ha. Gụọnụ Jenesis 40:20-22 na Matiu 14:6-10. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Olee otu ihe e mere n’ememme ụbọchị ọmụmụ abụọ a?

  • N’ihi akụkọ ndị a kọrọ n’ebe ndị a anyị gụrụ, olee otú i chere Jehova si ele ememme ụbọchị ọmụmụ anya?

Ma, i nwere ike ịjụ, sị, ‘ma m̀ na-eme ememme ụbọchị ọmụmụ ma ọ bụkwanụ ememme ọzọ Baịbụl na-akwadoghị ma ọ bụ na m naghị eme, ọ̀ gbasara Jehova?’ Gụọnụ Ọpụpụ 32:1-8. Unu gụchaa ya, unu akpọnye VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Gịnị mere anyị ji kwesị ịchọpụta ihe dị Jehova mma?

  • Olee otú ị ga-esi achọpụta ya?

Otú anyị ga-esi mara ememme na-adịghị Chineke mma

  • Ò hiwere isi n’ozizi na-adịghị na Baịbụl? Ị chọọ ịmara, chọpụta otú e si malite ime ya.

  • Ọ̀ na-eme ka a na-akwanyere ndị mmadụ, òtù, ma ọ bụ ihe na-anọchi anya obodo ùgwù gabiga ókè? Anyị na-akwanyere Jehova ùgwù karịa onye ọ bụla ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ. Obi siri anyị ike na ọ ga-eme ka nsogbu ụwa kwụsị.

  • Baịbụl ò kwuru na ihe ndị a na-eme n’ememme ahụ nakwa otú e si eme ya adịghị mma? Anyị ekwesịghị ịna-eme omume rụrụ arụ.

5. Mee ka ndị ọzọ na-akwanyere gị ùgwù

O nwere ike isiri gị ike ịjụ isonyere ndị ọzọ mgbe ha na-enye gị nsogbu ka i soro ha na-eme ememme ndị na-adịghị Jehova mma. Wetuo obi, jirikwa akọ gwa ha ihe mere na ị gaghị esonyere ha. Unu chọọ ịhụ otú i nwere ike isi agwa ha okwu, kpọnyenụ VIDIO a.

Gụọnụ Matiu 7:​12. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • N’ihi ihe amaokwu a kwuru, ì kwesịrị ịgwa ndị ezinụlọ unu na-eme ememme ndị na-adịghị Chineke mma na ha ekwesịghị ịna-eme ha?

  • Gịnị na gịnị ka i nwere ike ime iji mesie ndị ezinụlọ unu obi ike na ị ka hụrụ ha n’anya ma jiri ha kpọrọ ihe n’agbanyeghị na ị gaghị na-eso ha eme ememme ụfọdụ?

6. Jehova chọrọ ka anyị na-enwe obi ụtọ

Jehova chọrọ ka anyị na ndị ezinụlọ anyị na ndị enyi anyị na-enwe obi ụtọ. Gụọnụ Ekliziastis 8:15. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee otú amaokwu a si gosi na Jehova chọrọ ka anyị na-enwe obi ụtọ?

Jehova chọrọ ka ndị na-efe ya na ibe ha na-enwekọ aṅụrị ọnụ. Kpọnyenụ VIDIO a ka unu hụ otú aṅụrị anyị na-enwekọ ọnụ ma anyị gaa mgbakọ mba niile si egosi na ihe a bụ eziokwu.

Gụọnụ Ndị Galeshia 6:10. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Ọ̀ gwụla mgbe anyị mere ememme na-adịghị Chineke mma ka anyị nwere ike imere ndị ọzọ “ihe ọma”?

  • Olee mgbe ị ga-enye mmadụ ihe obi adị gị ụtọ, ọ̀ bụ mgbe i nyere ya n’oge ememme maka na ndị ọzọ na-enye ka ọ̀ bụ mgbe i nyere ya n’oge ọ bụla ọzọ n’ihi na o si gị n’obi?

  • Mgbe ụfọdụ, ọtụtụ Ndịàmà Jehova na-emere ụmụ ha ihe pụrụ iche ma ọ bụkwanụ nye ha onyinye ha na-atụghị anya ya. Ọ bụrụ na i nwere ụmụ, olee ihe ndị pụrụ iche i nwere ike imere ha?

ỤFỌDỤ NA-ASỊ na otú e si malite ime ememme agbasaghị ha. Na naanị ihe gbasara ha bụ na ha na ndị ezinụlọ ha na ndị enyi ha na-enwe aṅụrị.

  • Gịnị ka i chere?

NCHỊKỌTA

Jehova chọrọ ka anyị na ndị ezinụlọ anyị na ndị enyi anyị na-enwe aṅụrị. Ma, ọ chọghị ka anyị na-eme ememme ndị na-adịghị ya mma.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Olee ajụjụ ndị anyị ga-ajụ onwe anyị iji chọpụta ememme ndị na-adịghị Jehova mma?

  • Olee otú anyị ga-esi enyere ndị ezinụlọ anyị na ndị enyi anyị aka ịghọta ihe mere na anyị anaghị eme ememme ụfọdụ?

  • Olee otú i si mara na Jehova chọrọ ka anyị na-ekpori ndụ ma na-enwe aṅụrị?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Chọpụta ihe anọ mere obi ji sie anyị ike na ememme ụbọchị ọmụmụ adịghị Chineke mma.

“Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Anaghị Eme Ememme Ncheta Ụbọchị Ọmụmụ?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)

Chọpụta otú ụmụaka hụrụ Jehova nʼanya si erubere ya isi nʼoge ibe ha na-eme ememme.

Jehova Ji Gị Kpọrọ Ihe (11:35)

Imirikitiimi Ndị Kraịst anaghị agba Krismas. Chọpụta otú obi na-adị ha maka ya.

“Ha Achọpụtala Ihe Bara Uru Karịa Krismas” (Ụlọ Nche, Disemba 1, 2012)

a Gụọ Ihe nke 5 E Dere ná Ngwụcha Akwụkwọ A ka ị chọpụta ihe ị ga-eme ma e nwee ihe mmadụ gwara gị mee n’oge ha na-eme ememme ha.