Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 46

Gịnị Mere I Ji Kwesị Inyefe Chineke Onwe Gị, Meekwa Baptizim?

Gịnị Mere I Ji Kwesị Inyefe Chineke Onwe Gị, Meekwa Baptizim?

Otú ị ga-esi enyefe Jehova onwe gị bụ ikwe ya nkwa n’ekpere na ọ bụ naanị ya ka ị ga-efe nakwa na ị ga-ebute ime uche ya ụzọ ná ndụ gị. (Abụ Ọma 40:8) I nyefechaa ya onwe gị, gị emezie baptizim. Ọ bụ mgbe i mere baptizim ka ndị ọzọ ga-amara na i nyefeela Jehova onwe gị. O nweghị ihe anyị kpebiri ime ná ndụ anyị a ga-eji tụnyere mkpebi anyị kpebiri inyefe Jehova onwe anyị. Mmadụ ikpebi inyefe Jehova onwe ya abụghị obere okwu. Ọ ga-eme ka ndụ mmadụ gbanwee. Oleezi ihe nwere ike ime ka i nyefee ya onwe gị?

1. Gịnị ga-eme ka mmadụ nyefee Jehova onwe ya?

Ọ bụ ịhụnanya na-eme ka anyị nyefee Jehova onwe anyị. (1 Jọn 4:10, 19) Baịbụl gwara anyị, sị: “Jiri obi gị niile na mkpụrụ obi gị niile na uche gị niile na ike gị niile hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.” (Mak 12:30) Anyị na-esi ma n’okwu ọnụ anyị ma n’omume anyị egosi na anyị hụrụ Chineke n’anya. Ọ na-abụ nwoke na nwaanyị hụ ibe ha n’anya, ha alụọ. Otú ahụ ka otú anyị si hụ Jehova n’anya kwesịrị isi mee ka anyị nyefee ya onwe anyị, meekwa baptizim.

2. Olee otú Jehova si agọzi Ndịàmà ya mere baptizim?

Ndị ezinụlọ Jehova na-enwe obi ụtọ. Ị ga-esonyere ha ma i mee baptizim. Ọ bụ mgbe ahụ ka ị ga-ahụ otú dị iche iche Jehova si hụ gị n’anya. Gị na ya ga-abụ ezigbo enyi karịa otú unu bụ ugbu a. (Gụọ Malakaị 3:16-18.) E wezụga na Jehova ga-abịa ghọọ Nna gị, ị ga-enwe ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị n’ụwa niile ndị hụrụ ma Jehova ma gịnwa n’anya. (Gụọ Mak 10:29, 30.) Ị manụ na o nwere ihe ndị ị ga-eme tupu i mee baptizim. I kwesịrị ịmatakwu onye Jehova bụ. I kwesịrị ịhụ ya n’anya. I kwesịkwara inwe okwukwe n’Ọkpara ya. N’ikpeazụzi, ị ga-enyefe Jehova onwe gị. Ọ bụrụ na i mee ihe ndị a, meekwa baptizim, ị ga-enwezi olileanya ịna-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi. Baịbụl kwuru, sị: “Baptizim . . . na-azọpụtakwa unu ugbu a.”​—1 Pita 3:​21.

MỤTAKWUO IHE

Chọpụta ihe mere i ji kwesị inyefe Jehova onwe gị, meekwa baptizim.

3. Anyị niile kwesịrị ịhọrọ onye anyị ga-efe

N’oge ochie, ụfọdụ ndị Izrel chere na ha nwere ike ịna-efe ma Jehova ma Bel. Ma, Jehova ziri Ịlaịja onye amụma ka ọ gaa gwa ha na ihe ha na-eme adịghị ya mma. Gụọnụ 1 Ndị Eze 18:21. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee ihe a gwara ndị Izrel ka ha mee?

Anyịnwa kwesịrị ịhọrọ onye anyị ga-efe otú ahụ ndị Izrel mere. Gụọnụ Luk 16:13. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịna-efe Jehova, na-efekwa onye ọzọ ma ọ bụ ihe ọzọ?

  • Olee otú anyị si egosi Jehova na ọ bụ ya ka anyị họọrọ ife?

4. Chebara otú Jehova si hụ gị n’anya echiche

Jehova nyere anyị ọtụtụ ọmarịcha onyinye. Gịnị ka anyịnwa ga-enye ya? Kpọnyenụ VIDIO a.

Olee ụzọ ụfọdụ Jehova si gosi na ọ hụrụ gị n’anya? Gụọnụ Abụ Ọma 104:14, 15 na 1 Jọn 4:9, 10. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Olee onyinye ndị Jehova nyere gị kacha amasị gị?

  • Olee otú i si ele Chineke anya maka onyinye ndị ahụ o nyere gị?

Mmadụ nye anyị onyinye dị anyị mma, anyị na-ekele ya. Gụọnụ Diuterọnọmi 16:17. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee ihe ị ga-enye Jehova ma i cheta ihe ọma niile o meere gị?

5. Mmadụ inyefe Jehova onwe ya na-eweta ọtụtụ ngọzi

Ọtụtụ ndị chere na ha ga na-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na ha abụrụ ndị a ma ama, na-arụ ezigbo ọrụ, ma ọ bụ nwee ego. Ihe a ha na-eche ọ̀ bụ eziokwu? Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Ọ bụ eziokwu na ịgba bọl na-atọ onye a anyị lere na vidio ụtọ, gịnị mere o ji kwụsị ịgba bọl?

  • Ọ kwụsịrị iji oge ya niile na-agba bọl ma nyefee Jehova onwe ya. Ì chere na ihe a o mere dị mma? Maka gịnị?

Tupu Pọl onyeozi aghọọ Onye Kraịst, ọ nọ na-agba mbọ ka ọ bụrụ onye a ma ama. Ọ bụ onye nkụzi a ma ama kụziiri ya gbasara iwu ndị Juu. Ma, ọ hapụrụ ihe niile ahụ ọ gụrụ bịa bụrụ Onye Kraịst. Ọ̀ kwara ụta maka ihe a o mere? Gụọnụ Ndị Filipaị 3:8. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Gịnị mere Pọl ji kwuo na ihe o mere tupu ya aghọọ Onye Kraịst bụ “ihe e kpofuru ekpofu”?

  • Olee uru o ritere maka na ọ ghọrọ Onye Kraịst?

  • Olee ihe i chere ga-eme ka ndụ gị nwee isi, ọ̀ bụ iji ya ejere Jehova ozi ka ọ̀ bụ iji ya eme ihe ndị ọzọ?

Ihe Pọl hapụrụ ghọọ Onye Kraịst enweghị ihe ọ bụ ma e jiri ya tụnyere uru o ritere

ỤFỌDỤ NA-ASỊ na mmadụ inyefe Chineke onwe ya abaghị uru.

  • Olee ihe i chere mere mmadụ inyefe Jehova onwe ya ji baa uru?

NCHỊKỌTA

Ịhụnanya anyị hụrụ Jehova na-eme ka anyị nyefee ya onwe anyị, meekwa baptizim.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Gịnị mere anyị ji kwesị iji obi anyị niile hụ Jehova n’anya ma na-efe ya?

  • Olee otú Jehova si agọzi Ndịàmà ya mere baptizim?

  • Ị̀ ga-achọ inyefe Jehova onwe gị?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Chọpụta ihe mere otu onye egwú na otu onye na-akụ bọl ji nyefee Jehova onwe ha.

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị​—Gịnị Ka M Ga-eji Ndụ M Mee?​—Ndụ M Biri na Mbụ (6:54)

Chọpụta ihe ndị ọzọ mere i kwesịrị iji nyefee Jehova onwe gị.

“Gịnị Mere I Ji Kwesị Ịrara Onwe Gị Nye Jehova?” (Ụlọ Nche, Jenụwarị 15, 2010)

Na vidio egwú a, chọpụta ụdị ọṅụ ndị nyefere Jehova onwe ha nwere.

M Na-enyefe Gị Ndụ M (4:30)

Gụọ isiokwu bụ́ “Kemgbe Ọtụtụ Afọ, M Na-eche, Sị, ‘Gịnị Mere Anyị Ji Dịrị Ndụ n’Ụwa A?’” ka ị hụ ihe mere otu nwaanyị ji chebara ihe kacha ya mkpa ná ndụ echiche.

“Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ” (Ụlọ Nche, Nọvemba 1, 2012)