ISI NKE 47
Ị̀ Dịla Njikere Ime Baptizim?
Ị marala ọtụtụ ihe gbasara Jehova kemgbe ị malitere ịmụ Baịbụl. O nwekwara ike ịbụ na ị gbanweela ihe ụfọdụ ná ndụ gị ka ị na-agba mbọ ime ihe ị na-amụta. Ma, ọ ga-abụ na e nwere ihe na-egbochi gị inyefe Jehova onwe gị na ime baptizim. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe ụfọdụ na-egbochi ndị mmadụ ime baptizim nakwa ihe ị ga-eme ka ha ghara igbochi gị ime baptizim.
1. Olee ihe ndị i kwesịrị ima tupu i mee baptizim?
Tupu gị emee baptizim, i kwesịrị ịma ‘eziokwu dị na Baịbụl nke ọma.’ (1 Timoti 2:4) Ọ pụtaghị na ị ga-ama azịza ajụjụ niile gbasara Baịbụl. Ndị Kraịst medịrị baptizim kemgbe ọtụtụ afọ amaghị ihe niile dị na Baịbụl. (Ndị Kọlọsi 1:9, 10) Ma, i kwesịrị ịma isi ihe Baịbụl na-akụzi. Ndị okenye ọgbakọ ga-enyere gị aka ịchọpụta ma ị̀ marala ihe ndị i kwesịrị ị mara.
2. Olee ihe ndị i kwesịrị ime tupu gị emee baptizim?
Tupu gị emee baptizim, i kwesịrị ‘ichegharị, lọghachikwutekwa Jehova.’ (Gụọ Ọrụ Ndịozi 3:19.) Ọ pụtara na ihe ọjọọ ndị i mere n’oge gara aga ga-ewuteru gị n’ọkpụkpụ, gị arịọ Jehova ka ọ gbaghara gị. Ị ga-ekpebisikwa ike na ị gaghịzi eme ihe ọjọọ nakwa na ị ga na-ebi ndụ otú Chineke si chọọ. Ihe ọzọ bụ na ị ga na-eso eme ihe ndị a na-eme n’ọgbakọ, ya bụ, ị ga na-aga ọmụmụ ihe, na-esokwa ụmụnna ndị ọzọ aga ozi ọma.
3. Gịnị mere na i kwesịghị ikwe ka ụjọ mee ka ị ghara ime baptizim?
Ụfọdụ ndị na-atụ ụjọ na ha agaghị emezuli nkwa ha kwere Jehova. N’ikwu eziokwu, ị ga-emehie ihe mgbe ụfọdụ, otú ahụ ndị fere Jehova, ndị Baịbụl kwuru gbasara ha mehiere ihe. Ma, Jehova anaghị atụ anya na o nweghị mgbe ndị na-efe ya ga-emehie ihe. (Gụọ Abụ Ọma 103:13, 14.) Obi ga-adị ya ụtọ ma ị na-eme ike gị. Ọ ga-enyere gị aka. O medịrị ka obi sie anyị ike na o nweghị ihe ga-eme “ka [ọ] kwụsị ịhụ anyị n’anya.”—Gụọ Ndị Rom 8:38, 39.
MỤTAKWUO IHE
Chọpụta otú ịmata Jehova nke ọma na ịnabata aka ọ na-enyere gị nwere ike isi mee ka ihe ọ bụla ghara igbochi gị ime baptizim.
4. Mata Jehova nke ọma
Olee otú ị ga-amaru Jehova tupu gị emee baptizim? I kwesịrị ịma ya nke ọma otú ga-eme ka ị hụ ya n’anya, chọọkwa ịna-erubere ya isi. Kpọnyenụ VIDIO a ka unu hụ otú ụfọdụ ndị Ndịàmà Jehova na-amụrụ Baịbụl n’ebe dị iche iche n’ụwa si mee ihe a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
-
Na vidio a anyị lere, olee ihe nyeere ụfọdụ ndị aka ijikere maka baptizim?
Gụọnụ Ndị Rom 12:2. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
-
Ò nwere ihe Baịbụl kwuru na-eme gị obi abụọ? Ị̀ na-enwe obi abụọ ma ihe Ndịàmà Jehova na-akụzi ọ̀ bụ eziokwu?
-
Ọ bụrụ na ihe ndị a na-eme gị obi abụọ, gịnị ka i nwere ike ime?
5. Ekwela ka ihe ọ bụla gbochie gị ime baptizim
Otu nsogbu ma ọ bụ ọzọ na-abịara onye ọ bụla n’ime anyị ma anyị kpebie inyefe Jehova onwe anyị na ime baptizim. Unu chọọ ịhụ otu onye ụdị ihe a mere, kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
-
Na vidio a anyị lere, olee nsogbu ndị mere ka ime ihe Jehova chọrọ siere Narangerel ike?
-
Olee otú otú ọ hụruru Jehova n’anya si mee ka nsogbu ndị ahụ ghara igbochi ya ịna-efe Jehova?
Gụọnụ Ilu 29:25 na 2 Timoti 1:7. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ a:
-
Gịnị mere obi ji sie anyị ike na e nweghị nsogbu ga-egbochili anyị ife Jehova?
6. Nabata aka Jehova na-enyere anyị
Jehova ga-enyere gị aka ịna-eme ihe dị ya mma. Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
-
Na vidio a anyị lere, gịnị mere na onye ahụ Ndịàmà Jehova na-amụrụ Baịbụl emeghị baptizim ozugbo?
-
Olee ihe ọ mụtara nke nyeere ya aka ịnabata aka Jehova na-enyere ya?
Gụọnụ Aịzaya 41:10, 13. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
-
Gịnị mere obi kwesịrị iji sie gị ike na ị ga-emezuli nkwa i kwere Jehova mgbe i nyefere ya onwe gị?
7. Na-ekele Jehova maka otú o si hụ anyị n’anya
Ị na-echebara otú Jehova si hụ anyị n’anya echiche, ị ga na-ekele ya maka ya, ị ga-achọkwa ịna-efe ya ruo mgbe ebighị ebi. Gụọnụ Abụ Ọma 40:5. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
-
Olee ihe ọma ndị Jehova na-emere anyị ndị kacha amasị gị?
Jeremaya onye amụma hụrụ Jehova n’anya, jirikwa okwu ya kpọrọ ihe. Obi dị ya ezigbo ụtọ na Jehova meere ya ihe ọma kwe ka ọ na-aza aha ya. Ọ sịrị: “Jehova Chineke . . . Okwu gị meziri ka m na-aṅụrị ọṅụ, obi ana-atọkwa m ụtọ, n’ihi na m na-aza aha gị.” (Jeremaya 15:16) Zaa ajụjụ ndị a:
-
Gịnị mere o ji bụrụ na ọ bụ ezigbo ihe ọma meere onye bụ́ Onyeàmà Jehova?
-
Ị̀ chọrọ ime baptizim ka ị bụrụ Onyeàmà Jehova?
-
È nwere ihe na-egbochi gị ime baptizim?
-
Gịnị ka i chere i kwesịrị ime ka i nwee ike mee baptizim?
ỤFỌDỤ NA-ASỊ na ha echeghị na ha ga-emeli ihe ya na baptizim so aga.
-
Ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ dị gị?
NCHỊKỌTA
Jehova nwere ike inyere gị aka ka ihe ọ bụla ghara igbochi gị ime baptizim.
Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ
-
Olee ebe ị ga-amaru ihe dị na Baịbụl tupu i mee baptizim?
-
Olee ihe ndị i kwesịrị ịgbanwe ná ndụ gị tupu i mee baptizim?
-
Gịnị mere na i kwesịghị ikwe ka ụjọ mee ka ị ghara ime baptizim?
IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA
Chọpụta ihe mere i kwesịrị iji mee baptizim.
Chọpụta otú ị ga-esi lụso nsogbu ụfọdụ ọgụ ka ha ghara igbochi gị ime baptizim.
Chọpụta ihe otu nwoke mere ka nsogbu ụfọdụ gbara ọkpụrụkpụ ghara igbochi ya ime baptizim.
Otu nwoke aha ya bụ Ataa nọ na-egbu oge ime baptizim. Chọpụta ihe mere o ji mechaa kpebie ime baptizim.