Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 50

Gịnị Ga-eme Ka Unu Na-enwe Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu?​—Nke 2

Gịnị Ga-eme Ka Unu Na-enwe Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu?​—Nke 2

Ụmụ bụ onyinye si n’aka Jehova. Ọ chọrọ ka ndị nne na nna na-elekọta ha nke ọma. Jehova gwara ha ihe ndị ga-enyere ha aka ịna-elekọta ụmụ ha. Ihe o kwuru ga-enye aka mee ka ụmụ na-eme ihe ga-eme ka a na-enwe obi ụtọ n’ezinụlọ ha.

1. Gịnị ka Jehova gwara ndị nne na nna ka ha na-eme?

Jehova chọrọ ka ndị nne na nna hụ ụmụ ha n’anya ma na-ewepụta oge buru ibu ha na ha ga-eji na-anọrị. Ọ chọkwara ka ha chebe ha ka ihe ọ bụla ghara ime ha nakwa ka ha jiri ihe Baịbụl kwuru na-azụ ha. (Ilu 1:8) Ọ gwara ndị nna, sị: “Na-azụnụ [ụmụ unu] . . . otú Jehova chọrọ.” (Gụọ Ndị Efesọs 6:4.) Obi na-adị Jehova ụtọ ma ndị nne na nna na-azụ ụmụ ha otú ọ gwara ha ma ghara ịhapụrụ ha onye ọzọ ka ọ zụwara ha.

2. Gịnị ka Jehova gwara ụmụ ka ha na-eme?

Jehova gwara ndị bụ́ ụmụ, sị: “Na-eruberenụ ndị mụrụ unu isi.” (Gụọ Ndị Kọlọsi 3:20.) Ọ bụrụ na ụmụ ana-asọpụrụ ma na-erubere ndị nne na nna ha isi, ha na-eme ma Jehova ma ndị nne na nna ha obi ụtọ. (Ilu 23:22-25) Otú Jizọs si kpaa àgwà mgbe ọ bụ obere nwa na-egosi ndị bụ́ ụmụ otú ha ga-esi na-akpa àgwà. N’agbanyeghị na o zuru okè, o rubeere nne ya na nna ya isi ma sọpụrụ ha.​—Luk 2:51, 52.

3. Olee ihe unu ga-eme ka ezinụlọ unu na Chineke dịrịkwuo ná mma?

Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, o doro anya na ị chọrọ ka ụmụ gị hụ Jehova n’anya otú gịnwa hụrụ ya. Olee otú ị ga-esi eme ka ha hụ ya n’anya? Ọ bụ ime ihe Baịbụl kwuru. Ọ sịrị: “Kụziere [ụmụ gị iwu Jehova] ka o ruo ha n’obi, na-ekwukwa banyere ha mgbe ị nọ ọdụ n’ụlọ gị na mgbe ị na-aga ije n’okporo ụzọ.” (Diuterọnọmi 6:7) Ihe a pụtara na ị ga na-akụziri ha ihe ugboro ugboro. O nwekwara ike ịbụ na ị ma na i kwesịrị ịgwa ụmụ gị ihe ugboro ugboro ka ha nwee ike na-echeta ya. Isi ihe amaokwu a na-ekwu bụ na i kwesịrị ịna-ewepụta oge mgbe niile na-akụziri ụmụ gị gbasara Jehova. Ezinụlọ kwesịrị ịna-ewepụta oge ha ga-eji na-amụ Baịbụl kwa izu. Ọ bụrụ na unu amụbeghị ụmụ, iwepụta oge unu ga-eji na-amụ Okwu Chineke kwa izu ga-abakwara unu uru.

MỤTAKWUO IHE

Chọpụta ụfọdụ ihe nwere ike ime ka obi ruo mmadụ niile nọ n’ezinụlọ unu ala, ha ana-enwekwa obi ụtọ.

4. Na-azụ ụmụ gị otú gosiri na ị hụrụ ha n’anya

Ịzụ ụmụ abụghị obere ọrụ. Olee otú Baịbụl nwere ike isi nyere gị aka? Gụọnụ Jems 1:19, 20. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Mgbe nne na nna na-agwa ụmụ ha okwu, olee otú ha ga-esi gosi na ha hụrụ ha n’anya?

  • Gịnị mere nne ma ọ bụ nna ekwesịghị ịdọ ụmụ ya aka ná ntị mgbe iwe ji ya? a

5. Chebe ụmụ gị

Otu ihe dị ezigbo mkpa ị ga-eme iji chebe ụmụ gị bụ ịgwa onye nke ọ bụla n’ime ha gbasara mmekọahụ. Ịgwa ha ya nwere ike isiri gị ike. Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Olee ihe o ji esiri ndị nne na nna ụfọdụ ike ịgwa ụmụ ha gbasara mmekọahụ?

  • Olee otú ndị nne na nna ụfọdụ si kụziere ụmụ ha gbasara mmekọahụ?

Dị ka e buru n’amụma, ka chi na-abọ ka ụwa Setan a na-adịwanye njọ. Gụọnụ 2 Timoti 3:1, 13. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Ụfọdụ ndị ajọ mmadụ e kwuru okwu ha n’amaokwu nke iri na atọ na-edina ụmụaka n’ike. N’ihi ya, gịnị mere ndị nne na nna kwesịrị iji kụziere ụmụ ha gbasara mmekọahụ nakwa ihe ha ga-eme ka a ghara idina ha n’ike?

Ị̀ ma ihe a?

Ndịàmà Jehova na-ewepụta vidio na akwụkwọ ndị na-enyere ndị nne na nna aka ịkụziri ụmụ ha gbasara mmekọahụ nakwa ichebe ha ka a ghara idina ha n’ike. Dị ka ihe atụ, kirie vidio a, gụọkwa akwụkwọ ndị a:

6. Na-asọpụrụ nne na nna gị

Ndị bụ́ ụmụ, ma hà ka dị obere ma hà dị afọ iri na ụma, ga-esi n’otú ha si agwa nne na nna ha okwu gosi na ha na-asọpụrụ ha. Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Olee ihe mere ndị na-eto eto ekwesịghị iji olu ike na-agwa nne na nna ha okwu?

  • Olee otú ndị na-eto eto nwere ike isi na-agwa nne na nna ha okwu otú gosiri na ha na-akwanyere ha ùgwù?

Gụọnụ Ilu 1:8. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee ihe onye na-eto eto kwesịrị ime ma nne na nna ya gwa ya ihe ọ ga-eme?

7. Na-efekọnụ Jehova ọnụ n’ezinụlọ unu

Ezinụlọ Ndịàmà Jehova na-ewepụta oge a kapịrị ọnụ kwa izu na-efekọ Jehova ọnụ. Gịnị ka e nwere ike ime n’ofufe ezinụlọ a? Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Olee ihe ga-enyere ezinụlọ dị iche iche aka ịna-enwechi ofufe ezinụlọ anya?

  • Gịnị ka nne ma ọ bụ nna nwere ike ime ka ofufe ezinụlọ na-abara ndị ezinụlọ ya uru, na-atọkwa ha ụtọ?​—Lee foto dị ná mmalite isiokwu a.

  • Gịnị nwere ike ime ka o siere unu ike ịna-enwechi ofufe ezinụlọ anya?

N’Izrel oge ochie, Jehova gwara ezinụlọ dị iche iche ka ha na-ekwurịta ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ mgbe niile. Gụọnụ Diuterọnọmi 6:6, 7. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee otú unu nwere ike isi na-eme ihe ebe a kwuru?

Ihe ndị unu nwere ike ime n’ofufe ezinụlọ:

  • Mụọnụ ihe a ga-amụ n’ọmụmụ ihe ọgbakọ.

  • Gụọnụ otu akụkọ dị na Baịbụl nke ga-atọ unu ụtọ ma kwurịtanụ ihe unu mụtara na ya.

  • Ọ bụrụ na i nwere obere ụmụaka, gaa na jw.org bipụta ma ọ bụ were otu n’ime ihe ndị dị ebe ahụ e ji akụziri ụmụaka Baịbụl.

  • Ọ bụrụ na i nwere ndị nọ n’afọ iri na ụma, gaanụ na jw.org mụọ otu isiokwu kwuru gbasara ndị na-eto eto.

  • Gị na ụmụ gị jiri otu akụkọ dị na Baịbụl mee drama.

  • Leenụ otu vidio dị na jw.org, kwurịtakwanụ ihe unu mụtara na ya.

ỤFỌDỤ NA-ASỊ na ihe dị na Baịbụl na-esiri ụmụaka ike nghọta.

  • Gịnị ka ị ga-agwa onye kwuru ụdị ihe a?

NCHỊKỌTA

Jehova chọrọ ka ndị nne na nna hụ ụmụ ha n’anya, na-azụ ha, ma na-echebe ha. Ọ chọrọ ka ụmụ na-asọpụrụ ndị nne na nna ha ma na-erubere ha isi. Ọ chọkwara ka ndị niile nọ n’ezinụlọ na-efekọ ya ọnụ.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Olee otú ndị nne na nna nwere ike isi na-azụ ụmụ ha, na-echebekwa ha?

  • Olee otú ụmụ nwere ike isi gosi na ha na-asọpụrụ nne na nna ha?

  • Olee uru ezinụlọ ga-erite ma ha wepụta oge ha ga na-eji enwe ofufe ezinụlọ kwa izu?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Olee ihe ndị nwa gị kwesịrị ịma ga-enyere ya aka mgbe ọ ga-eto?

“Ihe Isii Ụmụaka Kwesịrị Ịmụta” (Teta! Nke 2 2019)

Ọ bụrụ na e nwere ndị na-elekọta ndị nne na nna ha mere agadi, chọpụta ihe Baịbụl kwuru ga-enyere ha aka.

“Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Ilekọta Ndị Nne na Nna Merela Agadi?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)

Chọpụta otú otu nwoke na-amaghị azụ ụmụ si mechaa zụọ ụmụ ya, ha etoo na-eme nke ọma n’ọgbakọ.

Jehova Kụziiri Anyị Otú Anyị Ga-esi Zụọ Ụmụ Anyị (5:58)

Chọpụta otú ndị nna na ụmụ ha ndị nwoke ga-esi na-adị n’ezigbo mma.

“Olee Otú Ndị Nna na Ụmụ Ha Ndị Nwoke Ga-esi Na-adị n’Ezigbo Mma?” (Ụlọ Nche, Nọvemba 1, 2011)

a Na Baịbụl, “ịdọ aka ná ntị” pụtara ịdụ mmadụ ọdụ, ịkụziri ya ihe, na ịgwa ya ihe ọ na-emetaghị ka o nwee ike mezie ya. Ọ pụtaghị ichi mmadụ ọnụ n’ala ma ọ bụ ịrụsa ya arụrụala.​—Ilu 4:1.