Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 54

Ọrụ “Ohu ahụ Kwesịrị Ntụkwasị Obi, Onye Nwekwara Uche” Na-arụ

Ọrụ “Ohu ahụ Kwesịrị Ntụkwasị Obi, Onye Nwekwara Uche” Na-arụ

Jizọs bụ onyeisi ọgbakọ Ndị Kraịst. (Ndị Efesọs 5:23) N’oge anyị a, ọ nọ n’eluigwe si n’aka “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” na-edu ndị na-eso ụzọ ya nọ n’ụwa. (Gụọ Matiu 24:45.) “Ohu” ahụ nwere ikike ime ihe ụfọdụ n’ihi na ọ bụ Jizọs ji aka ya họpụta ya. N’agbanyeghị ikike a o nwere, ọ ka bụ ohu Kraịst, na-arụkwara ụmụnna Kraịst ọrụ. Ònye bụ ohu ahụ? Olee otú o si elekọta anyị?

1. Ònye bụ “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche”?

Kemgbe ụwa, Jehova na-eji otu onye ma ọ bụ mmadụ ole na ole edu ndị ya. (Malakaị 2:7; Ndị Hibru 1:1) Mgbe Jizọs nwụchara, ndịozi ya na ndị okenye nọ na Jeruselem malitere idu Ndị Kraịst. (Ọrụ Ndịozi 15:2) Ụdị ihe ahụ na-emekwa taa n’ihi na ọ bụ ndị okenye ole na ole na-akụziri Ndị Kraịst Okwu Chineke, na-eduzikwa ozi ọma ha na-ekwusa. A na-akpọ ha Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova. Ọ bụ ha bụ “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, onye [Jizọs] mere onye na-elekọta ezinụlọ ya.” (Matiu 24:45a) Ndị niile so n’Òtù Na-achị Isi bụ Ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ. Ha nwekwara olileanya na ha nwụọ, ha ga-agakwuru Kraịst n’eluigwe soro ya na-achị n’Alaeze ya.

2. Olee otú ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi si akụziri anyị Okwu Chineke?

Jizọs kwuru na ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi ga “na-enye [Ndị Kraịst ibe ya] nri ha n’oge kwesịrị ekwesị.” (Matiu 24:45b) Otú ahụ nri nkịtị anyị na-eri si eme ka anyị gbasie ike ka nri ohu ahụ na-enye anyị na-emekwa. Nri ahụ ọ na-enye anyị bụ Okwu Chineke. Ọ na-eme ka anyị mụta irubere Jehova isi, nweekwa ike ịna-arụ ọrụ Jizọs nyere anyị. (1 Timoti 4:6) A na-enye anyị nri ahụ ma anyị gaa ọmụmụ ihe, mgbakọ sekit na mgbakọ ukwu. Anyị na-enwetakwa ya ma anyị gụọ akwụkwọ dị iche iche e ji amụ Baịbụl ma ọ bụkwanụ lee vidio ndị na-enyere anyị aka ịghọta ihe Chineke chọrọ ka anyị na-eme nakwa ime ka anyị na ya dịrị ná mma na-aga.

MỤTAKWUO IHE

“Ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche,” ya bụ, Òtù Na-achị Isi na-elekọta anyị. Chọpụta otú nlekọta a ọ na-elekọta anyị si dị mma.

Òtù Na-achị Isi na-akụziri Ndịàmà Jehova nọ n’ụwa niile okwu Chineke, na-eduzi ha ma na-enyere ha aka n’ụzọ dị iche iche

3. E kwesịrị ịhazi ndị ohu Jehova ahazi

Jizọs si n’aka Òtù Na-achị Isi na-ahazi ọrụ Ndịàmà Jehova na-arụ. Otú a e si ahazi ọrụ Ndịàmà Jehova ka e si hazie ọrụ Ndị Kraịst oge mbụ. Kpọnyenụ VIDIO a.

Gụọnụ 1 Ndị Kọrịnt 14:33, 40. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee otú amaokwu ndị a si gosi na Jehova chọrọ ka a hazie Ndịàmà ya ahazie?

4. Ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na-ahazi ozi ọma anyị na-ekwusa

Ikwusa ozi ọma bụ ọrụ kacha mkpa n’ọrụ niile Ndị Kraịst oge mbụ rụrụ. Gụọnụ Ọrụ Ndịozi 8:14, 25. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Olee ndị nọ na-enye Ndị Kraịst oge mbụ ntụziaka gbasara otú ha ga-esi na-ekwusa ozi ọma?

  • Olee ihe Pita na Jọn mere mgbe ndịozi ndị ọzọ gwara ha ihe ha ga-eme?

N’ọrụ niile Òtù Na-achị Isi na-ahazi, nke kacha mkpa bụ ịhazi ọrụ ikwusa ozi ọma. Kpọnyenụ VIDIO a.

Jizọs gosiri na ikwusa ozi ọma dị ezigbo mkpa. Gụọnụ Mak 13:10. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Gịnị mere ikwusa ozi ọma ji dị Òtù Na-achị Isi ezigbo mkpa?

  • Gịnị mere o ji dị mma ka “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” na-ahazi ozi ọma a a na-ekwusa n’ụwa niile?

5. Ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na-ekwu ihe a ga-eme

Òtù Na-achị Isi na-agwa Ndị Kraịst nọ n’ụwa niile ihe ha ga-eme. Olee otú ha si ekpebi ihe ha ga-agwa ha? Chọpụta otú òtù na-achị isi nke Ndị Kraịst oge mbụ si kpebie ihe ha gwara Ndị Kraịst n’oge ahụ. Gụọnụ Ọrụ Ndịozi 15:1, 2. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Olee ihe mere Ndị Kraịst oge mbụ na ibe ha ji nwewe nghọtahie?

  • Ole ndị ka Pọl, Banabas, na ndị ọzọ gakwuuru ka ha dozie nghọtahie ahụ?

Gụọnụ Ọrụ Ndịozi 15:12-18, 23-29. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Mgbe òtù na-achị isi nke Ndị Kraịst oge mbụ chọrọ ikpebi ihe a ga-eme, gịnị ka ha bu ụzọ mee ka ha nwee ike ịmata ihe bụ́ uche Chineke gbasara okwu ha kpụ n’ọnụ?​—Leruonụ anya n’amaokwu nke 12, 15, na nke 28.

Gụọnụ Ọrụ Ndịozi 15:30, 31 na 16:4, 5. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Gịnị ka Ndị Kraịst oge mbụ mere mgbe òtù na-achị isi gwara ha ihe ha ga-eme?

  • Olee otú Jehova si gọzie ha maka isi ha rubeere òtù na-achị isi?

Gụọnụ 2 Timoti 3:16 na Jems 1:5. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • N’oge anyị a, gịnị na gịnị na-enyere Òtù Na-achị Isi aka ikpebi ihe a ga-eme?

ỤFỌDỤ NA-ASỊ na ọ bụ ndị mmadụ ka ị na-eso ụzọ ha ma ọ bụrụ na ị na-erubere Òtù Na-achị Isi isi.

  • Gịnị mere i ji kweta na ọ bụ Jizọs na-eduzi Òtù Na-achị Isi?

NCHỊKỌTA

Ọ bụ Òtù Na-achị Isi bụ “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” Kraịst họpụtara. Ha na-agwa Ndị Kraịst nọ n’ụwa niile ihe ha ga-eme, na-akụzikwara ha okwu Chineke.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Ònye họpụtara “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche”?

  • Olee otú Òtù Na-achị Isi si elekọta anyị?

  • Ì kwetara na Òtù Na-achị Isi bụ “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche”?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Chọpụta otú e si hazie Òtù Na-achị Isi ịrụ ọrụ ha.

“Olee Otú E Si Hazie Òtù Na-achị Isi?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)

Chọpụta otú Òtù Na-achị Isi si agba mbọ ịhụ na okwu Chineke a na-akụziri anyị bụ eziokwu.

Ibipụta Akwụkwọ Ihe Ndị E Dere na Ha Bụ Eziokwu (17:18)

Olee otú ndị so n’Òtù Na-achị Isi si ele ọrụ ahụ Jizọs nyere ha anya?

Ihe Ọma Anyị Na-ejighị Egwu Egwu (7:04)

Olee otú ọmụmụ ihe anyị na mgbakọ anyị si egosi na ọ bụ Jehova na-eduzi ọrụ Òtù Na-achị Isi na-arụ?

Jehova Na-akụziri Ndị Ya Ihe (9:39)