Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 57

Gịnị Ka I Kwesịrị Ime ma I Mee Mmehie Dị Oké Njọ?

Gịnị Ka I Kwesịrị Ime ma I Mee Mmehie Dị Oké Njọ?

N’agbanyeghị na ị na-agbasi mbọ ike ka ị ghara ime ihe ọ bụla ga-ewute Jehova n’ihi na ị hụrụ ya nnọọ n’anya, ọ ka nwere mgbe ụfọdụ i nwere ike ime ihe na-adịghị ya mma. Ma, mmehie ụfọdụ dị njọ karịa ibe ha. (1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10) I mee mmehie dị oké njọ, cheta na Jehova ka hụrụ gị n’anya. Ọ dị njikere ịgbaghara gị, dịkwa njikere inyere gị aka.

1. Gịnị ka anyị ga-eme ka Jehova gbaghara anyị?

Obi na-agbawa ndị hụrụ Jehova n’anya ma ha chọpụta na ha emeela mmehie dị oké njọ. Ma, nkwa Jehova kwere ndị ya na-akasi ha obi. Ọ sịrị: “Ọ bụrụgodị na mmehie unu na-acha uhie uhie, m ga-eme ka ọ na-acha ezigbo ọcha.” (Aịzaya 1:18) Ọ bụrụ na anyị esi n’ala ala obi anyị chegharịa, Jehova ga-agbaghara anyị kpamkpam. Olee otú anyị si egosi na anyị echegharịala? Ihe anyị mere na-ewute anyị nke ukwuu, anyị akwụsị ime ya ma rịọ Jehova ka ọ gbaghara anyị. Anyị na-agbazi mbọ kwụsị ịna-eche ma ọ bụ ime ihe ọ bụla ga-eme ka anyị mee ihe ọjọọ ahụ ọzọ. Anyị na-agbalịkwa na-ebi ndụ dị mma otú Jehova chọrọ.​—Gụọ Aịzaya 55:6, 7.

2. Olee otú Jehova si eji ndị okenye enyere anyị aka mgbe anyị mere mmehie?

Ọ bụrụ na anyị eme mmehie dị oké njọ, Jehova na-agwa anyị ka anyị “kpọọ ndị okenye ọgbakọ.” (Gụọ Jems 5:14, 15.) Ndị okenye ọgbakọ hụrụ ma Jehova ma ndị na-efe ya n’anya. A zụọla ha otú ha ga-enwe ike inyere anyị aka ka anyị na Jehova dịghachi ná mma.​—Ndị Galeshia 6:1.

Olee otú ndị okenye si enyere anyị aka ma anyị mee mmehie dị oké njọ? Okenye abụọ ma ọ bụ atọ ga-eji Baịbụl gosi anyị ihe mere ihe ahụ anyị mere ji dị njọ. Ha ga-atụkwara anyị aro ndị ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ime mmehie ahụ ọzọ. Ha nwekwara ike ịgwa anyị ihe ndị anyị na-agaghị na-eme n’ọgbakọ ruo mgbe anyị na Jehova dịghachichara ná mma. Ọ bụrụ na mmadụ emee mmehie dị oké njọ ma jụ ichegharị, ndị okenye na-achụpụ ya n’ọgbakọ ka ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ghara imewe ka ya.

MỤTAKWUO IHE

Chọpụtakwuo otú Jehova si enyere anyị aka ma anyị mee mmehie dị oké njọ ka i nwee ike na-ekele ya maka ya.

3. Ikwupụta mmehie anyị na-eme ka anyị na Jehova dịghachi ná mma

Mmehie ọ bụla anyị mere na-ewute Jehova, ọ bụ ya mere anyị ji kwesị ikwupụtara ya mmehie anyị. Gụọnụ Abụ Ọma 32:1-5. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Gịnị mere ikwupụtara Jehova mmehie anyị ji dị mma kama izochiwe ya?

E wezụga ikwupụtara Jehova mmehie anyị, ihe ọzọ ga-eme ka ahụ́ ruo anyị ala bụ ịgakwuru ndị okenye ka ha nyere anyị aka. Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Na vidio a anyị lere, olee otú ndị okenye si nyere Canon aka ịlọghachikwute Jehova?

Anyị kwesịrị ịgwa ndị okenye ihe niile merenụ. Ha agaghị egbu anyị egbu. Kama, ha ga-enyere anyị aka. Gụọnụ Jems 5:16. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee otú ịgwa ndị okenye ihe niile merenụ ga-esi mee ka inyere anyị aka dịrị ha mfe?

Kwupụta mmehie gị, gwa ndị okenye eziokwu, nabatakwa aka Jehova na-enyere gị maka na ọ hụrụ gị n’anya

4. Uru ịchụ mmadụ n’ọgbakọ bara

Ọ bụrụ na onye mere mmehie dị oké njọ ajụ ichegharị, a gaghị ahapụ ya n’ọgbakọ. A na-achụ ya n’ọgbakọ. Anyị na ya agaghịzi na-emekọrịta ihe ma ọ bụ na-ekwurịta okwu. Gụọnụ 1 Ndị Kọrịnt 5:6, 11 na 2 Jọn 9-11. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • E nwere ike iji onye mere mmehie dị oké njọ nke nọ n’ọgbakọ tụnyere ihe na-eko achịcha nke na-eme ka ntụ ọka koo. Gịnị nwere ike ime ndị nọ n’ọgbakọ ma ha na ya na-akpa?

E nweela ọtụtụ ndị a chụrụ n’ọgbakọ ma ha emechaa lọghachikwa. Ọ bụ eziokwu na ọ dịrịghị ha mfe na a chụrụ ha n’ọgbakọ, ma, o mere ka ha chegharịa. (Abụ Ọma 141:5) Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Na vidio a anyị lere, olee otú ọchụchụ a chụrụ Sonja n’ọgbakọ si baara ya uru?

Olee otú ịchụ mmadụ n’ọgbakọ si . . .

  • eme ka a na-eto Jehova?

  • egosi na Jehova na-ekpe ikpe ziri ezi, hụkwa anyị n’anya?

5. Jehova na-agbaghara anyị ma anyị chegharịa

Jizọs mere ihe atụ gosiri anyị otú obi na-adị Jehova ma mmadụ chegharịa. Gụọnụ Luk 15:1-7. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Gịnị ka ihe ebe a kwuru na-akụziri gị gbasara Jehova?

Gụọnụ Ezikiel 33:11. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Gịnị ka mmadụ ga-eme nke ga-egosi na o chegharịala n’eziokwu?

Jehova na-elekọta atụrụ ya otú ahụ onye ọzụzụ atụrụ na-eme

ỤFỌDỤ NA-ASỊ na ụjọ ha bụ na a ga-achụ ha n’ọgbakọ ma ha gwa ndị okenye mmehie ha mere.

  • Gịnị ka ị ga-agwa onye na-atụ ụdị ụjọ a?

NCHỊKỌTA

Anyị mee mmehie dị oké njọ ma si n’ala ala obi anyị chegharịa, kpebiekwa na anyị agaghị eme ihe ahụ ọzọ, Jehova ga-agbaghara anyị.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Gịnị mere o ji dị mma ka anyị kwupụtara Jehova mmehie anyị?

  • Gịnị ka anyị ga-eme ka Jehova nwee ike ịgbaghara anyị mmehie anyị?

  • Anyị mee mmehie dị oké njọ, gịnị mere anyị ji kwesị ịgakwuru ndị okenye ka ha nyere anyị aka?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Chọpụta otú Jehova si meere otu nwoke ụdị ebere Aịzaya 1:18 kwuru gbasara ya.

Ya Emekwala Gị Obi Abụọ ma Jehova Ọ̀ Ga-emere Gị Ebere (5:02)

Olee uru ịchụ mmadụ n’ọgbakọ nwere ike ịbara ndị niile ihe ahụ merenụ gbasara?

“Ihe Mere Ịchụpụ Mmadụ n’Ọgbakọ Ji Egosi na Chineke Hụrụ Anyị n’Anya” (Ụlọ Nche, Eprel 15, 2015)

Chọpụta otú i nwere ike isi kọwaara onye na-abụghị Onyeàmà Jehova ihe mere anyị ji achụ mmadụ n’ọgbakọ mgbe ụfọdụ.

“Ndịàmà Jehova Hà Na-agbara Ndị Na-abụghịzi Ndị Òtù Ha Ọsọ?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)

Gụọ isiokwu bụ́ “Achọpụtara M na M Kwesịrị Ịlọghachikwute Jehova” ka ị hụ ihe mere otu nwoke hapụrụ ọgbakọ ji kwuo na ọ bụ Jehova kpọghachiri ya.

“Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ” (Ụlọ Nche, Eprel 1, 2012)