Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 59

Ị Ga-atachili Obi Mgbe A Na-akpagbu Gị

Ị Ga-atachili Obi Mgbe A Na-akpagbu Gị

Ndị mmadụ na-emegide Ndị Kraịst. Ha na-akpagbudị ha. Ọ bụrụ na ha akpagbughị anyị taa, ha ka ga-akpagbu anyị echi. Ihe a ò kwesịrị ime ka ụjọ tụwa anyị?

1. Olee ihe mere anyị ji atụ anya na a ga-akpagbu anyị?

Baịbụl kwuru hoo haa, sị: “A ga-akpagbukwa ndị niile na-ebi ndụ otú na-egosi na ha na-eso ụzọ Kraịst Jizọs, na-efekwa Chineke otú ọ chọrọ.” (2 Timoti 3:12) A kpagburu Jizọs n’ihi na ọ bụghị nke ụwa a Setan na-achị. Anyịnwa abụghịkwa nke ụwa. Ọ bụ ya mere na ọ naghị eju anyị anya ma ndị ọchịchị ma ọ bụ ndị okpukpe kpagbuwe anyị.​—Jọn 15:18, 19.

2. Olee otú anyị nwere ike isi jikere maka mkpagbu?

Ugbu a bụ oge anyị kwesịrị ịbịakwu Jehova nso. Kwa ụbọchị, wepụta oge gwa ya okwu n’ekpere, wepụtakwa oge gụọ Okwu ya. Na-agachi ọmụmụ ihe anya. Ihe ndị a ga-eme ka i nwee obi ike ma kwụsie ike mgbe a na-akpagbu gị, ya sọkwa ya ya bụrụ ndị ezinụlọ unu na-akpagbu gị. Pọl onyeozi, bụ́ onye mkpagbu zooro ka mmiri, dere, sị: “Jehova bụ onye na-enyere m aka. Agaghị m atụ egwu.”​—Ndị Hibru 13:6.

Ihe ọzọ ga-enyere anyị aka inwekwu obi ike bụ izi ndị mmadụ ozi ọma mgbe niile. Izi ndị ọzọ ozi ọma na-eme ka anyị tụkwasị Jehova obi, meekwa ka anyị ghara ịna-atụ mmadụ ụjọ. (Ilu 29:25) Ọ bụrụ na ị na-akata obi ezi ozi ọma ugbu a, ọ ga-enyere gị aka ịdị ezigbo njikere izi ndị mmadụ ozi ọma n’ọdịnihu ọ bụrụgodị na ndị ọchịchị amachie anyị izi ozi ọma.​—1 Ndị Tesalonaịka 2:2.

3. Olee uru mkpagbu na-abara anyị?

Nke bụ́ eziokwu bụ na mkpagbu anaghị atọ anyị ụtọ. Ma, okwukwe anyị na-esikwu ike mgbe ọ bụla anyị diri mkpagbu. Anyị na Jehova na-adịkwu ná mma maka na anyị hụrụ otú o si nyere anyị aka mgbe anyị chere na nke anyị na-eme agwụla. (Gụọ Jems 1:2-4.) Ahụhụ anyị na-ata na-ewute Jehova. Ma, anyị tachie obi, obi na-atọ ya ụtọ. Baịbụl sịrị: “Ọ bụrụ na unu na-atachi obi mgbe a na-ata unu ahụhụ maka na unu mere ihe dị mma, ọ na-amasị Chineke.” (1 Pita 2:20) Anyị tachie obi ruo ọgwụgwụ, Jehova ga-eji ndụ ebighị ebi kwụọ anyị ụgwọ. N’oge ahụ, a gaghịzi na-akpagbu anyị maka na anyị na-efe ya.​—Matiu 24:13.

MỤTAKWUO IHE

Chọpụta ihe mere o ji bụrụ na anyị ga-atachili obi mgbe a na-akpagbu anyị. Chọpụtakwa otú Jehova ga-esi kwụọ anyị ụgwọ ma anyị tachie obi.

4. Ị ga-atachili obi mgbe ndị ezinụlọ unu na-akpagbu gị

Ihe Jizọs kwuru gosiri na ọ ma na obi agaghị adị ụfọdụ ndị ezinụlọ anyị ụtọ ma anyị kpebie ife Jehova. Gụọnụ Matiu 10:34-36. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Mmadụ malite ife Jehova, gịnị ka ụfọdụ ndị ezinụlọ ha nwere ike ime?

Unu chọọ ịhụ ihe ndị ezinụlọ mmadụ nwere ike ime, kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Gịnị ka i nwere ike ime ma onye ezinụlọ unu ma ọ bụ enyi gị gwa gị ka ị kwụsị ife Jehova?

Gụọnụ Abụ Ọma 27:10 na Mak 10:29, 30. Unu gụchaa nke ọ bụla, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee otú ihe ebe a kwuru nwere ike isi nyere gị aka ma ọ bụrụ na ndị ezinụlọ unu ma ọ bụ ndị enyi gị na-akpagbu gị?

5. Nọgide na-efe Jehova n’agbanyeghị mkpagbu

Ihe ga-enyere anyị aka ịnọgide na-efe Jehova mgbe a na-akpagbu anyị bụ inwe obi ike. Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee otú ihe ụmụnna mere na vidio a si eme ka obi sie gị ike?

Gụọnụ Ọrụ Ndịozi 5:27-29 na Ndị Hibru 10:24, 25. Unu gụchaa nke ọ bụla, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Gịnị mere anyị kwesịrị iji nọgide na-efe Jehova ọ bụrụgodị na a machiri anyị ikwusa ozi ọma ma ọ bụ ịga ọmụmụ ihe?

6. Jehova ga-enyere gị aka ịtachi obi

Ọ bụrụgodị na a na-akpagbu Ndịàmà Jehova, ma ụmụaka ha ma ndị okenye ha na-eji obi ha niile efe Jehova. Unu chọọ ịhụ ihe na-enyere ha aka, kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Gịnị nyeere Ndịàmà Jehova ndị a anyị lere na vidio aka ịtachi obi?

Gụọnụ Ndị Rom 8:35, 37-39 na Ndị Filipaị 4:13. Unu gụchaa nke ọ bụla, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee otú ebe a anyị gụrụ si eme ka obi sie gị ike na i nwere ike idi ọnwụnwa ọ bụla bịaara gị?

Gụọnụ Matiu 5:10-12. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Gịnị mere i kwesịrị iji na-enwe obi ụtọ ọ bụrụgodị na a na-akpagbu gị?

E nweela ọtụtụ nde Ndịàmà Jehova tachiri obi mgbe a na-akpagbu ha. Ị ga-atachili obi ka ha

ỤFỌDỤ NA-ASỊ na ha agaghị atachili obi ma a kpagbuwe ha.

  • Olee amaokwu Baịbụl i chere nwere ike ime ka obi sie ha ike na ha ga-atachili obi?

NCHỊKỌTA

Jehova ji mbọ anyị na-agba ife ya kpọrọ ihe, ọ bụrụgodị na a na-akpagbu anyị. Ọ ga-enyere anyị aka ịtachi obi.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Gịnị mere Ndị Kraịst ji atụ anya na a ga-akpagbu ha?

  • Olee ihe i nwere ike ime ugbu a iji jikere maka mkpagbu?

  • Olee ihe nwere ike ime ka obi sie gị ike na ị ga-anọgideli na-efe Jehova n’agbanyeghị ụdị mkpagbu ọ bụla?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Lee vidio a ka ị hụ ihe otu nwa okorobịa kwuru nyeere ya aka ịtachi obi mgbe a tụrụ ya mkpọrọ maka na ọ jụrụ ịga agha.

Na-atachi Obi n’Agbanyeghị Mkpagbu (2:34)

Chọpụta ihe nyeere otu nwoke na nwunye ya aka iji obi ha niile na-efe Jehova ruo ọtụtụ afọ n’agbanyeghị mmegide.

Ijere Jehova Ozi n’Oge Ọtụtụ Ihe Na-agbanwe (7:11)

Chọpụta ihe ga-eme ka i nwee obi ike mgbe a na-akpagbu gị.

“Jikere Ugbu A Maka Mkpagbu” (Ụlọ Nche, Julaị 2019)

Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele mkpagbu ndị ezinụlọ anyị na-akpagbu anyị anya. Oleekwa ihe anyị ga-eme ka ọ ghara ime ka anyị kwụsị ife Jehova?

“Eziokwu Na-eweta ‘Ọ Bụghị Udo, Kama Mma Agha’” (Ụlọ Nche, Ọktoba 2017)