Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 60

Nọgide Na-eme Ka Gị na Jehova Na-adị ná Mma

Nọgide Na-eme Ka Gị na Jehova Na-adị ná Mma

Kemgbe anyị bidoro ịmụ akwụkwọ a, ị mụtala ọtụtụ ihe gbasara Jehova. Ihe ndị ị mụtara emeela ka ị hụ ya n’anya, nke na o nwere ike ịbụ na i nyefeela ya onwe gị, meekwa baptizim ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na i bu n’obi ime ha n’oge na-adịghị anya. Ma, ọ bụghị i mechaa baptizim, gị akwụsị ime ka gị na Chineke na-adịkwu ná mma. Ị ga na-agba mbọ ka gị na Jehova na-adị ná mma ruo mgbe ebighị ebi. Olee otú ị ga-esi eme ya?

1. Gịnị mere i kwesịrị iji na-agba mbọ ka gị na Jehova na-adịkwu ná mma?

Anyị chọọ ka anyị na Jehova na-adịkwu ná mma, anyị ga na-agbasi mbọ ike. Maka gịnị? Ọ bụ ‘ka a ghara inwe mgbe anyị ga-ahapụ ya kpafuo.’ (Ndị Hibru 2:1) Gịnị nwere ike inyere anyị aka ka anyị jiri obi anyị niile na-efe Jehova? Anyị nwere ike ịgba mbọ na-ekwusakwu ozi ọma, chọtakwa ụzọ ndị ọzọ anyị ga-esi na-ejekwuru Chineke ozi. (Gụọ Ndị Filipaị 3:16.) Ijere Jehova ozi bụ ihe kacha mma anyị nwere ike ime ná ndụ.​—Abụ Ọma 84:10.

2. Olee ihe ọzọ i kwesịrị ịna-eme?

Ọ bụ eziokwu na ọ gaghị adị anya gị amụchaa akwụkwọ a, ma, ị ka ga-abụ Onye Kraịst na-aga. Baịbụl kwuru na anyị kwesịkwara “iyiri àgwà ọhụrụ.” (Ndị Efesọs 4:23, 24) Ka ị na-amụkwu Okwu Chineke ma na-aga ọmụmụ ihe, ị ga-amụtakwu ọtụtụ ihe gbasara Jehova na ọtụtụ àgwà e ji mara ya. Chọpụta ụzọ dị iche iche ị ga-esi na-akpakwu àgwà ka ya ná ndụ gị. Na-agbanwekwa ihe ọ bụla i kwesịrị ịgbanwe ná ndụ gị ka i nwee ike ịna-eme Jehova obi ụtọ.

3. Olee otú Jehova ga-esi enyere gị aka ná mbọ ị na-agba ka gị na ya dịrị ná mma?

Baịbụl kwuru, sị: “Chineke . . . ga-azụru unu n’isi. Ọ ga-eme ka unu kwụsie ike. Ọ ga-eme ka unu sie ike, meekwa ka unu kwụrụ chịm.” (1 Pita 5:10) A na-anwa anyị niile ime ihe ọjọọ mgbe ụfọdụ. Ma, Jehova na-enye anyị ihe niile ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ime ihe ọjọọ. (Abụ Ọma 139:23, 24) O kwere nkwa na ya ga-eme ka i nwee mmasị ịna-efe ya, nyekwa gị ike ị ga-eji na-efe ya nke ọma.​—Gụọ Ndị Filipaị 2:13.

MỤTAKWUO IHE

Chọpụta ihe ga-enyere gị aka ime ka gị na Jehova dịkwuo ná mma nakwa otú ọ ga-esi gọzie gị.

4. Nọgide na-agwa ezigbo enyi gị okwu ma na-ege ya ntị

Ikpe ekpere na ịmụ Baịbụl enyerela gị aka gị na Jehova abụrụ enyi. Olee otú ha ga-esi mee ka gị na ya na-adịkwu ná mma?

Gụọnụ Abụ Ọma 62:8. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Ebe ọ bụ na ekpere ga-eme ka gị na Jehova na-adịkwu ná mma, olee ihe i nwere ike ime ka ekpere gị na-erijukwu afọ?

Gụọnụ Abụ Ọma 1:2. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Ebe ọ bụ na ịgụ Baịbụl ga-eme ka gị na Jehova na-adịkwu ná mma, olee otú i nwere ike isi na-agụ Baịbụl otú ga-abara gị uru?

Olee ihe i nwere ike ime ka otú i si amụ ihe n’onwe gị bakwuoro gị uru? Unu chọọ ịhụ ihe ụfọdụ mmadụ nwere ike ime, kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Olee ụfọdụ ihe e kwuru na vidio a i nwere ike ime ma ị mụwa Baịbụl n’onwe gị?

  • Olee isiokwu ndị ị ga-achọ ịmụ gbasara ha ma ị mụwa ihe?

5. Kpebie ihe ndị ị ga-eme n’ozi Jehova

Ikpebi ihe ndị ị ga-eme n’ozi Jehova ga-eme ka gị na ya dịkwuo ná mma. Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Na vidio a anyị lere, olee uru Cameron ritere maka na o kpebiri ihe ọ ga-eme n’ozi Jehova?

Ọ bụghị mmadụ niile ga-akwagali obodo ọzọ kwusawa ozi ọma. Ma, onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike ikpebi ihe ọ ga-emeli n’ozi Jehova. Gụọnụ Ilu 21:5. Unu gụchaa ya, chee ma è nwere ihe ị ga-ekpebi ime . . .

  • n’ọgbakọ unu.

  • n’ozi ọma.

Olee otú ihe e kwuru n’amaokwu ahụ ga-esi nyere gị aka ime ihe i kpebiri?

Ụfọdụ ihe i nwere ike ikpebi ime

  • Ime ka ekpere gị na-erijukwu afọ.

  • Ịgụcha Baịbụl.

  • Ịmata mmadụ niile nọ n’ọgbakọ unu.

  • Inweta onye ị ga na-amụrụ Baịbụl.

  • Ịbụ ọsụ ụzọ inyeaka ma ọ bụ ọsụ ụzọ oge niile.

  • Ọ bụrụ na ị bụ nwoke, na-agba mbọ ka ị bụrụ ohu na-eje ozi.

6. Na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi

Gụọnụ Abụ Ọma 22:26. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee ihe ị ga-eme ka ị na-enwe obi ụtọ ugbu a, nwerekwa ya ruo mgbe ebighị ebi?

NCHỊKỌTA

Nọgide na-agba mbọ ka gị na Jehova na-adịkwu ná mma, na-ekpebikwa ihe ndị ị ga-eme n’ozi ya. I mee ihe a, ị ga na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Gịnị mere obi ga-eji sie gị ike na Jehova ga-enyere gị aka ka i jiri obi gị niile na-efe ya?

  • Olee ihe ị ga-eme ka gị na Jehova dịkwuo ná mma?

  • Olee otú ikpebi ihe ndị ị ga-eme n’ozi Jehova ga-esi nyere gị aka ime ka gị na ya dịkwuo ná mma?

Ihe Ga-ewetụ Gị Oge ma I Kpebie Ime Ya

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Olee nke ga-aka amasị Jehova, ọ̀ bụ anyị ime otu ihe pụrụ iche n’ozi ya kwụsị, ka ọ̀ bụ anyị iji obi anyị niile na-ejere ya ozi ụbọchị niile anyị dị ndụ?

Na-ekwesị Ntụkwasị Obi Dị Ka Ebreham (9:20)

E nwere ihe nwere ike ime ka ohu Jehova kwụsị inwe ọṅụ. Chọpụta otú o nwere ike isi malitekwa inwe ọṅụ.

Ịmụ Ihe na Ịtụgharị Uche n’Ihe Ị Na-amụ Ga-emeli Ka I Nwewe Ọṅụ Ọzọ (5:25)

Olee ihe ga-enyere gị aka ikpebi ihe ndị ị ga-eme n’ozi Jehova, nyekwara gị aka ime ha?

“Jiri Ihe Mgbaru Ọsọ Ime Mmụọ Wetara Onye Okike Gị Otuto” (Ụlọ Nche, Julaị 15, 2004)

Gịnị mere onye ọ bụla ịma nke a na-akọ n’ọgbakọ ji dị mkpa, oleekwa ihe ga-enyere gị aka ịma nke a na-akọ n’ọgbakọ?

“Jisienụ Ike Ruo Ntozu Okè n’Ihi na ‘Oké Ụbọchị Jehova Dị Nso’” (Ụlọ Nche, Mee 15, 2009)