Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị E Ji Echeta Ihe A Mụrụ ná Nkebi nke 1

Ajụjụ Ndị E Ji Echeta Ihe A Mụrụ ná Nkebi nke 1

Gị na onye gị na ya na-amụ ihe leba ajụjụ ndị a anya:

  1. Olee ihe masịrị gị gbasara ihe dị iche iche Baịbụl kwuru na ha ga-eme n’ọdịnihu?

    (Azịza ya dị n’Isi nke 02.)

  2. Gịnị mere i ji kweta na Baịbụl bụ Okwu Chineke?

    (Azịza ya dị n’Isi nke 03 na nke 05.)

  3. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-akpọ aha Jehova?

    (Azịza ya dị n’Isi nke 04.)

  4. Baịbụl kwuru na ọ bụ Chineke “na-enye ndụ.” (Abụ Ọma 36:9) Ì kwetara ihe a o kwuru?

    (Azịza ya dị n’Isi nke 06.)

  5. Gụọnụ Ilu 3:32.

    • Gịnị mere Jehova ji bụrụ Enyi kacha ndị enyi niile anyị nwere mma?

    • Gịnị ka Jehova chọrọ ka ndị enyi ya na-eme? Ì chere na ihe ndị ahụ karịrị akarị?

      (Azịza ha dị n’Isi nke 07 na nke 08.)

  6. Gụọnụ Abụ Ọma 62:8.

    • Olee ụfọdụ ihe ndị ị rịọrọla Jehova arịrịọ gbasara ha? Olee ihe ọzọ i nwere ike ikpe ekpere gbasara ya?

    • Olee otú Jehova si aza ekpere?

      (Azịza ha dị n’Isi nke 09.)

  7. Gụọnụ Ndị Hibru 10:24, 25.

    • Olee uru ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova ga-abara gị?

    • Ì chere na ịgba mbọ na-aga ọmụmụ ihe bara uru?

      (Azịza ha dị n’Isi nke 10.)

  8. Gịnị mere ịgụ Baịbụl mgbe niile ji dị mma? Olee oge i wepụtara ị na-eji agụ Baịbụl?

    (Azịza ha dị n’Isi nke 11.)

  9. Olee ihe na-akacha atọ gị ụtọ n’ọmụmụ ihe anyị a?

  10. Olee nsogbu ndị i nwerela kemgbe ị mụwara Baịbụl? Olee ihe ga-enyere gị aka ka ị ghara ịkwụsị ịmụ ya?

    (Azịza ha dị n’Isi nke 12.)