Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị E Ji Echeta Ihe A Mụrụ ná Nkebi nke 2

Ajụjụ Ndị E Ji Echeta Ihe A Mụrụ ná Nkebi nke 2

Gị na onye gị na ya na-amụ ihe leba ajụjụ ndị a anya:

  1. Gịnị ka Chineke ga-eme okpukpe ụgha?

    (Azịza ya dị n’Isi nke 13.)

  2. Gụọnụ Ọpụpụ 20:​4-6.

    • Olee otú obi na-adị Jehova ma ndị sị na ha na-efe ya jiri ihe a kpụrụ akpụ ma ọ bụ foto na-efe ya ofufe?

      (Azịza ya dị n’Isi nke 14.)

  3. Ònye Bụ Jizọs?

    (Azịza ya dị n’Isi nke 15.)

  4. Olee àgwà Jizọs ndị kacha amasị gị?

    (Azịza ya dị n’Isi nke 17.)

  5. Gụọnụ Jọn 13:​34, 35 na Ọrụ Ndịozi 5:​42.

    • Ole ndị bụ ezigbo Ndị Kraịst taa? Olee ihe mere i ji kweta na ọ bụ ha bụ ezigbo Ndị Kraịst?

      (Azịza ha dị n’Isi nke 18 na nke 19.)

  6. Ònye bụ onyeisi ọgbakọ Ndị Kraịst? Oleekwa otú o si na-edu ya?

    (Azịza ha dị n’Isi nke 20.)

  7. Gụọnụ Matiu 24:14.

    • Olee otú amụma a si emezu taa?

    • Olee onye ị na-ezi ozi ọma?

      (Azịza ha dị n’Isi nke 21 na nke 22.)

  8. Ì chere na ime baptizim ga-abara gị uru? Maka gịnị?

    (Azịza ha dị n’Isi nke 23.)

  9. Gịnị ka ị ga-eme ka Setan na ndị mmụọ ọjọọ ghara inweta gị?

    (Azịza ya dị n’Isi nke 24.)

  10. Gịnị ka Chineke bu n’obi kee anyị?

    (Azịza ya dị n’Isi nke 25.)

  11. Gịnị mere ndị mmadụ ji ata ahụhụ, na-anwụkwa anwụ?

    (Azịza ya dị n’Isi nke 26.)

  12. Gụọnụ Jọn 3:​16.

    • Gịnị ka Jehova mere iji napụta anyị n’aka mmehie na ọnwụ?

      (Azịza ya dị n’Isi nke 27.)

  13. Gụọnụ Ekliziastis 9:5.

    • Gịnị na-eme anyị ma anyị nwụọ?

    • Gịnị ka Jizọs ga-emere ijeri kwuru ijeri ndị nwụrụ anwụ?

      (Azịza ha dị n’Isi nke 29 na nke 30.)

  14. Olee otú Alaeze Chineke si kara ọchịchị ọ bụla ọzọ mma?

    (Azịza ya dị n’Isi nke 31 na nke 33.)

  15. Ì kwetara na Alaeze Chineke na-achị achị ugbu a? Maka gịnị? Olee mgbe ọ malitere ịchị?

    (Azịza ha dị n’Isi nke 32.)