Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị E Ji Echeta Ihe A Mụrụ ná Nkebi nke 3

Ajụjụ Ndị E Ji Echeta Ihe A Mụrụ ná Nkebi nke 3

Gị na onye gị na ya na-amụ ihe leba ajụjụ ndị a anya:

  1. Gụọnụ Ilu 27:11.

    • Gịnị mere i ji chọọ ịna-erubere Jehova isi?

      (Azịza ya dị n’Isi nke 34.)

  2. Olee otú ị ga-esi ama ihe dị mma ị ga-eme n’ihe ndị Baịbụl na-enyeghị iwu ọ bụla ­gbasara ha?

    (Azịza ya dị n’Isi nke 35.)

  3. Olee otú ị ga-esi na-akwụwa aka ọtọ n’ihe niile?

    (Azịza ya dị n’Isi nke 36.)

  4. Gụọnụ Matiu 6:33.

    • Olee otú i si egosi na i ‘bu ụzọ na-achọ ­Alaeze Chineke’ mgbe ị na-ekpebi ihe ­gbasara ọrụ na ego?

      (Azịza ya dị n’Isi nke 37.)

  5. Olee ụzọ ụfọdụ ị ga-esi egosi na i ji ndụ kpọrọ ihe otú Jehova ji ya kpọrọ?

    (Azịza ya dị n’Isi nke 38.)

  6. Gụọnụ Ọrụ Ndịozi 15:29.

    • Olee otú i nwere ike isi na-edebe iwu ­Jehova nyere gbasara ọbara?

    • Ì chere na ihe ndị ọ chọrọ ka anyị na-eme dị mma?

      (Azịza ha dị n’Isi nke 39.)

  7. Gụọnụ 2 Ndị Kọrịnt 7:1.

    • Gịnị ka ahụ́ anyị ịdị ọcha na omume anyị ịdị ọcha pụtara?

      (Azịza ya dị n’Isi nke 40.)

  8. Gụọnụ 1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10.

    • Gịnị ka Baịbụl kwuru gbasara mmekọahụ? Ì chere na ihe a o kwuru dị mma?

    • Gịnị ka Baịbụl kwuru gbasara ịṅụ mmanya na-aba n’anya?

      (Azịza ha dị n’Isi nke 41 na nke 43.)

  9. Gụọnụ Matiu 19:4-6, 9.

    • Olee ihe Chineke gwara ndị di na ndị ­nwunye ka ha na-eme?

    • Gịnị mere mmadụ kwesịrị iji dejupụta ­akwụkwọ mgbe ọ lụrụ ma ọ bụ mgbe ọ gbara alụkwaghịm?

      (Azịza ha dị n’Isi nke 42.)

  10. Olee ụfọdụ ememme ndị na-anaghị amasị Jehova? Gịnịkwa mere na ha anaghị amasị ya?

    (Azịza ha dị n’Isi nke 44.)

  11. Gụọnụ Jọn 17:16 na Ọrụ Ndịozi 5:29.

    • Olee otú ị ga-esi egosi na ị dị iche n’ụwa?

    • Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ndị ọchịchị agwa gị mee ihe iwu Chineke sịrị anyị emela?

      (Azịza ha dị n’Isi nke 45.)

  12. Gụọnụ Mak 12:30.

    • Olee otú ị ga-esi egosi na ị hụrụ Jehova n’anya?

      (Azịza ya dị n’Isi nke 46 na nke 47.)